“M na-echere unu . . . echiche udo, ọ bụghị nke ọdachi, ime ka unu nwee ọdịnihu na olileanya.”​—⁠Jeremaya 29:11.

 “OLILEANYA . . . BỤ OTU IHE DỊ MKPA GA-EME KA ANYỊ NA CHINEKE DỊRỊ NÁ MMA.” Ihe a ka otu akwụkwọ aha ya bụ Hope in the Age of Anxiety kwuru. Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ọ bụ ya na-akacha enyere mmadụ aka ma ọ bụrụ na onye ahụ na-eche na o nweghị onye ga-enyere ya aka, owu ana-ama ya, ụjọ ana-atụkwa ya.”

Baịbụl mere ka o doo anya na anyị niile kwesịrị inwe olileanya. Ma, ọ gwakwara anyị ka anyị ghara ịtụkwasị ihe na-enweghị isi obi. Abụ Ọma 146:3 kwuru, sị: “Unu atụkwasịla ndị a ma ama obi, unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye ọ na-adịghị nzọpụta dị n’aka ya.” Kama ịtụkwasị obi na mbọ ndị mmadụ na-agba ga-eme ka anyị nweta nzọpụta, ọ ga-akacha abara anyị uru ịtụkwasị Onye kere anyị obi, bụ́ onye nwere ike imezu nkwa ya niile. Olee nkwa ndị o kwere anyị? Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

IHE ỌJỌỌ NIILE GA-AKWỤSỊ; NDỊ EZI OMUME ENWEZIE UDO NA-AGAGHỊ AGWỤ AGWỤ: Abụ Ọma 37:​10, 11 kwuru, sị: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” Abụ Ọma 37:29 kwukwara, sị: ‘Ndị ezi omume . . . ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.’

AGHA GA-AKWỤSỊ: “Jehova na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.”​—⁠Abụ Ọma 46:​8, 9.

ỌRỊA, AHỤHỤ NA ỌNWỤ AGAGHỊZI ADỊ: “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ . . . Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”​—⁠Mkpughe 21:​3, 4.

NRI GA-EJU EJU BARA ABARA MAKA MMADỤ NIILE: “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”​—⁠Abụ Ọma 72:⁠16.

A GA-ENWE OTU EZIGBO ỌCHỊCHỊ GA NA-ACHỊ ỤWA NIILE, YA BỤ, ỌCHỊCHỊ KRAỊST: “E wee nye [Jizọs Kraịst] ọchịchị na ùgwù na alaeze, ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.”​—⁠Daniel 7:⁠14.

Olee ihe ga-eme ka obi sie anyị ike na nkwa ndị a ga-emezu? Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mere ihe ndị gosiri na ọ bụ ya bụ Onye A Họpụtara Ịbụ Eze. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, nye ndị ogbenye nri, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. Ihe kacha mkpa n’ihe niile o mere bụ ihe ndị ọ kụziri, n’ihi na ha ga-enyere ndị mmadụ aka ibi n’udo ma dịrịkwa n’otu ruo mgbe ebighị ebi. Jizọs kwukwara ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, dị ka, ihe ndị ga-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ nke ụwa anyị a.

IHE NDỊ NA-EGOSI NA ỌGWỤGWỤ DỊ NSO

Jizọs kwuru na ihe ndị a ga-eji amata oge ikpeazụ abụghị udo na obi iru ala, kama, ọgba aghara. O kwuru na ihe ndị ga-abụ ihe ịrịba ama “nke ọgwụgwụ usoro ihe a” bụ mba ibuso mba ọzọ agha, ụkọ nri, ọrịa na-efe efe, na oké ala ọma jijiji. Ihe ndị a niile ga na-emekọta ọnụ n’oge ahụ. (Matiu 24:​3, 7; Luk 21:​10, 11; Mkpughe 6:​3-8) Jizọs kwukwara, sị: “N’ihi ịba ụba nke mmebi iwu, ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.”​—⁠Matiu 24:⁠12.

Na 2 Timoti 3:​1-5, e gosiri na e nwere ọtụtụ ụzọ ịhụnanya ihe ka n’ọgụgụ ndị mmadụ ga-esi ajụ oyi. Ebe ahụ kwuru na “n’oge ikpeazụ,” ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, na ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya. Ha ga-adị mpako ma na-emekwa ihe ike. Ọtụtụ ndị nọ n’ezinụlọ dị iche iche ga-abụ ndị na-enweghị obi mmadụ, ụmụaka ga na-enupụrụkwa ndị mụrụ ha isi. Okpukpe dị iche iche ga na-ekwu ihe ọzọ ma na-eme ihe ọzọ.

Ihe ndị a niile na-eme ka anyị mata na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso. Ha na-emekwa ka anyị mata na oge Alaeze Chineke ga-eme ka ihe dị mma eruola nso. Iji mee ka obi sie anyị ike, Jizọs kwuru ihe ndị na-esonụ n’amụma o buru gbasara oge ikpeazụ. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”​—⁠Matiu 24:⁠14.

Ozi ọma ahụ na-eme ka ndị ezi omume nwee olileanya. Ma, ọ na-adọ ndị ajọ omume aka ná ntị. Ọ na-eme ka ndị ezi omume nwee obi ike na nkwa ndị ahụ Chineke kwere ga-emezu n’oge na-adịghị anya. Ị̀ ga-achọ ịmatakwu gbasara ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị? Ọ bụrụ otú ahụ, biko, gụọ ihe e dere na peeji nke ikpeazụ n’akwụkwọ a.