ISIOKWU TETA! A | OTÚ Ị GA-ESI AKWỤSỊ ÀGWÀ RIRILA GỊ AHỤ́
3 Adala Mbà
O nwere otu ọkachamara kwuru na ịmụta àgwà ọhụrụ na-ewe mmadụ ụbọchị iri abụọ na otu. Ma, ihe ndị a chọpụtarala na-egosi na ndị ụfọdụ anaghị eru ụbọchi ole ahụ tupu ha amụta àgwà ọhụrụ. O nwekwara ndị nke ha na-akarị ụbọchị ole ahụ. Ma, ihe a ekwesịghị ime ka anyị daa mbà.
Ka e were ya na ị chọrọ ịna-emega ahụ́ ugboro atọ n’izu.
N’izu nke mbụ, i megara ahụ́ ugboro atọ ahụ i kpebiri.
N’izu nke abụọ, gị emee ya ugboro abụọ.
N’izu nke atọ gị emezuokwa ya ugboro atọ.
N’izu nke anọ, gị ejisie ike mee ya naanị otu ugboro.
N’izu nke ise, gị emezuokwa ya ugboro atọ ahụ ọzọ. Malite mgbe ahụ gawa, ị nọzi na-emezu ya otú ahụ ị chọrọ.
Ihe ọ pụtara bụ na o were gị izu ise tupu ya amara gị ahụ́. O nwere ike ịdị gị ka à ga-asị na o were gị oge hiri nne. Ma, obi ga-adị gị ụtọ na i mewela ihe ọhụrụ i kpebiri ịna-eme.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.”—Ilu 24:16.
Amaokwu Baịbụl a na-ekwu na anyị ekwesịghị ịda mbà. Ihe ka mkpa bụ na anyị mechara mewe ihe anyị kpebiri ime, ya amarakwa anyị ahụ́, ọ bụghị ugboro ole anyị dara.
Ihe ka mkpa abụghị ugboro ole ị dara, kama ọ bụ ugboro ole i biliri mgbe ị dara
IHE I NWERE IKE IME
Ọ bụrụ na i kpebiri ịkwụsị otu ihe ririla gị ahụ́, gị emechaa mee ya ọzọ, echekwala na ọ pụtara na ị gaghị akwụsịli ya. Buru n’obi na i nwere ike ịda mgbe ụfọdụ.
Na-echeta oge ndị i mere nke ọma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i kpebiri na ị gaghịzi eji olu ike na-agwa ụmụ gị okwu, i nwere ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Olee mgbe ikpeazụ iwe juru m obi, mụ ejide onwe m kama ịbawara ụmụ m mba? Gịnị ka m mere mgbe ahụ? Olee otú m ga-esi eme ya ọzọ?’ Ichebara ụdị ajụjụ ndị a echiche ga-eme ka ị na-emekwu nke ọma.
Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịma ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ná ndụ, dị ka otú ị ga-esi kwụsị ịna-echegbu onwe gị, otú unu ga-esi na-ebi n’udo n’ezinụlọ unu, nakwa otú ị ga-esi na-enwe ezigbo obi ụtọ, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig.