Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 5 n'Afọ 2017

 ISIOKWU TETA! A

Ọdachi Mee Olee Ihe Ndị Nwere Ike Ịzọ Anyị Ndụ?

Ọdachi Mee Olee Ihe Ndị Nwere Ike Ịzọ Anyị Ndụ?

“Ọ fọrọ obere ka m daa, mgbe ụda otu ihe gbawaranụ dachiri mụ ntị. Anwụrụ ọkụ si n’oghere ebe ikuku si abata n’ụlọ na-enubata, ụlọ ọrụ anyị dị ọtụtụ okpukpu bakwara ọkụ n’otu ntabi anya.”​—⁠Joshua.

Akụkọ gbasara ala ọma jijiji . . . ajọ ifufe . . . ndị na-eyi ọha egwu . . . na ịgba egbe aghara aghara n’ụlọ akwụkwọ, na-ejupụtazi n’akwụkwọ akụkọ n’oge ndị a. Ma, o nwere ihe dị iche n’ịgụ gbasara ha n’akwụkwọ akụkọ na ịbụ onye ihe dị otú ahụ merela. Ajụjụ bụ, olee ihe ndị i nwere ike ime tupu ọdachi emee, mgbe ọ na-eme na mgbe o mechara ga-enye aka mee ka ị nyaa ndụ?

 TUPU ỌDACHI EMEE KWADEBE MAKA YA!

O NWEGHỊ onye ga-asị na ọdachi agaghị adakwasịli ya. Ịkwadebe maka ya tupu ya emee bụ ihe ga-enye aka ịzọ mmadụ ndụ. Ma, olee ihe ndị ị ga-eme iji kwadebe onwe gị maka ọdachi?

  • Kwadebe onwe gị. Buru n’uche na ọdachi na-emekarị nakwa na o nwere ike ịdakwasị gị na ndị enyi gị. Ọ baghị uru ịkwadebewe maka ọdachi mgbe o mechara.

  • Mata gbasara ọdachi ndị nwere ike ime n’ebe ibi. Chọpụta ebe ndị e nwere ike ịgbaga maka nchebe ma o mee. Chọpụtakwa ma a rụsikwara ụlọ gị ike nakwa ma ebe ọ dị ọ̀ dịkwa mma. Wepụ ihe ọ bụla nwere ike ịkpata ọkụ ọgbụgba. Tinye ihe ndị na-agba àmà na ọkụ chọrọ ịgba n’ụlọ gị, na-agbanwekwa ha batrị ọ̀ dịkarịa ala otu ugboro n’afọ.

  • Wekọta ihe ndị ga-adị mkpa. Ọdachi mee, ọkụ eletrik, mmiri, ekwentị na ihe ndị e ji eme njem nwere ike ghara ịdị. Ọ bụrụ na i nwere ụgbọala, hụ na mmanụ ụgbọala dị n’ime ya ruru ọkara tank. Hụkwa na i nwere nri, mmiri na ihe ndị ọzọ ga-adị gị mkpa n’ụlọ gị.​—⁠Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ì Wekọtala Ihe Ndị Ga-adị Gị Mkpa?

    Ịkwadebe maka ọdachi tupu ya emee bụ ihe ga-akacha azọ gị ndụ

  • Dowe akara ekwentị ndị enyị gị ma ndị bi nsọ ma ndị bi ebe dị anya n’ebe ị ga-ahụ ha ngwa ngwa.

  • Kwadebenụ otú unu ga-esi agbapụ. Matanụ ebe kacha mfe isi gbapụ n’ụlọ unu. Gwakwa ụmụ gị ihe ha ga-eme ma ọdachi mee mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ. Kwuonụ ebe ezinụlọ unu ga-ezukọ ma ọdachi mee, dị ka n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ọ́bá akwụkwọ; otu n’ebe dị nso, nke ọzọ n’ebe dịtụ anya. Ndị ọchịchị na-atụ aro ka gị na ezinụlọ gị mụọ iji ụkwụ aga ebe ndị ahụ.

  • Kwadebe maka inyere ndị ọzọ aka, ma ndị agadi, ma ndị ahụ́ na-esichaghị ike na ndị nwere nkwarụ.

ỌDACHI MEE MEE IHE OZUGBO

Joshua anyị kwuru banyere ya ná mmalite kwuru, sị: “Mgbe ọkụ banyere n’ụlọ ọrụ anyị, ụjọ atụghị ọtụtụ ndị, ha nọ na-egbu oge ịgbapụ. Ụfọdụ nọ na-agbanyụ kọmputa ha ma ọ bụ na-agbanye mmiri n’ihe mmiri ha. Otu nwoke sịrị, ‘Ọ dị ka ànyị ga-echetụ ntakịrị.’ ” Ma, n’agbanyeghị oge ndị ọzọ nọ na-egbu ịpụ, Joshua tiri mkpu, sị: “Anyị kwesịrị isi ebe a pụọ ozugbo!” Ozugbo o kwuru ihe a, ndị ya na ha na-arụ ọrụ sooro ya gbadawa steepụ, pụwa n’ezi. Joshua kwukwara, sị: “Kulitenụ onye ọ bụla daranụ. Anyị niile ga-apụtacha ná ndụ.”

  • Ọkụ gbawa. Hulata ma mee ngwa ngwa si n’ọnụ ụzọ kacha nso pụọ. Anwụrụ ọkụ na-egbochi mmadụ ịhụ ụzọ. Ọtụtụ ndị na-anwụ n’ọkụ ọgbụgba bụ ikuru anwụrụ ọkụ gburu ha. Hapụ ngwongwo gị ma ị pụwa, tịnkọm tịnkọm ole na ole ezuola ime ka mmadụ dị ndụ ma ọ bụ nwụọ n’ọkụ ọgbụgba.

  • Ala ọma jijiji mewe. Gbaba n’okpuru oche siri ike ma ọ bụ nọrọ n’akụkụ ahụ́ ụlọ dị n’ime. Buru n’obi na obere ala ọma jijiji na-eme ma nke nnukwu mechaa na-abịa, n’ihi ya, si n’ụlọ ahụ gbapụ ozugbo i nwetara ohere ime otú ahụ. Ndị azụrụ inyere ndị ọdachi dakwasịrị aka nwere ike ghara irute n’oge, n’ihi ya, nyere ndị ọzọ aka ma ọ dịrị gị mfe.

  • Ala ọma jijiji na-eme n’oké osimiri mewe. Ozugbo mmiri juru n’ikpere mmiri laghachiri n’osimiri, mee ngwa ngwa gbagoo n’ugwu. Marakwa na ebili mmiri ndị bukwuru ibu na-abịa.

  • Ajọ ifufe fewe. Gbaga n’ebe a na-ezere ajọ ifufe.

  • E nwee idei mmiri. Si n’ụlọ ndị idei mmiri juru pụọ. Agala ije n’ime idei mmiri ma ọ bụ nyaa ụgbọala n’ime ya. Mmiri ruru unyi nwere ike ịdị n’Idei mmiri. Idei mmiri nwekwara ike izochi ihe ndị dị ize ndụ dị ka olulu, waya eletrik dara ada na ihe ndị ọzọ nwere ike imerụ mmadụ ahụ́.

  • Ị̀ Maara? Mmiri na-asọ asọ omimi ya na-eruchaghị otu mịta, nwere ike ibufu ụgbọala. Ọtụtụ ndị na-anwụ n’idei mmiri bụ ndị kwọ ụgbọala na-aga ná mmiri na-asọ asọ.

  • Ndị ọchịchị maa ọkwa ka ndị mmadụ kwapụ, kwapụ ozugbo. Mee ka ndị enyi gị mara ebe ị kwagara, ma ọ bụghị ya, ha nwere ike ịdaba ná nsogbu mgbe ha na-achọ gị.

    Ọ bụrụ na ndị ọchịchị ekwuo ka onye ọ bụla gbapụ, gbapụ ozugbo

  • Ị̀ Maara? Iziga ozi n’ekwentị nwere ike ịka mma karịa ịkpọ mmadụ n’ekwentị n’oge ọdachi mere.

  • Ọ bụrụ na ndị ọchịchị ekwuo ka onye ọ bụla nọrọ n’ụlọ ya ma ọ bụ n’ebe ọzọ, mee ihe ha kwuru. Ọ bụrụ na e nwee ọdachi mere ka kemikal ọjọọ, ma ọ bụ ihe si n’ụlọ ọrụ nuklia banye n’ikuku, nọrọ n’ime ụlọ gị, gbanyụọ ihe na-ewebata ikuku n’ụlọ gị, mechiekwa oghere dị n’ọnụ ụzọ gị ma ọ bụ na windo gị ikuku nwere ike isi na-abata n’ụlọ gị. Ihe ọghọm nuklia mee, o kwe mee, banye n’ebe kacha zoo ezo n’ụlọ gị. Gee ntị na redio ma ọ bụ na tiivi ka ị mata ihe na-emenụ. Nọrọ n’ụlọ gị ruo mgbe ndị ọchịchị kwuru na ihe adịla mma.

 ỌDACHI MECHAA IHE NDỊ Ị GA-EME

Iji gbochie ọrịa na ihe ndị ọzọ, lee ihe ụfọdụ nwere ike inyere gị aka.

  • Gị na ndị enyi gị nọrọ ma ọ dị mfe, kama ịga nọrọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ.

  • Dowe ebe ị nọ ọcha.

  • Yiri ihe ga-ekpuchi gị ahụ́ mgbe ị na-ekpofusi ihe ndị ọdachi ahụ mebiri. O kwe mee, yiri glove, akpụkpọ ụkwụ siri ike, okpu ndị ọrụ na ihe na-egbochi uzuzu. Kpachara anya maka waya eletrik na icheku ọkụ ndị zoro ezo.

  • Na-emekwa ihe ndị ị na-eme kwa ụbọchị otú i si emebu ha. Ụmụ gị kwesịrị ịhụ ihe gosiri na i nwere olileanya n’ihe ga-aka mma. Kụziere ha ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ. Gị na ha na-egwuri egwu ma na-efekọkwa ofufe ọnụ. Ekwula gbasara ihe ọjọọ ị nụrụ na redio ma ọ bụ na tiivi mgbe niile. Ejikwala iwe na-emeso ndị ezinụlọ gị ihe. Na-anabata enyemaka, nyekwara ndị ọzọ aka.

    Mgbe ọdachi mechara, na-eme ihe otú i si emebu ha

  • Buru n’obi na ọdachi na-akpatakarị mfu. Ọdachi mee, ihe na-abụkarị mkpa gọọmenti na ndị ọzọ na-agbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka bụ ịzọ ndị mmadụ ndụ, ọ bụghị inyeghachi ha ihe niile funahụrụ ha. Iji nọgide na-adị ndụ, mmiri, nri, uwe na ebe obibi dị anyị mkpa.​—⁠1 Timoti 6:​7, 8.

  • Buru n’obi na ihe ụfọdụ ga na-enye gị nsogbu n’obi. Chọọkwa enyemaka. Nke a na-emekarị ma ụjọ mbụ ahụ tụrụ onye ahụ kwụsị. Ihe ndị e ji amata ya bụ: nchegbu, ida mbà n’obi, mkpaghasị uche, echeghị echiche nke ọma, ehighị ụra nke ọma na ike ọgwụgwụ. Kọọrọ ndị enyi gị nsogbu gị.

Ọ bụ eziokwu na ọkọ akọghị Joshua mgbe ọkụ ahụ gbara, ma ọkụ gburu ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ibe ya. Ndị okenye ọgbakọ Joshua na ndị dọkịta nyeere ya aka. Joshua kwuru, sị: “Ha gwara m na mwute so n’ihe ndị na-egosi na mụ enwetawala onwe m. Ha gwakwara m na ihe ga-adị mma. Mgbe ọnwa isii gachara, ụjọ ahụ na-atụ m belatara. Ma, ọ ka nwere ihe ndị ọzọ mụ na ha na-alụ.”

Ọdachi na-eme mgbe ụfọdụ ka ndị mmadụ lewe ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị. Ha nwedịrị ike ibido tawa Chineke ụta n’amaghị ama. Ọtụtụ ndị na-atakwa onwe ha ụta. Joshua tara onwe ya ụta, sị: “Obi m na-agwa m na m gaara azọkwu ndị mmadụ ndụ. Ihe na-akasi m obi bụ okwukwe m nwere na Chineke ga-eme ka ikpe ziri ezi dịrị, doziekwa nsogbu niile dị n’ụwa a. Ma ka ọ dịgodị, m na-eji ndụ m na-adị kwa ụbọchị akpọrọ ihe, na-agbalịkwa ike m ichebe ya.”​—⁠Mkpughe 21:​4, 5. *

^ para. 33 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere nkwa ndị Chineke kwere maka ọdịnihu, nakwa ihe mere o ji kwere ka ahụhụ dịrị, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Gaa na www.jw.org/⁠ig danloduo ya.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Chineke Ò Ji Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha Ata Ndị Mmadụ Ahụhụ?

Chọpụta ihe atọ Baịbụl kwuru e ji ama ntaramahụhụ si n’aka Chineke.