Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 1 n'Afọ 2017

 ISIOKWU TETA! A

Gịnị Mere Ndị Na-eto Eto Ji Ada Mbà? Gịnị Ga-enyere Ha Aka?

Gịnị Mere Ndị Na-eto Eto Ji Ada Mbà? Gịnị Ga-enyere Ha Aka?

OTU onye na-eto eto aha ya bụ Anna * kwuru, sị: “Obi daa m mbà, anaghịzi m enwe mmasị ime ihe ọ bụla, ma ihe ndị m na-enwebu mmasị ime. Naanị ihe m na-enwezi mmasị ime bụ ihi ụra. Ọ na-adịkarị m ka o nweghị onye hụrụ m n’anya, na o nweghizi uru m bara, nakwa na m bụụrụ ndị ọzọ nsogbu.”

Onye na-eto eto ọzọ aha ya bụ Julia kwuru, sị: “M nọ na-achọ igbu onwe m. Ma n’eziokwu, achọghị m ịnwụ. M chọrọ ka ihe a na-eme m kwụsị. Abụ m onye hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ma, obi daa m mbà, o nweghịzi ihe m na-eji ha akpọrọ.”

Anna na Julia bidoro ịda mbà n’obi mgbe ha dị ihe dị ka afọ iri na anọ. Ọ bụ eziokwu na ndị na-eto eto ndị ọzọ na-ada mbà mgbe ụfọdụ, ma Anna na Julia na-ada mbà ruo ọtụtụ izu ma ọ bụ ọnwa. Anna kwuru, sị: “Ọ na-adị m nnọọ ka m̀ nọ n’ime olulu gbara ọchịchịrị nke m na-enweghị ike isi na ya pụta. Ọ na-adị m ka isi ọ̀ na-achọ imebi m.”

Ihe a na-eme Anna na Julia na-emekwa ọtụtụ ndị ọzọ. Ihe ndị na-eme eme gosiri na ọnụ ọgụgụ ndị na-eto eto na-ada mbà n’obi na-akarịzi akarị. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na “ihe kacha akpata ọrịa na nsogbu ndị ọzọ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nọ n’agbata afọ 10 na 19 na-enwe” bụ ịda mbà n’obi.

 Ihe ndị na-egosi na mmadụ ga-ada mbà n’obi nwere ike ibido mgbe onye ahụ ka dị obere. Ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ ehighị ụra nke ọma, erighị nri nke ọma, ibu ibu ma ọ bụkwanụ ịta ahụ́. Obi nwekwara ike ịna-ajọ onye ahụ njọ, ya ana-echekwa na o nweghịzi uru ya bara. Ihe ndị ọzọ e jikwa ama ya bụ onye ahụ ịna-akpa iche, ịna-echefukarị ihe, anya erughị ala, onye ahụ ịchọ igbu onwe ya na ihe ndị ọzọ. Ndị dọkịta chọọ ịmata ma mmadụ ò nwere ụdị nsogbu a, ha na-ele ma ò nwere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ e ji amata onye na-achọ ịda mbà n’obi na-eme onye ahụ ruo ọtụtụ izu, nakwa ma ihe ndị ahụ ọ̀ na-egbochi ya ime ihe ndị ọ na-emebu.

IHE NDỊ O NWERE IKE ỊBỤ HA NA-AKPATA ỊDA MBÀ N’OBI

Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru “na ihe na-akpata ịda mbà n’obi bụ ihe ndị na-eme gburugburu mmadụ, ihe na-eme n’ụbụrụ ya, na ihe na-eme ya n’ime ahụ́.” Ka anyị kọwaa ụfọdụ n’ime ha.

Ihe ndị dị n’ime ahụ́. Ọtụtụ mgbe, ịda mbà n’obi na-esi n’ezinụlọ, dị ka ọ dị n’ezinụlọ Julia anyị kwuru okwu ya ná mmalite. Ihe a gosiri na ịda mbà n’obi nwere ike ịdị n’ọbara ezinụlọ ụfọdụ nke nwere ike ịna-akpaghasị ụbụrụ ndị ezinụlọ ahụ. Ihe ndị ọzọ nwekwara ike ịkpata ya bụ ọrịa obi, mgbanwe ndị na-eme n’ahụ́ mmadụ na iṅụ ọgwụ ọjọọ. Ọ bụrụgodị na ịṅụ ọgwụ ọjọọ akpataghị ya, o nwere ike ime ka nke dị adị ka njọ. *

Ndọga na nchekasị. Ọ bụ eziokwu na mmadụ ịdọgatụ obere ndọga adịghị njọ, ma ya karịzie akarịa, o nwere ike ịkpatara mmadụ ụdị nsogbu dị iche iche. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ime ka onye na-eto eto ahụ́ ya na-esichaghị ike ibido dawa mbà n’obi. Ma, n’agbanyeghị ihe ndị a anyị kwuru, ihe ndị na-akpata ịda mbà n’obi edochabeghị anya, o nwekwara ike ịbụ na ọ bụ ọtụtụ ihe na-agbakọ aka akpata ya.

 Ihe ndị na-akpata nchekasị ndị na-eme ka mmadụ daa mbà n’obi bụ nne na nna mmadụ ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ tisaa, ọnwụ mmadụ, iti ihe ma ọ bụ ndina n’ike, ihe mberede okporo ụzọ, ọrịa ma ọ bụ enweghị isi akwụkwọ. Ọ na-aka njọ ma ọ bụrụ na nwata ahụ e chewe na ndị mmadụ ajụla ya. Ihe ndị ọzọ nwere ike ịkpata ya bụ nne na nna ịna-atụ anya ihe nwa ha na-agaghị emeli, dị ka ịbụ nwa ụbụrụ kacha aghọ nkọ n’ụlọ akwụkwọ. Ihe ndị ọzọ bụkwa ịchọ ụmụaka okwu, ịtụ ụjọ ọdịnihu, nne na nna ịgbahapụ ụmụ ha n’ihi nsogbu. Ọ bụrụ na onye na-eto eto adaa mbà, olee ihe ndị nwere ike inyere ya aka inweta onwe ya?

NYERE ONWE GỊ AKA

Ndị dara mbà nwere ike ịṅụ ọgwụ ma ọ bụ nweta enyemaka n’aka ndị dọkịta. * Jizọs Kraịst sịrị: “Mkpa ọgwọ ọrịa adịghị ndị ahụ́ dị mma, kama mkpa ya dị ndị na-arịa ọrịa.” (Mak 2:17) Ọrịa nwere ike ịbịa anyị n’akụkụ ahụ́ anyị ọ bụla, ma n’ụbụrụ. Ịgbanwe otú anyị si eme ihe nwekwara ike ịba uru n’ihi na ahụ́ anyị na uche anyị na-arụkọ ọrụ.

Ọ bụrụ na ị na-ada mbà n’obi, gbalịa hụ na i mere ihe ndị i kwesịrị ime ka ahụ́ dị gị mma. Dị ka ihe atụ, na-eri nri nke ọma, na-ehi ụra nke ọma, na-emegakwa ahụ́. Mmega ahụ́ na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ, nwee ume, na-ehikwa ụra nke ọma. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe gị mee, chọpụta ihe ndị na-egosi na obi achọwala ịda gị mbà, kpebiekwa ihe ndị ị ga-eme iji gbochie ya. I nwere ike ịkọrọ onye ị tụkwasịrị obi ihe gị na ya na-alụ. Ndị enyi gị na ndị ikwu gị nwere ike inyere gị aka inwetaghachi onwe gị ma obi chọwa ịda gị mbà. Detuo ihe ndị na-agbata gị n’uche ma obi chọwa ịda gị mbà. Ọ bụ ihe nyeere  Julia anyị kwuru okwu ya ná mmalite aka. Ma, nke kachanụ bụ ịgba mbọ mee ka mmekọrịta gị na Chineke sikwuo ike. Ọ ga-enye aka mee ka ndụ tọwakwa gị ụtọ ọzọ. Jizọs Kraịst kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3.

Na-eri nri nke ọma, na-emega ahụ́, na-ehikwa ụra nke ọma

Ime ihe ndị gbasara ofufe Chineke nwere ike ime ka inweta nkasi obi

Anna na Julia kwuru ihe gosiri na ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu. Anna kwuru, sị: “Ime ihe ndị gbasara ofufe Chineke na-eme ka m na-eche banyere ndị ọzọ, ọ bụghị ịna-eche naanị banyere nsogbu m. Ọ naghị adịcha mfe mgbe niile, ma, ọ na-eme m obi ụtọ n’ikpeazụ.” Ikpe ekpere na ịgụ Baịbụl na-eme ka Julia nweta nkasi obi. Ọ sịrị: “Ịkọrọ Chineke obi m na-eme ka obi ruo m ala. Baịbụl na-enyekwara m aka ịma na m bara uru n’anya Chineke, nakwa na ihe banyere m na-emetụ ya n’obi. Ịgụ Baịbụl na-emekwa ka m nwee olileanya.”

Ebe ọ bụ Jehova Chineke kere anyị, ọ maara anyị nke ọma. Ọ maara otú e si zụọ anyị, ihe ndị merela anyị, nakwa otú ebumpụta ụwa anyị si na-akpa anyị aka ọjọọ. N’ihi ya, ọ ga-enyeliri anyị aka, kasiekwa anyị obi. O nwere ike iji mmadụ ibe anyị hụrụ anyị n’anya meere anyị ihe ndị a. Ma, oge na-abịa mgbe Chineke ga-agwọ anyị ọrịa niile na-enye anyị nsogbu, ma ịda mbà n’obi. Aịzaya 33:24 sịrị na “ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”

Baịbụl kwere anyị nkwa na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya [anyị], ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) N’eziokwu, okwu ndị ahụ na-akasi anyị obi. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu gbasara ihe Chineke bu n’obi kee ụwa a, keekwa ụmụ mmadụ, biko gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig. Ị ga-enwe ike ịnọ ebe ahụ gụọ Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ kwuru gbasara ihe dị iche iche, ma ịda mbà n’obi.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 10 E nwere ọtụtụ ọrịa, mkpụrụ ọgwụ, na ọgwụ ọjọọ ndị nwere ike ịkpaghasị mmadụ uche. Ọ bụ ya mere mmadụ kwesịrị iji ṅụọ naanị ọgwụ dọkịta gwara ya ṅụọ.

^ para. 14 Teta! anaghị ekwu ọgwụ ka mma a ga-eji gwọọ mmadụ ma ọ bụ otú ka mma a ga-esi gwọọ mmadụ.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?

E nwere ihe atọ Chineke na-enye ndị dara mbà n’obi ga-enyere ha aka maka nsogbu ha.