Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 4 n'Afọ 2017

 ISIOKWU TETA! A

Ọrụ I Ji n’Aka Ọ̀ Karịrị Akarị?

Ọrụ I Ji n’Aka Ọ̀ Karịrị Akarị?

Ọ̀ na-adị gị ka ọrụ ị̀ ji n’aka ọ̀ karịrị akarị? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị ka ọ dị otú ahụ. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Economist kwuru, sị: “O yiri ka n’ebe niile, ọtụtụ ndị ji ọtụtụ ọrụ n’aka.”

N’OTU nchọpụta e mere ná mba asatọ n’afọ 2015, a gbara ndị ọrụ na-eji awa asatọ arụ ọrụ kwa ụbọchị ajụjụ ọnụ. Ha kwuru na ọ na-esiri ha ike ịrụ ọrụ ha ma meekwa ihe ndị dịịrị ha n’ụlọ. Ha sịrị na ụfọdụ ihe kpatara ya bụ ọrụ na-akarịzi akarị ma n’ebe ọrụ ha ma n’ebe obibi ha, otú ihe si ada oké ọnụ, na ịrụ ọrụ ọtụtụ awa. N’Amerịka, ọtụtụ ndị a gbara ajụjụ ọnụ sịrị na ha na-arụ ọrụ ihe dị ka awa iri anọ na asaa kwa izu. Otu onye n’ime mmadụ ise kwuru na ha na-arụ ọrụ awa iri isii ma ọ bụ karịa n’izu.

Ná nchọpụta ọzọ e mere ná mba iri atọ na isii, otu onye n’ime mmadụ anọ a gbara ajụjụ ọnụ sịrị na ọ na-adị ha ka oge adịghịzi ma oge ha na-anọghị n’ọrụ. Ụdị ihe a na-emekwa ụmụaka ma ọ bụrụ na ọrụ akarịa ha akarịa n’ahụ́.

Ọ bụrụ na anyị ana-agbalị mgbe niile ime ọtụtụ ihe n’eme ntakịrị oge, o nwere ike ịkpatara anyị mgbakasị ahụ́. O nwere ike ime ka mmadụ bụrụzie onye na-eme ihe ọkụ ọkụ. Ma ajụjụ bụ, mmadụ ò nwere ike ịnọ ya aghara ịdị ya ka oge ọ na-achụ ya ọsọ? Olee otú okwukwe anyị, ihe ndị na-amasị anyị na ihe anyị na-atụ anya ha ga-esi enyere anyị aka? Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe anọ mere ndị mmadụ ji achọ ime ọtụtụ ihe.

 1 MMADỤ ỊCHỌ IGBO MKPA EZINỤLỌ YA

Otu nna aha ya bụ Gary sịrị: “M na-arụ ọrụ abalị asaa n’izu. Ihe mere m ji na-arụ ya otú ahụ bụ ka m nwee ike ịzụtara ụmụ m ihe ndị kacha mma. M chọrọ ka ha nweta ihe ndị mụnwa na-enwetalighị oge m bụ nwata.” Ọ bụ eziokwu na ndị nne na nna bu ọdịmma ezinụlọ ha n’obi na-eme ihe ndị a, ma ha kwesịrị ịchọpụta ihe ndị kacha mkpa. Nchọpụta ụfọdụ e mere gosiri na ndị dimkpa na ụmụaka na-ahụ ego na ihe onwunwe n’anya na-abụkarị ndị na-anaghị enwecha obi ụtọ na ndị ike ụwa gwụrụ. Ahụ́ anaghị agbasikwa ha ike, ma e jiri ha tụnyere ndị ihe ha nwere juru afọ.

Ụmụaka ndị a zụrụ ka ha jiri ịchụ akụnụba na ihe onwunwe kpọrọ ihe a naghị enwecha obi ụtọ

Ụfọdụ ndị nne na nna chọrọ ịzụ ụmụ ha ka ha bụrụ aka ji akụ̀ n’ọdịnihu ahazierela ma hanwa ma ụmụ ha ọtụtụ ihe ndị ha ga na-eme iji nweta ihe ndị ha chọrọ. Ọ bụ eziokwu na ha bu ọdịmma ndị ezinụlọ ha n’obi na-eme ihe ndị a, ma akwụkwọ bụ́ Putting Family First, kwuru na ihe a ha na-agbalị ime “ga-akpatara ma hanwa ma ezinụlọ ha ọtụtụ nsogbu.”

2 MMADỤ ICHE NA ‘INWETAKWU ỌTỤTỤ IHE KA MMA’

Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-agbalị ime ka anyị chee na ihe na-efunahụ anyị ma ọ bụrụ na anyị azụghị ihe ọgbara ọhụrụ. Akwụkwọ bụ́ The Economist kwuru, sị: “Otú ngwá ahịa si jupụtazie ebe niile mere ka ọ dị ndị mmadụ ka a ga-asị na oge a dịghịzi.” N’ihi ya, ọ na-esiri ndị chọrọ ịzụ ngwá ahịa ndị ahụ ike “ịhọrọ ihe ha ga-azụ, ma ọ bụkwanụ ịma ihe ha ga-eme eme” n’ime oge ole na ole fọrọnụ.

N’afọ 1930, otu ọkachamara n’ihe gbasara azụmahịa kwuru na ihe ndị sayensị na nká na ụzụ na-arụpụta n’ọdịnihu ga-eme ka ndị ọrụ nwekwuo oge ha ga-eji mere ihe ndị ọzọ. Mana, ọ dara ya. Otu nwaanyị aha ya bụ Elizabeth Kolbert na-arụ n’ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ bụ́ New Yorker, kwuru, sị: “Kama ndị [ọrụ] ịgbasa n’oge, ndị mmadụ na-achọta ihe ọhụrụ ndị ga-adị ha mkpa.” Ihe ndị ahụ na-efukwa ego na oge iji nweta ha.

3 ỊGBALỊ IME IHE GA-ADỊ NDỊ ỌZỌ MMA N’OBI

Ụfọdụ ndị ọrụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ ọtụtụ awa iji mee ka obi ghara ịjọ ndị were ha n’ọrụ njọ. Ndị ọrụ ibe gị nwekwara ike ime ka obi mawa gị ikpe ma ọ bụrụ na ị naghị eso ha arụ ọrụ ma ọrụ gbasaa. Amaghị otú ihe ga-adị echi sokwa n’ihe ọzọ nwekwara ike ime ka ndị mmadụ kweta ịrụ ọrụ ọtụtụ awa ma mgbe ọrụ  gbasachara, ma ọ bụkwanụ kweta ka a kpọọ ha mgbe ọ bụla a chọrọ ha.

Ndị mụrụ ụmụ nwekwara ike ịna-achọ ka ha bido ịchụ ọtụtụ ihe ka ezinụlọ ndị ọzọ. Ma ha emelighị ya, o nwere ike iwute ha na ha enweghị ike inye ụmụ ha ihe ezinụlọ ndị ahụ na-enye ụmụ nke ha.

4 ỊCHỌ ỊBỤ NDỊ A MA AMA

Otu nwoke bi n’Amerịka aha ya bụ Tim, sịrị: “Anaghị m eji ọrụ m egwuri egwu. M na-ejikwa ike m niile arụ ya. M chọrọ ka ndị mmadụ mata na m ji ọrụ m kpọrọ ihe.”

Dị ka Tim, ọtụtụ ndị kwetara na o nwere ihe jikọrọ ùgwù a na-akwanyere ha na otú ha si adị uchu n’ọrụ ha. Olee nsogbu nke ahụ nwere ike ịkpata? Elizabeth Kọbert, onye anyị kwuburu gbasara ya ná mbido, sịrị: “Otú mmadụ si adị uchu n’ọrụ ya ga-ekpebi otú ùgwù a ga na-akwanyere ya ga ahà. Ka ị na-agbakwu mbọ n’ọrụ gị ka a na-akwanyekwuru gị ùgwù.”

MỤTA ILE IHE ANYA OTÚ KWESỊRỊ EKWESỊ

Baịbụl gbara anyị ume ka anyị dị uchu ma na-arụsi ọrụ ike. (Ilu 13:⁠4) Ma, ọ gwakwara anyị ka anyị ghara imebiga ya ókè. Ekliziastis 4:6 kwuru, sị: “Obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.”

Ibi ndụ dị mfe na-eme ka uche mmadụ na-aghọ nkọ, na-emekwa ka ahụ́ gbasie anyị ike. Ma, ò kwere omume na mmadụ ga-eselatatụ aka n’ihe ndị ọ na-eme ma ọ bụkwanụ jiri ya nwayọọ? Ee. Ka anyị leba anya n’ihe anọ nwere ike inyere anyị aka:

 1 MARA IHE NDỊ Ị CHỌRỌ NA IHE NDỊ KACHA GỊ MKPA

Mmadụ ịgbalị ka ọ kpata ego ga-ezuru ya adịghị njọ. Ma, ego ole ga-ezuru ya? Olee ihe ndị na-egosi na ihe na-agaziri mmadụ? À na-eji ihe mmadụ na-akpata ma ọ bụ ihe ndị o nwere a mata ya? Chetakwa na oké ntụrụndụ nwekwara ike ime ka oge a ga-eji mee ihe ndị ọzọ ghara ịdịzi.

Tim, anyị kwuburu banyere ya ná mbụ, sịrị: “Mụ na nwunye m chebaara ndụ anyị echiche ma kpebie na anyị kwesịrị ibi ndụ dị mfe. Anyị deturu ihe ndị anyị nwere ugbu a n’akwụkwọ, deekwa otú anyị chọrọ ka ihe mechaa dịrị. Anyị kwurịtakwara gbasara uru na ọghọm ndị dị n’ihe ndị anyị meburu, na ihe ndị anyị ga-eme iji nweta ihe anyị chọrọ.”

2 AZỤLA IHE Ọ BỤLA Ị HỤRỤ

Baịbụl gwara anyị ka anyị kpaara “ọchịchọ nke anya” ókè. (1 Jọn 2:​15-17) Mkpọsa ngwá ahịa nwere ike ime ka mmadụ nwee ọchịchọ ga-eme ka ọ rụwa ọrụ ogologo oge ma ọ bụ gaa n’ebe ntụrụndụ a na-akwụ nnukwu ụgwọ. N’eziokwu, ị gaghị enweli ike izere mkpọsa azụmahịa niile e nwere. Ma, i nwere ike ileghara ụfọdụ n’ime ha anya, saakwa anya ná mmiri ka ị mara ihe ndị dị mkpa.

Marakwa na ndị enyi gị nwekwara ike ime ka otú i si ele ihe ụfọdụ anya gbanwee. Ọ bụrụ na ha bụ ndị na-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ ma ọ bụ ndị kweere na ọganihu bụ mmadụ inwe ọtụtụ ihe, o nwere ike ikacha mma ka i meta ndị maara ihe ndị kacha mkpa ná ndụ enyi. Baịbụl kwuru, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.”​—⁠Ilu 13:⁠20.

3 EKWELA KA ỌRỤ GỊ WEKỌRỌ OGE GỊ NIILE

Gị na onye were gị n’ọrụ kwuo gbasara ọrụ gị na ihe ndị ịchọrọ ime maka ya. Ekwekwala ka obi jọọ gị njọ maka na ị chọrọ iji oge ụfọdụ iji arụ ọrụ mee ihe  ndị ọzọ. Akwụkwọ aha ya bụ Work to Live kwuru, sị: “Ndị na-egbubilata oge ha ji arụ ọrụ iji nwetakwuo ohere maka ezumike na ihe ndị ọzọ na-emecha chọpụta otu ihe dị ezigbo mkpa bụ́ na o nweghị oké ihe ga-emebi ma ọ bụrụ na ha emee otú ahụ.”

Gary anyị kwuburu gbasara ya ná mmalite bụ aka ji akụ̀, kpebiri na ya ga-egbubilata oge o ji arụ ọrụ. Ọ sịrị: “M gwara ndị ezinụlọ m ka anyị selata aka n’ihe ụfọdụ iji mee ka ndụ anyị dịkwuo mfe. Ha kwetara, anyị jizi nwayọọ nwayọọ hazie otú anyị ga-esi eme ya. M gakwuuru onye m na-arụrụ ọrụ gwa ya na m chọrọ igbubilata ụbọchị ole m ji arụrụ ya ọrụ n’izu, ya ekweta.”

4 JIRINỤ OGE EZINỤLỌ UNU JI ANỌRỊ KPỌRỌ MKPA

Ndị dị na nwunye kwesịrị inwe oge ha ga-eji na-anọrị. Ha kwesịkwara iwepụta oge ha na ụmụ ha ga-eji na-anọrị. N’ihi ya, achọla ka ezinụlọ gị dị ka ezinụlọ ndị ahụ na-anaghị enwekarị ohere. Gary kwuru, sị: “Gbalịa wepụta oge unu ga-eji na-anọrị, emekwala ihe ga-eme ka ọ dị ka a ga-asị na ọ dịchaghị mkpa.”

Ekwela ka tiivi, ekwentị, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ mee ka ị nọrọ iche n’oge ahụ. Hụ na unu na-erikọ nri ọnụ, ọ bụrụgodị otu ugbo n’ụbọchị. Jirikwanụ oge ahụ na-akparịta ụka. Ọ bụrụ na ndị nne na nna a na-eme ihe ndị a, ọ ga-eme ka ahụ́ ruo ụmụ ha ala, ha enwee obi ụtọ, na-emekwa nke ọma n’ụlọ akwụkwọ.

Jiri oge unu ji eri nri na-enwe nkwurịta okwu n’ezinụlọ unu

N’ikpeazụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m na-atụ anya ya ná ndụ? Olee otú m chọrọ ka ezinụlọ m dịrị?’ Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta obi ụtọ na afọ ojuju ná ndụ, kwee ka ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl na-enyere gị aka ná mkpebi ndị ịna-eme.