IHE MERE O JI ESI IKE

Ihe ndị di na nwunye na-agabiga na-akarị akarị ma ụmụ ha too ma si n’ụlọ pụọ. Otú ụlọ ha sizi gbaa chakoo mere ka ha abụọ dịzie ka ndị ọbịa. Otu ọkachamara n’ihe gbasara ezinụlọ aha ya bụ M. Gary Neuman kwuru, sị: “M na-enye ọtụtụ ndị di na nwunye ndụmọdụ gbasara otú ha ga-esi bidoghachi imekọ ihe ọnụ. Ọ bụrụ na ụmụ ha apụọ n’ụlọ, ọ na-esiri ha ike ịma ihe ha ga na-ekwurịta.” *

Ihe a ò yiri ihe na-eme n’alụmdi na nwunye unu? Ya bụrụ otú ahụ, unu nwere ike imezi ihe ka ọ dị mma. Ma, ka anyị buru ụzọ lebagodị anya n’ihe ụfọdụ o nwere ike ịbụ ya kpatara onye ọ bụla ji na-anọrọ onwe ya.

IHE NA-AKPATA YA

Kemgbe ọtụtụ afọ, ihe kacha unu mkpa bụ ịzụ ụmụ unu. Ka ha nwee ike ilekọta ụmụ ha nke ọma, ọtụtụ ndị nne na nna na-eji ilekọta ụmụ ha kpọrọ ihe karịa ilekọta di ha ma ọ bụ nwunye ha. Nke a emeela ka ọtụtụ n’ime ha na-arụ ọrụ ha dị ka nne na nna ma kwụsịzie ịna-emekọ ihe ọnụ dị ka di na nwunye. Ihe a na-akacha apụta ihe ma o nweghịzi nwa ha fọrọ n’ụlọ. Otu nwaanyị dị afọ iri ise na itoolu kwuru, sị: “Mgbe ụmụ anyị ka nọ n’ụlọ, mụ na di m na-emekọ ihe ọnụ,” ma ugbu a ha pụchara n’ụlọ, “onye ọ bụla na-emere nke ya.” Ọ gwara di ya, sị: “O nwedịrị mgbe anyị na-eme ihe na-anaghị adị ibe anyị mma n’obi.”

Ụfọdụ ndị di na nwunye adịghị njikere ịnabata ọnọdụ ọhụrụ a. Akwụkwọ aha ya bụ Empty Nesting kwuru, sị: “O nwedịrị ọtụtụ ndị di na nwunye ọ na-adị ka hà lụrụ ọhụrụ.” Ha na-eche na ebe ọ bụ na o nwechaghịzi ihe jikọrọ ha, ka onye nke ọ bụla na-achụrụ aka ya, ya emezie ka ha dịzie ka mmadụ abụọ bi n’otu ụlọ, kama ịbụ di na nwunye.

Ma, ihe na-eme obi ụtọ bụ na unu nwere ike izere ịdaba n’ọnọdụ a, ma mee ka oge a ụmụ unu na-anọzighị n’ụlọ bụrụ oge kacha ụtọ ná ndụ unu. Baịbụl nwere ike inyere unu aka ime ya. Ka anyị lee otú ọ ga-esi eme ya.

 IHE I NWERE IKE IME

Nabata ọnọdụ ọhụrụ a. Baịbụl kwuru gbasara ụmụaka ndị torola eto, sị: ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya.’ (Jenesis 2:24) Dị ka ndị nne na nna, mkpa unu ga-abụ ịzụ ụmụ unu ka ha mụta ihe ndị ga-enyere ha aka mgbe ha ga-abụ dimkpa. Ọ bụrụ na unu aghọta ya otú ahụ, obi ga-adị unu ụtọ na ụmụ unu hapụrụ ụlọ pụọ gaa biri nke ha.​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Mak 10:⁠7.

N’eziokwu, o nweghị mgbe ị ga-akwụsị ịbụrụ ụmụ gị nne ma ọ bụ nna. ka ọ dịgodị, ị na-arụrụ ha ọrụ ka onye ndụmọdụ, ọ bụghị onye na-agwa ha ihe niile ha ga-eme. Ọrụ ọhụrụ a ị na-arụrụ ụmụ gị ga-akacha mee ka gị na ha dịrịkwuo ná mma, gị enwekwa ohere ị ga-eji rụọ ọrụ gị bụ́ isi, ya bụ, ilekọta di gị ma ọ bụ nwunye gị otú o kwesịrị. *​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Matiu 19:⁠6.

Na-ekwurịtanụ mkpa unu. Gwa di gị ma nwunye gị otú obi dị gị gbasara ọnọdụ ọhụrụ a unu nọ na ya, dịkwa njikere ige ntị ihe yanwa chere gbasara ya. Nwee ndidi, chebakwara ọnọdụ onye nke ọzọ echiche. O nwere ike iwetụ oge tupu mbọ ị na-agba ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị dịkwuo ná mma rụpụta ihe, ma mara na mbọ gị ahụ abụghị igbu oge.​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Ndị Kọrịnt 13:⁠4.

Chọta ihe ọhụrụ unu ga-emekọ ọnụ. Gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe ndị ị ga-achọ ka unu abụọ mekọọ ọnụ. Dị ka ihe atụ, unu amụtala ọtụtụ ihe n’ịzụ ụmụ, ùnu nwere iji amamihe unu nwetara nyere ndị ọzọ aka?​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Job 12:⁠12.

Chebaranụ ihe mere unu ji lụọ echiche. Chetaghachiri onwe gị ihe ndị ahụ dọtara masịrị gị n’ebe di gị ma ọ bụ nwunye gị nọ mere unu ji lụọ. Chetanụ otú unu si mekọọ ihe ọnụ na otú unu si jikọọ aka gboo nsogbu ndị bịarala unu kemgbe unu lụrụ. Ọ ga-enyere unu aka ịna-enwe obi ụtọ ugbu a ụmụ unu na-anọghịzi ya. N’eziokwu, ọ bụrụ na unu ana-emekọ ihe ọnụ unu ga-enwe ike ime ka alụmdi na nwunye unu tọkwuo ụtọ, meekwa ka ụdị ịhụnanya ahụ mere unu ji lụọ ibe unu lọghachi.

^ para. 4 O si n’akwụkwọ bụ́ Emotional Infidelity.

^ para. 12 Ọ bụrụ na ị ka na-azụ ụmụ, cheta na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ka bụkwa “otu anụ ahụ́.” (Mak 10:⁠8) Obi na-akacha eru ụmụaka ala ma ha chọpụta na nne na nna ha na-emekọ ihe ọnụ.