Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 3 n'Afọ 2017

 ISIOKWU TETA! A | OLEE IHE GOSIRI NA BAỊBỤL SI N’AKA CHINEKE?

Baịbụl​—⁠Ihe Niile O Kwuru Bụ Eziokwu

Baịbụl​—⁠Ihe Niile O Kwuru Bụ Eziokwu

Ihe O Kwuru Banyere Sayensị Bụ Eziokwu

Ọ BỤ eziokwu na Baịbụl abụghị akwụkwọ sayensị, ma o kwuo gbasara ụwa anyị a, ihe o kwuru na-abụ eziokwu. Ka anyị leba anya n’ihe ndị o kwuru gbasara mmiri ozuzo na otú nwa nọ n’afọ si eto.

OTÚ MMIRI SI EZO

OTÚ MMIRI SI EZO

Baịbụl kwuru, sị: “[Chineke] na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala; mmiri ahụ na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ ya. Mmiri ewee si n’ígwé ojii na-atapụta.”​—⁠Job 36:​27, 28.

N’amaokwu a, Baịbụl kwuru ihe atọ na-eme tupu mmiri ezoo. Nke mbụ bụ na Chineke, bụ́ onye kere anwụ “na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala.” Nke abụọ, mmiri ahụ anwụ mịkọọrọ na-aghọ alụlụụ ma ọ bụ ígwé ojii. Nke atọ, mmiri na-esizi n’ígwé ojii ahụ zoo. Ruo ugbu a, ndị na-enyocha ihu ígwé aghọtachabeghị ihe niile gbasara mmiri ozuzo. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji jụọ, sị: “Ònye pụrụ ịghọta urukpuru ígwé ojii?” (Job 36:29) Ma, Onye kere eluigwe na ụwa maara ihe niile gbasara mmiri ozuzo. Ọ bụ ya mere ihe niile e dere na Baịbụl gbasara mmiri ozuzo ji bụrụ eziokwu. O mere ka e dee ihe a mgbe ndị mmadụ na-enwebeghị ike iji sayensị kọwaa otú mmiri si ezo.

OTÚ NWA NỌ N’AFỌ SI ETO

OTÚ NWA NỌ N’AFỌ SI ETO

Eze Devid, bụ́ onye so dee Baịbụl kwuru, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị.” (Abụ Ọma 139:16) Ihe Devid na-ekwu bụ na e dere ihe niile gbasara otú nwa e bu n’afọ si eto n’akwụkwọ, ya bụ, na o nwere ụkpụrụ ọ na-eso. Ọ́ dịghị ịtụnanya na Devid dere amaokwu a ihe dị ka puku afọ atọ gara aga?

Ma, ọ ka bụ n’ihe dị ka n’agbata afọ 1850 na afọ 1865 ka otu onye Ọstria na-amụ banyere osisi aha ya bụ Gregor Mendel chọpụtara ihe ụfọdụ gbasara mkpụrụ ndụ. Ọ ka bụkwa n’Eprel afọ 2003, ka ndị sayensị bịara ghọta otú e si hazie mkpụrụ ndụ mmadụ, nke ihe niile banyere otú mmadụ ga-adị ma o too dị n’ime ya. Ndị sayensị sịrị na a haziri ihe ndị dị n’ime mkpụrụ ndụ n’usoro dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu nke okwu dị iche iche dị n’ime ya, mkpụrụ akwụkwọ dị iche iche adịrịkwa n’ime okwu ndị ahụ. Ọ bụ n’okwu ndị ahụ ka e dere ihe niile gbasara otú mmadụ ga-adị. Ọ bụ ihe ndị ahụ e dere n’ime ha na-eme ka akụkụ ahụ́ dị iche iche nke nwa e bu n’afọ, dị ka, ụbụrụ ya, obi ya, akpa ume ya, na ụkwụ ya na aka ya pụta mgbe ha kwesịrị ịpụta. Ọ bụ ya mere ndị sayensị ji kwuo na mkpụrụ ndụ dị ka “akwụkwọ nke ndụ.” Gịnị nyeere Devid, bụ́ onye so dee Baịbụl, aka ide ihe bụ́ eziokwu gbasara otú nwa e bu n’afọ si eto? O kwuru, sị: “Ọ bụ mmụọ Jehova kwuru okwu site n’ọnụ m, okwu ya dịkwa n’ire m.” *​—⁠2 Samuel 23:⁠2.

 Ihe Niile Baịbụl Kwuru Na-emezu Otú Ahụ O Si Kwuo Ha

O NWERE otu ihe sigburu onwe ya n’ike, nke na-agaghịkwa ekwe omume. Ihe ahụ bụ inwe ike ịma mgbe alaeze dị iche iche na obodo dị iche iche ga-amalite ịkpa ike, otú ha ga-akparu n’ike na mgbe ha ga-ada. Ma, Baịbụl kwuru mgbe a ga-ebibi ọtụtụ obodo ndị dị ike na otú a ga-esi ebibi ha. Ka anyị leba anya na abụọ n’ime ha.

BABỊLỌN GA-ADA MA GHỌỌ EBE TỌGBỌỌRỌ N’EFU

Babịlọn oge ochie bụ alaeze ukwu kpara ike dị egwu n’ebe ọdịda anyanwụ Eshia ruo ọtụtụ narị afọ. O nwekwara mgbe Babịlọn bụ obodo kachanụ n’ụwa niile. Ma, ihe dị ka narị afọ abụọ tupu e bibie Babịlọn, Chineke mere ka otu onye so dee Baịbụl aha ya bụ Aịzaya buo amụma na otu ọchịagha aha ya bụ Saịrọs ga-akwatu ọchịchị Babịlọn, nakwa na Babịlọn ga-emecha tọgbọrọ n’efu n’enweghị onye ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Aịzaya 13:​17-20; 44:​27, 28; 45:​1, 2) Ihe a ò mecharanụ mee?

AKỤKỌ IHE MERE EME

N’otu abalị, n’ime ọnwa Ọktoba afọ 539 Tupu Oge Ndị Kraịst, Saịrọs Onye Ukwu meriri Babịlọn. O teghị aka, ọwa mmiri ndị mmiri na-esi na ha abata n’ala ndị gbara Babịlọn gburugburu sụchiri n’ihi enweghị onye na-elekọta ha. Ka ọ na-erula ihe dị ka n’afọ 200 Oge Ndị Kraịst, a sịrị na o nweghịzi onye a na-ahụ ebe ahụ. Taa, Babịlọn bụzi mkpọmkpọ ebe. Otú ahụ Baịbụl si kwuo ya ka o si mee. Babịlọn bụzi “ebe tọgbọrọ n’efu kpamkpam.”​—⁠Jeremaya 50:⁠13.

Olee ebe onye dere ihe a na Baịbụl si mata gbasara ihe a o dere nke mezuru nnọọ otú ahụ o si dee ya? Baịbụl mere ka anyị mata na ọ bụ “okwu ikpe e kwuru megide Babịlọn, nke Aịzaya nwa Emọz nụrụ mgbe ọ hụrụ ọhụụ.”​—⁠Aịzaya 13:⁠1.

NINIVE GA-AGHỌ ‘ALA KPỌRỌ NKỤ KA ALA ỊKPA’

E weere Ninive bụ́ isi obodo Alaeze Ukwu Asiria ka otu n’ime obodo ndị a rụrụ ihe ndị dị ịtụnanya na ha. Obodo Ninive nwere ọtụtụ okporo ámá ndị dị obosara, ebe ọhaneze na-anọ atụrụ ndụ, ụlọ nsọ na obí eze ndị buru ezigbo ibu. Ma, n’agbanyeghị ihe ndị a niile, Zefanaya onye amụma kwuru na obodo a dị ịtụnanya ga-emecha ghọọ “ebe tọgbọrọ n’efu, . . . nke mmiri na-adịghị dị ka ala ịkpa.”​—⁠Zefanaya 2:​13-15.

N’ihe dị ka n’afọ 630 T.O.N.K., ndị agha Babịlọn na ndị agha Midia jikọrọ aka laa Ninive n’iyi kpamkpam. Otu akwụkwọ kwuru na “e chefuru [Ninive] ruo ihe dị ka puku afọ abụọ na narị ise.” Ruo oge ụfọdụ, ndị mmadụ nọ na-asị na o nweghị obodo bụ́ Ninive. Ọ bụ n’ihe dị ka n’afọ 1850 ka e gwupụtara ihe ndị gosiri na o nwere mgbe Ninive dị. Taa, ihe ndị dị n’ebe ahụ na-ala n’iyi, ndị mmadụ ana-emebisikwa ụfọdụ. Ọ bụ ya mere Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ichekwa Ihe Mgbe Ochie ji na-agwa ọhaneze, sị: “Ọ bụrụ na ihe ndị fọrọ na Ninive efuchaa, o nwere ike ime ka echefuo Ninive ruo mgbe ebighị ebi.”

Olee ebe Zefanaya si nweta ihe o dere gbasara Ninive tupu ya emee? Zefanaya kwuru na ọ bụ “okwu Jehova nke ruru [ya] ntị.”​—⁠Zefanaya 1:⁠1.

 Baịbụl Zara Ajụjụ Ndị Dị Ezigbo Mkpa

BAỊBỤL zara ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa ná ndụ anyị. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

GINI MERE IHE ỌJỌỌ NA AHỤHỤ JI JU N’ỤWA?

Baịbụl kọwara ihe mere ihe ọjọọ na ahụhụ ji ju n’ụwa. O kwuru, sị:

  1. ‘Mmadụ achịwo mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’​—⁠Ekliziastis 8:⁠9.

    Ọchịchị ọjọọ na nrụrụ aka ndị ọchịchị emeela ka ụmụ mmadụ na-ahụsi anya.

  2. “Oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”​—⁠Ekliziastis 9:⁠11.

    Ihe ndị a na-atụghị anya ya, dị ka, ajọ ọrịa, ihe mberede, na ọdachi nwere ike ịdakwasị onye ọ bụla, mgbe ọ bụla, nakwa n’ebe ọ bụla.

  3. “Mmehie si n’aka otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata.”​—⁠Ndị Rom 5:⁠12.

    Ezughị okè na ọnwụ adịghị mgbe Chineke kere nwoke na nwaanyị mbụ. Mmehie ‘batara n’ụwa’ mgbe ha kpachaara anya nupụrụ Onye kere ha isi.

E wezụga ihe mere anyị ji ata ahụhụ, o nwekwara ihe ọzọ Baịbụl kwuru. O kwuru na Chineke kwere nkwa iwepụ ihe ọjọọ, nakwa na “ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”​—⁠Mkpughe 21:​3, 4.

GỊNỊ NA-EME ANYỊ MA ANYỊ NWỤỌ?

Baịbụl mere ka anyị mata na mmadụ nwụọ, onye ahụ enweghịzi ihe ọ bụla ọ ma, o nweghịkwa ike ime ihe ọ bụla. Ekliziastis 9:5 kwuru, sị: “N’ihi na ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ, ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Mmadụ nwụọ, “echiche ya na-ala n’iyi.” (Abụ Ọma 146:⁠4) Ụbụrụ onye ahụ na ihe niile na-eme ka ọ mata ihe na-emenụ na-akwụsị ịrụ ọrụ. Ọ bụ ya mere na onye nwụrụ anwụ enweghị ike ịrụ ọrụ, inwe mmetụta ma ọ bụ iche echiche.

E wezụga ikwu gbasara ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, o nwekwara ihe ọzọ Baịbụl kwuru. Ọ gwara anyị ihe na-eme obi ụtọ nke bụ́ na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.​—⁠Hosia 13:14; Jọn 11:​11-14.

GỊNỊ MERE CHINEKE JI KEE MMADỤ?

Baịbụl gwara anyị na ọ bụ Chineke kere nwoke na nwaanyị. (Jenesis 1:27) A kpọrọ nwoke mbụ ahụ bụ́ Adam “nwa Chineke.” (Luk 3:38) Ihe Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ bụ ka ha na ya dịrị ná mma, nakwa ka ha jupụta ụwa, biri na ya na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. Chineke kekwara ụmụ mmadụ ka agụụ ife ya na-agụ ha, ya bụ, ka ha na-achọ ịmata banyere ya.  Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”​—⁠Matiu 5:⁠3.

Baịbụl kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị na-anụ okwu Chineke ma na-edebe ya!” (Luk 11:28) Ọ bụghị naanị na Baịbụl na-akụziri anyị banyere Chineke, kama, ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi ebi ezigbo ndụ ugbu a, na-emekwa ka anyị nwee olileanya na ọdịnihu ga-aka mma.

Gụọ Baịbụl Ka Ị Mata Uche Chineke

MGBE ọtụtụ ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa lebachara anya n’ihe ndị gosiri na Baịbụl bụ Okwu Chineke, ha kwetara na Baịbụl abụghị naanị akwụkwọ nkịtị e dere n’oge ochie. Ha kwetasiri ike na Baịbụl bụ Okwu Chineke, ya bụ, ihe Chineke si n’ike mmụọ nsọ ya na-agwa ụmụ mmadụ, ma gịnwa. Baịbụl kwuru na Chineke na-akpọ gị ka ị bịa bụrụ enyi ya. Ọ sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”​—⁠Jems 4:⁠8.

Ịgụ Baịbụl ga-eme ka ị mata ọtụtụ ihe. Gịnị ka ihe ndị ahụ bụ? Otú ahụ ịgụ akwụkwọ nkịtị si eme ka ị mata ihe onye dere ya bu n’obi ka ịgụ Baịbụl ga-esi eme ka ị mata ihe Chineke bu n’obi. Olee uru o nwere ike ịbara gị? Ọ ga-eme ka ị mata ihe ndị na-amasị onye kere gị na otú obi na-adị ya. Ihe ọzọ bụ na Baịbụl ga-eme ka ị mata:

Ị̀ ga-achọ ịmatakwu gbasara Chineke? Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka. Ha nwere ike ịgwa mmadụ ka ọ bịa ka gị na ya na-amụ Baịbụl n’efu. Ịmụ Baịbụl ga-enyere gị aka ịbịaru Jehova Chineke nso, bụ́ onye e dere okwu ya na Baịbụl.

N’isiokwu a, anyị elebala anya n’ihe dị iche iche gosiri na Baịbụl bụ n’eziokwu akwụkwọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara Baịbụl, gụọ isi nke 2 n’akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya, i nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/⁠ig. Ihe a nwekwara ike ibuga gị ebe ahụ

I nwekwara ike ile vidio bụ́ Uche Ònye Ka E Dere na Baịbụl? Ị ga-ahụ ya na www.jw.org/⁠ig

Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa VIDIO

^ para. 10 Na Baịbụl, ezigbo aha Chineke bụ Jehova.​—⁠Abụ Ọma 83:18.