Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 1 n'Afọ 2017 | Gịnị Mere Ndị Na-eto Eto Ji Ada Mbà? Gịnị Ga-enyere Ha Aka?

Ihe ndị na-eme eme gosiri na ọnụ ọgụgụ ndị na-eto eto na-ada mbà n’obi na-akarịzi akarị.

Olee ihe e nwere ike ime maka nsogbu a?

“Teta!” a kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere ndị na-eto eto na-ada mbà n’obi aka, kwuokwa ihe ndị nne na nna ha ga-eme iji kasie ha obi ma nyere ha aka.

 

ISIOKWU TETA! A

Gịnị Mere Ndị Na-eto Eto Ji Ada Mbà? Gịnị Ga-enyere Ha Aka?

Gụọ ihe a ka ị mata ihe ndị e ji ama na ọ na-achọ ime mmadụ, nakwa ihe ndị nwere ike ịna-akpata ya. Ị ga-ahụkwa ihe ndị nne na nna na ndị ọzọ nwere ike ime iji nye aka.

Ịmụmụ Ọnụ Ọchị Bụ Onyinye I Kwesịrị Ịna-enyetụ Ndị Ọzọ

Ịmụmụ ọnụ ọchị enyi gị ma ọ bụ onye ị na-amaghị mụmụụrụ gị na-eme obi ụtọ, na-emekwa ka gịnwa mụmụwakwa ọnụ ọchị.

THE BIBLE'S VIEWPOINT

Ite Ime

Kwa afọ, afọ ime ndị mmadụ na-akpachara anya ete na-akarị nde iri ise. Ite ime ọ̀ bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya, ka ọ̀ gbasara iwu Chineke?

“Ụdị Ịhụnanya Ha Nwere n’Ebe Anyị Nọ Metụrụ Anyị n’Ahụ́”

Na Satọdee, abalị 25 n’ọnwa Eprel, afọ 2015, ajọ ala ọma jijiji kpara ike dị egwu na Nepal. Ihe Ndịàmà Jehova mere mgbe ala ọma jijiji ahụ mechara gosiri na ezigbo ndị Kraịst nwere ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ.

HELP FOR THE FAMILY

Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-ekele Ibe Ha Maka Ihe Ọma Ha Mere

Ọ bụrụ na di na nwunye ana-agbalị na-ahụ ihe ọma onye nke ọzọ na-eme ma na-ekele ya maka ya, ọ ga-eme ka alụmdi na nwunye ha na-esikwu ike. Gịnị ga-enyere ha aka ịna-ekele ibe ha maka ihe ọma ha mere?

WAS IT DESIGNED?

Ihe Nwa Ahụhụ A Na-akpọ Silver Ant Na-eji Egbochi Okpomọkụ

Nwa ahụhụ a so n’ihe ndị e kere eke kacha anagide okpomọkụ. Olee ihe na-enyere ya aka ịnagide oké okpomọkụ?

Ihe Ndị Ọzọ Anyị Nwere

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?

E nwere ihe isii ga-enyere gị aka ka nchegbu baara gị uru kama ịghọrọ gị nsogbu.

Ndịàmà Jehova Hà Na-agbatara Ndị Mmadụ Ọsọ Enyemaka Ma E Nwee Ọdachi?

Gụọ ihe a ka ị hụ otú anyị si enyere Ndịàmà Jehova ibe anyị na ndị ọzọ aka ma e nwee ọdachi.