Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 1 n'Afọ 2017

Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Bụ Onyinye I Kwesịrị Ịna-enyetụ Ndị Ọzọ

Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Bụ Onyinye I Kwesịrị Ịna-enyetụ Ndị Ọzọ

Ọ BỤRỤ na mmadụ ahụ gị mụmụọrọ gị ọnụ ọchị, olee ihe ị ga-eme? O doro anya na ị ga-amụmụkwara ya ọnụ ọchị, obi adịkwa gị ezigbo ụtọ. N’eziokwu, enyi mmadụ ma ọ bụ onye mmadụ na-amaghị mụmụọrọ ya ọnụ ọchị, obi na-atọ onye ahụ ụtọ, ya ebidokwa mụmụwa ọnụ ọchị. Otu nwaanyị aha ya bụ Magdalena kwuru, sị: “Mgbe Georg di m ka nọ ndụ, ọ na-amụmụkarị ọnụ ọchị. Ihu mụ na ya kukọta, obi na-eru m ala.”

Ịmụmụ ọnụ ọchị na-egosi na obi dị mmadụ mma. Otu akwụkwọ a na-akpọ Observer nke ụlọ ọrụ Association for Psychological Science na-ebipụta kwuru, sị: “Ịmụmụ ọnụ ọchị . . . dị ka ihe si n’okike.” O kwukwara na ụmụaka a mụrụ ọhụrụ “hụ otú mmadụ si mee ihu, ha na-aghọta ihe ọ pụtara.” Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụghị naanị na ndị mmadụ na-esi n’ịmụmụ ọnụ ọchị amata otú obi dị mmadụ, kama ha na-esikwa na ya amata ihe hanwa ga-eme.”

Ndị na-eme nchọpụta na mahadum Harvard dị n’Amerịka leruru ndị ọrịa ụfọdụ katara ahụ́ anya ka ha chọpụta otú ha si akpa àgwà ma ha hụ otú ihu dị ndị dọkịta na-elekọta ha. Ndị ahụ mere nchọpụta ahụ sị na ọ bụrụ na ndị ọrịa a ahụ na ihu ndị dọkịta na ndị nọọsụ na-elekọta ha dị mma, ọ na-eme ka obi dị ha mma, na-emekwa ka ha na-agbake ngwa ngwa. Ma, obi anaghị adị  ndị ọrịa a mma ma ha hụ na ihu ndị dọkịta na ndị nọọsụ ndị a gbarụrụ agbarụ, ọ na-emekwa ka ha ghara ịgbake ngwa ngwa.

Ọ ga-abụkwa na mgbe ọ bụla ị mụmụrụ ọnụ ọchị, ị na-emere onwe gị ihe ọma. Ndị na-eme nchọpụta kwuru na o nwere ike ime ka ahụ́ rukwuo mmadụ ala, obi adị onye ahụ ụtọ, nchegbu ya ebelatakwa. Ma, ịgbarụ ihu na-akpata obi ọjọọ na nchegbu.

ỊMỤMỤ ỌNỤ ỌCHỊ “NA-EME KA OBI DỊ MỤ MMA”

Magdalena anyị kwuru okwu ya ná mmalite bụ Onyeàmà Jehova. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, e jidere ya na ndị ezinụlọ ya, tụkpuo ha n’ogige ịta ahụhụ Ravensbrück dị na Jamanị n’ihi na ha ekweghị eso ndị Nazi. Magdalena sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ndị nche ogige ịta ahụhụ ahụ anaghị ekwe anyị soro ndị mkpọrọ ndị ọzọ kwurịta okwu. Ma, ha agaghị egbochili anyị ịmụmụ ọnụ ọchị. Naanị ịhụ ka mama m na nwanne m nwaanyị na-amụmụrụ m ọnụ ọchị na-eme ka obi dị mụ mma, mụ enwekwuokwa ike ịna-edi nsogbu m nọ na ya.”

O nwere ike ọ dịghị gị nke ịmụmụwa ọnụ ọchị n’ihi nsogbu juru ná ndụ gị. Ma, cheta na ọ bụ n’ihi na ị na-echekarị banyere nsogbu ndị ahụ mere o ji na-adị gị otú ahụ. (Ilu 15:15; Ndị Filipaị 4:8, 9) N’agbanyeghị na ọ naghị adịcha mfe, gbalịa wepụtụ uche ná nsogbu gị. * Ịgụ Baịbụl na ikpe ekpere enyerela ọtụtụ ndị aka ịkwụsị ịna-eche banyere nsogbu ha. (Matiu 5:3; Ndị Filipaị 4:6, 7) Nke bụ́ eziokwu bụ na “obi ụtọ” na “ọṅụ” na okwu ndị ọzọ yiri ya pụtara ọtụtụ narị ugboro na Baịbụl. Gbalịa lee ma ị̀ ga na-agụ otu peeji ma ọ bụ abụọ kwa ụbọchị. O nwere ike ime ka i bidokwa na-amụmụ ọnụ ọchị mgbe niile.

Ihe ọzọ bụkwa, echela ka ndị ọzọ buru ụzọ mụmụọrọ gị ọnụ ọchị. Buru ụzọ mụmụọrọ ha ọnụ ọchị ka ha nwee obi ụtọ. N’eziokwu, ịmụmụ ọnụ ọchị bụ onyinye Chineke nyere gị nke ga na-eme gị na ndị ọzọ obi ụtọ.

^ para. 8 Gụọ isiokwu bụ́ “Ị̀ ‘Na-eri Oriri Mgbe Niile’?” Isiokwu a dị na Teta! Jenụwarị–Febụwarị 2014.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE (NKE A NA-AMỤ AMỤ)

Otú Anyị Ga-esi Jiri Obi Ụtọ Na-ejere Jehova Ozi

Gịnị mere ọtụtụ ndị ji eche na ha abaghị uru? Isiokwu a ga-egosi otú Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka iji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi.