Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 5 n'Afọ 2016

 IHE GBASARA NDỊ OGE OCHIE

Aristotle

Aristotle

IHE karịrị puku afọ abụọ na narị atọ gara aga, Aristotle chepụtara ọtụtụ ihe baara ndị sayensị na ndị amamihe ụwa uru. Ọtụtụ ndị ka nwekwara mmasị n’ihe ndị ahụ o chepụtara. A sụgharịala ha n’ọtụtụ asụsụ, ọtụtụ ndị amụọkwala ha. Otu ọkà mmụta aha ya bụ James MacLachlan kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị bi na Yurop kweere n’ihe ndị Aristotle kụziri ruo ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ.” Ndị Katọlik, ndị Protestant na ndị Alakụba na-akụzidị ụfọdụ ihe Aristotle kụziri.

O Nwere Mmasị n’Ọtụtụ Ihe

Aristotle dere gbasara ihe ndị dị na mbara igwe, ihe ndị dị ndụ, ịkpa àgwà ọma, asụsụ, iwu, ihe ọmụmụ a na-akpọ lọjik, magnetọ, ihe ọmụmụ a na-akpọ fiziks, ntụrụndụ, ide egwú, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na akparamagwa ụmụ mmadụ. O dekwara gbasara mkpụrụ obi. O kwetara na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. Ma, ihe a kacha jiri mara ya bụ ihe ndị o dere gbasara ihe ọmụmụ bayọlọji na lọjik.

Ndị ọkà mmụta Grik oge ochie na-eleru ihe dị iche iche anya, gbakọọ ihe ụfọdụ, cheekwa echiche nke ọma ma jirizie ihe ndị ha chọpụtara kọwaa ihe ndị dị n’ụwa. O nwere ihe ndị ha weere na ha bụ eziokwu doro anya. Ha kwetara na ọ bụrụ na ha echebara eziokwu ndị ahụ echiche nke ọma, na ha ga-enwe ike iji ya mata eziokwu banyere ihe ndị ọzọ.

Ha si otú a chọpụta ọtụtụ ihe bụ́ eziokwu. Otu n’ime ihe ndị ha chọpụtara bụ na a haziri ihe ndị dị na mbara igwe ahazi. Ma, otú a ha si achọpụta ihe nwere ebe o si rie mperi. Ọ bụ naanị ihe ole na ole ka ha nwere ike iji anya nkịtị ha hụ. O nwekwara ike ịbụ na ihe ụfọdụ ha na-ahụ abụchaghị otú ha dị. Ụdị ihe a duhiere Aristotle na ọtụtụ ndị sayensị ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ha chere na kpakpando na ihe ndị ọzọ dị na mbara igwe na-agba ụwa gburugburu. N’oge ahụ, ndị mmadụ chere na ihe a bụ eziokwu doro anya.  Otu akwụkwọ a na-akpọ The Closing of the Western Mind kwuru, sị: “Ndị Grik na-ekwu na ụwa dị n’etiti, ihe ndị ọzọ ana-agba ya gburugburu. Mmadụ jiri ihe ndị ọ ma chebara ihe a ndị Grik kwuru echiche, ọ ga-eyi ka ọ̀ bụ eziokwu.”

A sị na ọ bụ naanị ma e kwuwe okwu sayensị ka a na-ekwute okwu ihe a ndị Grik na-akụzi, ọ gaara adịtụ mma. Nsogbu bụ na e bidokwara kụziwe ya na chọọchị.

Ndị Katọlik Anabata Nkụzi Aristotle

Na Yurop n’oge ochie, ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst nabatara ụfọdụ ihe Aristotle kụziri, werekwa ha ka eziokwu doro anya. Ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik, karịchaa Thomas Aquinas, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka n’afọ 1224 ruo 1274, webatara ihe ụfọdụ Aristotle dere ná nkụzi okpukpe ha. Nkụzi Aristotle, nke bụ́ na ụwa dị n’etiti, ihe ndị ọzọ ana-agba ya gburugburu bịaziri ghọọ nkụzi ndị Katọlik. Ụfọdụ ndị isi n’okpukpe Protestant, dị ka Calvin na Luther, nabatakwara nkụzi a. Ha sịrị na Baịbụl kwadoro ya.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ha Ghọtahiere Ihe Baịbụl Kwuru.”

E weere ihe ụfọdụ Aristotle kụziri ka eziokwu doro anya

Otu nwoke na-ede akwụkwọ aha ya bụ Charles Freeman kwuru, sị: “Abịa n’ihe ụfọdụ, ị gaghị ama ihe dị iche ná nkụzi Aristotle na nkụzi ndị Katọlik.” Ọ bụ ihe a mere ndị ụfọdụ ji ekwu na Aquinas tọghatara Aristotle, ya ekweta ná nkụzi ndị Katọlik. Ma, Freeman dere na nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ “Aquinas ka a tọghatara, ya ekweta ná nkụzi Aristotle.” Anyị nwekwara ike ikwu na ọ bụ otú ahụ ka e sikwa tọghata ọtụtụ ndị Katọlik ndị ọzọ, ha ekweta ná nkụzi Aristotle. Ma, o nwere otu nwoke onye Ịtali mụrụ banyere mbara igwe na mgbakọ na mwepụ aha ya bụ Galileo. Nwoke a na-akọrọ ndị mmadụ ihe ndị ọ chọpụtara gosiri na anyanwụ dị n’etiti, ụwa ana-agba ya gburugburu. Ihe a mere ka a kpụpụ ya n’ụlọikpe ndị Katọlik. Ndị ụlọikpe ahụ manyekwara ya ikwu na ihe ahụ ọ chọpụtara abụghị eziokwu. Ma, Aristotle kwetara na ndị sayensị nwere ike ịchọpụta ihe ọhụrụ ga-eme ka ha gbanwee ihe ha kwuru na mbụ. Ọ gaara amagbu onwe ya ma a sị na ndị chọọchị kwetara ihe a Aristotle kwetara.