IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Di na nwunye ịna-ekele ibe ha maka ihe ọma ha na-eme so n’ihe na-eme ka ezinụlọ na-adị n’udo. Ma, ọtụtụ ndị di na nwunye taa anaghịzi agba mbọ ịhụ ihe ọma onye nke ọzọ na-eme, ma ya fọdụzie ikele ya maka ya. N’akwụkwọ bụ́ Emotional Infidelity, otu onye na-enye ndị di na nwunye ndụmọdụ kwuru na ihe ọtụtụ ndị di na nwunye na-abịa ahụ ya “na-ahụkarị mgbe niile bụ ihe a na-anaghị emeta [n’alụmdi na nwunye ha], kama ịna-ahụ ihe a na-emeta. Ihe ha na-agwakarị m bụ ihe ha chọrọ ka ọ kwụsị, ọ bụghị ihe ha chọrọ ka e mere na-aga. Ihe bụ́ nsogbu ndị di na nwunye ndị a bụ na ha anaghị ekele ibe ha maka ihe ọma ha na-eme.”

Olee otú di ma ọ bụ nwunye nwere ike isi gbochie ụdị nsogbu a n’ezinụlọ ha?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Di na nwunye ịna-ekele ibe ha nwere ike ime ka nsogbu ha belata. Ọ bụrụ na di na nwunye ana-agbalị na-ahụ ihe ọma onye nke ọzọ na-eme ma na-ekele ya maka ya, ọ ga-eme ka alụmdi na nwunye ha na-esikwu ike. Naanị di ma ọ bụ nwunye ịmata na ihe ọ na-eme dị onye nke ọzọ mma nwere ike ime ka esemokwu bie.

Ndị nwunye. Akwụkwọ ahụ anyị kwuburu okwu ya a na-akpọ Emotional Infidelity sịrị na “ọtụtụ ụmụ nwaanyị enweghị ihe ha ji ahụhụ di ha na-ata iji na-akpa afọ ezinụlọ ha kpọrọ.” N’obodo ụfọdụ, ndị di ka na-ata ezigbo ahụhụ iji na-akpa afọ ezinụlọ ha n’agbanyeghị na nwunye ha na-arụ ọrụ.

Ndị di. Ụmụ nwoke na-eledakarị mbọ ndị nwunye ha na-agba n’ezinụlọ anya, dị ka inye aka na-akpa afọ ezinụlọ, ịzụ ụmụaka na ilekọta ụlọ. Fiona, * bụ́ nwaanyị nọ na di kemgbe ihe dị ka afọ atọ kwuru, sị: “O nweghị onye na-anaghị emejọ ihe. Mụnwa mejọọ ihe, ọ na-ewute m. N’ihi ya, ọ bụrụ na di m ajaa m mma maka ọrụ m rụrụ n’ụlọ, m na-amata na ọ hụrụ m n’anya n’agbanyeghị ihe ndị m na-emejọ. Ọ na-emekwa ka m mata na ọ na-akwado m. Obi na-adịkwa m ụtọ.”

Ma, ọ bụrụ na ọ na-adị di ma ọ bụ nwunye ka o nweghị ihe e ji ya kpọrọ, o nwere ike ime ka o lewe anya n’èzí. Otu nwaanyị nọ na di aha ya bụ Valerie kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ọ na-adị gị ka di gị ma ọ bụ nwunye gị enweghị ihe o ji gị kpọrọ, ọ ga-adịrị gị mfe inwewe mmasị n’ebe onye ọzọ ji gị kpọrọ ihe nọ.”

 IHE I NWERE IKE IME

Anya ruo gị ala. N’izu na-abịanụ, gbalịa na-achọpụta ihe ọma di gị ma ọ bụ nwunye gị na-eme. Gbalịakwa chọpụta ihe ndị ọ na-eme iji hụ na ihe na-aga nke ọma n’ezinụlọ, o nwere ike ịbụ ihe ndị ị na-elegharabu anya n’oge ndị gara aga. Ná ngwụcha izu ahụ, depụta (1) ihe ndị o mere masịrị gị na (2) ihe ndị o mere iji kwadoo ezinụlọ unu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 4:8.

Gịnị mere anya iru mmadụ ala ji dị mkpa? Otu nwaanyị nọ na di aha ya bụ Erika kwuru, sị: “Afọ ole na ole gachaa unu lụrụ, i nwere ike ịkwụsị iji di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpọrọ ihe. I nwere ike ịkwụsị ịna-ahụ ihe ọma ndị ọ na-eme. Ihe ị ga na-ahụzi mgbe niile bụ ihe ndị ọ na-anaghị emeta.”

Jụgodị onwe gị, sị: ‘M̀ na-eleghara mbọ di m ma ọ bụ nwunye m na-agba anya?’ Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na o nwere ihe di gị meziri n’ụlọ, ị̀ na-agbachi nkịtị ma ghara ikele ya n’ihi na i chere na ọ bụ ọrụ dịịrị ya? Ọ bụrụ na ị bụ di, ị̀ na-eche na mbọ nwunye gị na-agba ilekọta ụmụ unu erughị nke ị ga-eji bịa kelewe ya n’ihi na ọ bụ ihe o kwesịrị ime ka ọ na-eme? Gbalịa ka ị na-ahụta ihe ọma ọ bụla di gị ma ọ bụ nwunye na-eme iji na-akwado ezinụlọ unu, na-ajakwa ya mma maka ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Rom 12:10.

Na-aja ya mma mgbe niile. Baịbụl agwaghị anyị naanị ka anyị na-ekele ndị ọzọ maka ihe ọma ha mere, kama, ọ gwara anyị, sị: “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.” (Ndị Kọlọsi 3:15) N’ihi ya, gbalịa ka ọ mara gị ahụ́ ịna-ekele dị gị ma ọ bụ nwunye gị maka ihe ọma o mere. Otu nwoke aha ya bụ James kwuru, sị: “Nwunye m kelee m maka ihe ndị m na-eme, ọ na-eme ka m na-agbalịsikwu ike ịbụ ezigbo di na ime ka alụmdi na nwunye anyị na-aga nke ọma.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 4:6.

Di na nwunye na-ekele ibe ha maka ihe ọma ndị ha mere na-eme ka alụmdi na nwunye ha na-esikwu ike. Otu di aha ya bụ Michael kwuru, sị: “N’uche m, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye ana-elekwasị anya n’ihe ndị na-amasị ya n’ebe onye nke ọzọ nọ, ọ ga-eme ka ọtụtụ ezinụlọ ghara itisa. Nsogbu bilite, ọ ga-ara ahụ́ ha echewe echiche itisa n’ihi na e nweela ọtụtụ ihe mere ka ha mata na ha lụtara ezigbo mmadụ.”

^ para. 9 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ha.