Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 2 n'Afọ 2017

 ISIOKWU TETA! A | GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU BANYERE IME MGBAASỊ?

Ihe Gbasara Ime Mgbaasị Na-amasịkarị Ndị Mmadụ

Ihe Gbasara Ime Mgbaasị Na-amasịkarị Ndị Mmadụ

“Fim ndị amusu na ndị nwụrụ anwụ, nyenụ ohere. Ọ bụzi fim ndị mmụọ ọjọọ ji na ndị na-achụpụ ha na-ewuzi.”—The Wall Street Journal.

ỌTỤTỤ akwụkwọ, fim na egwuregwu kọmputa ndị e nwere taa na-ejupụtazi n’ihe gbasara ndị amusu na ihe ndị ọzọ gbasara ndị mmụọ ọjọọ. Gịnị mere ihe ndị a ji na-amasịkarị ndị mmadụ?

Otu ọkachamara n’ihe gbasara mmekọrịta mmadụ na ibe ya aha ya bụ Claude Fischer, sịrị: “Ndị kweere ná mmụọ ndị nwụrụ anwụ na-akarịzi akarị n’oge ndị a n’Amerịka. Mgbe mbụ, ọ bụ ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ iri kweere na ya. Ma ugbu a, ọ bụzi ihe dị ka mmadụ atọ n’ime mmadụ iri. N’Amerịka, ndị na-eto eto garala na nke ndị na-eme anwansi, ndị kweere ná mmụọ ndị nwụrụ anwụ, ma ọ bụ ndị kweere na e nwere ụlọ ndị nwụrụ anwụ bi, ji okpukpu abụọ karịa ndị dimkpa kweere n’ihe ndị ahụ.”

Ọ bụghị ihe ịtụnanya na akụkọ gbasara ndị mmụọ ọjọọ ijide ndị mmadụ jizi nwayọọ nwayọọ na-eju ebe niile ugbu a. Michael Calia kwuru n’otu akwụkwọ a na-akpọ The Wall Street Journal, sị: “Ndị mmụọ ọjọọ ji na-akarịzi akarị. Otu ihe kpatara ya bụ na ime mgbaasị na ịta amusu jupụtaziri na fim nakwa na tiivi kemgbe afọ iri gara aga.”

Otu nchọpụta e mere gosiri na “e kee ndị nọ n’ụwa ụzọ iri, ihe dị ka ụzọ abụọ ruo ụzọ ise kweere ná mmụọ ndị nwụrụ anwụ. O jukwara n’akwụkwọ ọdịbendị nke ọtụtụ obodo.” Nchọpụta prọfesọ Christopher Bader na prọfesọ Carson Mencken mere n’Amerịka “mere ka a mata na mmadụ asaa ma ọ bụ mmadụ asatọ n’ime mmadụ iri ọ bụla nọ n’Amerịka kwetasiri ike n’otu ụdị mgbaasị ma ọ bụ ọzọ.”

Ma, mmadụ iji ihe ndị gbasara mgbaasị na-eme onwe ya obi ụtọ ọ̀ bụ ihe na-enweghị ihe o mere?