Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 3 n'Afọ 2016

 IHE GBASARA NDỊ OGE OCHIE

Ignaz Semmelweis

Ignaz Semmelweis

O NWERE ike ịbụ na ọtụtụ ndị amaghị gbasara nwoke a a na-akpọ Ignaz Semmelweis, ma, ihe ndị o mere mgbe ọ nọ ndụ abaarala ọtụtụ ezinụlọ uru. A mụrụ ya na Họngarị, n’obodo a na-akpọbu Buda, nke a na-akpọzi Budapest. Ọ bụ dọkịta. Ọ gụchara akwụkwọ n’afọ 1844 na mahadum dị na Viena. N’afọ 1846, ọ malitere ịrụ ọrụ n’otu ụlọ ọgwụ a na-amụ nwa dị na Viena. Ma, e nwere otu mkpamkpa nọ na-akpa n’ụlọ ọgwụ ahụ. Ihe dị ka otu onye n’ime ụmụ nwaanyị asaa ọ bụla bịara ụlọ ọgwụ ahụ mụọ nwa na-ebute otu ọrịa nke na-emecha gbuo ya.

E mere nchọnchọ dị iche iche ka a chọpụta ihe na-akpata ọrịa ahụ, ma, mbọ niile a gbara kụrụ afọ n’ala. O nweghị ihe e ji n’aka a ga-eme ka ọ kwụsị. Otú ahụ ụmụ nwaanyị ndị ahụ si na-anwụ nọ na-enye Semmelweis nsogbu n’obi, ya ekpebie na ya ga-achọpụtarịrị ihe na-akpata ọrịa ahụ nakwa otú a ga-esi egbochi ya.

Ụlọ ọgwụ ahụ Semmelweis na-arụ ọrụ nwere ụzọ ebe abụọ a na-amụ nwa. O juru onye ọ bụla anya na ọtụtụ n’ime ụmụ nwaanyị mụrụ nwa n’ebe nke mbụ na-emecha nwụọ. Naanị ihe dị iche n’ụzọ ebe abụọ ahụ bụ na ọ bụ ụmụ akwụkwọ ndị dọkịta na-arụ n’ebe nke mbụ, ebe ụmụ akwụkwọ ndị na-aghọ nwa na-arụ n’ebe nke abụọ. Oleezi ihe mere ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị mụrụ nwa n’ebe nke mbụ ahụ ji emecha nwụọ? Semmelweis mere ọtụtụ nchọnchọ, meekwa ihe dị iche iche o chere e kwesịrị ime, ma, ihe na-ebenụ ka nọkwa na-ebe.

Ka ọ na-erule n’afọ 1847, Semmelweis chọpụtara ihe o yiri ya ka ọ̀ bụ ya na-egbu ụmụ nwaanyị ndị ahụ. Jakob Kolletschka, bụ́ enyi ya na-arụ n’otu ụlọ ọgwụ ahụ, nwụrụ. Ihe gburu ya bụ nje banyere n’ọbara ya. O butere nje ahụ mgbe o merụrụ ahụ́ oge ọ na-enyocha ahụ́ onye nwụrụ anwụ iji chọpụta otú onye ahụ si nwụọ. Mgbe Semmelweis na-enyocha ihe a chọpụtara gburu enyi ya ahụ, ọ chọpụtara  na ihe gburu ya yiri ihe na-egbu ụmụ nwaanyị ndị ahụ. Ihe a mere ka o chewe na ọ ga-abụrịrị na e nwere nje a na-esi n’ozu bufee n’ahụ́ ụmụ nwaanyị dị ime nke na-akpata ọrịa ọjọọ ahụ na-egbu ha. Ọ ga-abụ na ndị na-ebunye ha nje ahụ n’amaghị ama bụ ndị dọkịta na-eme ha nyochachaa ozu, ha agawa ịghọ nwa ma ọ bụ gawa ile nwaanyị dị ime ahụ́. O nweghị ihe na-eme ọtụtụ ndị mụrụ nwa n’ebe nke abụọ ahụ ụmụ akwụkwọ na-aghọ nwa na-arụ n’ihi na ụmụ akwụkwọ ahụ anaghị enyocha ozu.

Semmelweis gwaziri ụmụ akwụkwọ ndị dọkịta ahụ niile na ha ga-ejirịrị ihe na-egbu nje kwọọ aka tupu ha agawa ibitụ nwaanyị dị ime aka. Ihe gbanwere, o nweghịzi ihe na-eme ọtụtụ ụmụ nwaanyị mụrụ nwa n’ebe ahụ ụmụ akwụkwọ dọkịta na-arụ.

Ignaz Semmelweis kwuru, sị: “Mkpa m bụ ịkwụsị ọrịa a na-emecha gbuo ụmụ nwaanyị ndị nọ n’ụlọ ọgwụ mụọ nwa, ha kwesịrị ịdịrị di ha na ụmụ ha ndụ.”

Ma, o nwere ndị ihe a bara uru Semmelweis chọpụtara na-adịchaghị mma n’obi. Ọga ya malitere inwere ya anyaụfụ, chụọkwa ya n’ọrụ n’ihi na ihe ahụ Semmelweis chọpụtara dị iche n’ihe yanwa kwuru kpatara ọrịa ahụ. Mgbe ọ laghachiri Họngarị, e mere ya onyeisi na ngalaba na-ahụ maka ụmụ nwaanyị dị ime n’ụlọ ọgwụ dị n’obodo a na-akpọ Pest. Mgbe ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ ahụ malitere ịkwọ aka otú ahụ o kwuru ka a na-akwọ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na e nweghịzi nwaanyị mụrụ nwa n’ụlọ ọgwụ ahụ na-anwụ n’ihi ọrịa ọjọọ ahụ.

N’afọ 1861, Semmelweis bipụtara otu akwụkwọ o ji kọwaa ihe na-akpata ọrịa ahụ nakwa otú e si egbochi ya. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị ejighị ihe ahụ ọ chọpụtara kpọrọ ihe n’oge ahụ. N’ihi ya, ọrịa ahụ tara isi ọtụtụ ndị.

Semmelweis gbara mbọ hụ na ndị niile na-arụ n’ụlọ ọgwụ ọ na-elekọta na-akwọ aka tupu ha agawa ilebara ụmụ nwaanyị dị ime anya.—Ọ bụ Robert Thom sere ihe a

E mechara gụnye Semmelweis ná ndị kwuru ihe dị mkpa na-enye aka igbochi ọrịa. Ihe ndị ọ chọpụtara mere ka o doo anya na nje, bụ́ ihe anyị na-anaghị ahụ anya, nwere ike ịkpata ọrịa. Ihe ndị ahụ abaala uru karịa ọtụtụ nchọpụta ndị ọzọ e merela gbasara otú a ga-esi na-egbochi ọrịa. N’ihe karịrị puku afọ atọ tupu Semmelweis achọpụta ihe gbasara ịkwọ aka, Iwu Mozis ekwuolarị ihe onye metụrụ ozu aka kwesịrị ime. E mechakwara denye Iwu ahụ n’ime Baịbụl.