Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 4 n'Afọ 2017

Aha ọma mmadụ nwere na-eme ka ndị ọzọ tụkwasị ya obi ma na-akwanyekwara ya ùgwù

‘Ezi Aha Dị Mma Karịa Akụ̀ Dị Ukwuu’

‘Ezi Aha Dị Mma Karịa Akụ̀ Dị Ukwuu’

NDỊ mmadụ anaghị eji aha ọma ha egwuri egwu. Ọ bụ ya mere mba ụfọdụ ji mee iwu megidere mmadụ imebi aha mmadụ ibe ya. Iwu ndị dị otú ahụ megidere mmadụ ikwu, ide, ma ọ bụ ịgbasa ozi ndị na-emebi aha mmadụ ibe ha. Ihe a na-echetara anyị ihe Baịbụl kwuru kemgbe gboo. Baịbụl sịrị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu; amara dị mma karịa ọbụna ọlaọcha na ọlaedo.” (Ilu 22:⁠1) Ma, olee ihe anyị ga-eme iji nweta aha ọma, ndị mmadụ a na-akwanyekwara anyị ùgwù? E nwere ọtụtụ ọmarịcha ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka.

Dị ka ihe atụ, ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma isi nke 15. Mgbe a jụrụ ọ bụ abụ ahu, sị: “Ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu [Chineke]?” ọ zara, sị: “Ọ bụ onye . . . na-eme ezi omume, onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya. Ọ dịghị . . . ekwutọ mmadụ. Ọ dịghị eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ, ọ dịghịkwa akọcha onye ya na ya na-akpachi anya. N’anya ya, onye ọ bụla nke na-abaghị n’ihe bụ onye a jụrụ ajụ . . . Ọ bụrụ na ọ ṅụọ iyi nke pụrụ iwetara ya nsogbu, ọ dịghị agbanwe ya. . . . Ọ dịghịkwa eri ngarị.” (Abụ Ọma 15:​1-5) Ị̀ gaghị akwanyere onye na-akpa àgwà ọma ndị dị otú ahụ ùgwù?

Ihe ọzọ na-emekwa ka a na-akwanyere mmadụ ùgwù bụ ịdị umeala n’obi. Ilu 15:33 kwuru, sị: “Ịdị umeala n’obi na-ebute otuto ụzọ.” Chetụgodị echiche: Ndị dị umeala n’obi hụ ebe ha anaghị emetacha, ha na-agbalịsi ike hụ na ha meziri ya. ha na-adịkwa njikere ịrịọ onye ha mejọrọ mgbaghara. (Jems 3:⁠2) Ma, ndị dị mpako anaghị eme otú ahụ, kama obere ihe ọ bụla, e mejọọla ha. Ilu 16:18 kwuru, sị: “Nganga na-abịa tupu nkụpịa, mmụọ mpako na-abịakwa tupu ịsụ ngọngọ.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ emebie aha gị? Gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-eji iwe megwara onye ahụ ozugbo? Jụgodị onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ agbalịwa ka m zọọ isi m, ọ̀ ga-eme ka ụgha ahụ e ji mebie aha m na-agbasakwu?’ Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ o nwere ike ịkacha mma iwega okwu ahụ n’ụlọ ikpe, ma Baịbụl gbara anyị ume, sị: “Ejila ọkụ ọkụ akpọ mmadụ ikpe.” Kama, “gị na mmadụ ibe gị kpezie okwu.” (Ilu 25:​8, 9) * Ime ihe a Baịbụl kwuru nwere ike ime ka anyị ghara ịga mefusiwe ego n’ụlọ ikpe.

Baịbụl abụghị akwụkwọ na-ekwu naanị gbasara okpukpe. Ọ bụ akwụkwọ e kwesịrị ịtụkwasị obi na-agwa anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. Ndị niile na-eji okwu amamihe ya ebi ndụ na-akpa àgwà ndị ga na-ewetara ha aha ọma, na-emekwa ka a na-akwanyere ha ùgwù.

^ para. 5 Ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka idozi esemokwu dị na Matiu 5:​23, 24; 18:​15-17.