Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 2 n'Afọ 2017

Ọ bụ eziokwu na ụlọ ọrụ ndị na-emepụta fim mgbaasị na-eme ka isiokwu fim ndị ahụ na foto ndị e sere n’ihu ha na-adọrọ mmasị, ma, anyị ekwesịghị ichefu nsogbu ihe ndị a nwere ịkpatara anyị

 ISIOKWU TETA! A | GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU BANYERE IME MGBAASỊ?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ime Mgbaasị?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ime Mgbaasị?

ỌTỤTỤ ndị na-ewere ya na ihe ọ bụla gbasara ndị mmụọ ọjọọ na ime mgbaasị abụghị eziokwu, na ha bụ naanị ihe ndị a na-egosi na fim. Ma, ihe Baịbụl kwuru dị iche. Ọ dọrọ anyị aka ná ntị gbasara ime mgbaasị. Dị ka ihe atụ, Diuterọnọmi 18:10-13 sịrị: “A gaghị ahụ n’etiti unu . . . onye ọ bụla nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.” Gịnị mere e ji kwuo ihe a? Akwụkwọ Nsọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova . . . Ị gaghị enwe ntụpọ n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ.”

Gịnị mere Baịbụl ji katọọ ụdị ime mgbaasị niile?

MMALITE ỌJỌỌ

Baịbụl mere ka anyị mata na tupu Chineke ekee ụwa, o kere ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi. (Job 38:4, 7; Mkpughe 5:11) O nyekwara mmụọ ozi nke ọ bụla ikike ịhọrọ ime ihe ọma ma ọ bu ihe ọjọọ. Ụfọdụ n’ime ndị mmụọ ozi a họọrọ inupụrụ Chineke isi, si n’eluigwe gbadata n’ụwa, bịa na-akpata ọgba aghara. Ihe a mere ka ụwa “jupụta n’ime ihe ike.”—Jenesis 6:2-5, 11; Jud 6.

Baịbụl gwara anyị na ndị mmụọ ọjọọ a nwere ikike dị egwu. Ha ejirikwala ikike a duhie ọtụtụ nde mmadụ. (Mkpughe 12:9) Ha na-ejikwa mmasị ndị mmadụ nwere n’ịmata  ọdịnihu eduhie ọtụtụ ndị.—1 Samuel 28:5, 7; 1 Timoti 4:1.

N’eziokwu, e nwere mgbe ụfọdụ ndị mmụọ ọjọọ na-emere ndị mmadụ ihe ọma. (2 Ndị Kọrịnt 11:14) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmụọ ọjọọ na-agbalị imegharị ndị mmadụ anya ka ha ghara ịmata eziokwu banyere Chineke.—2 Ndị Kọrịnt 4:4.

Baịbụl kwuru na mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ imekọrịta ihe abụghị ihe egwuregwu. Mgbe e mere ka ndị na-eme anwansi chọrọ ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ghọta na mmadụ na ndị mmụọ ọjọọ imekọrịta ihe adịghị mma, ha “chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ” n’agbanyeghị na ha ji nnukwu ego zụọ ha.—Ọrụ Ndịozi 19:19.

“Ihe o nwere ike ịbụ ya kpatara ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị na-eto eto ji na-enwezi mmasị na mgbaasị ga-abụ otú e sizi na-eme ka ndị amusu maa mma na tiivi, fim, nakwa n’akwụkwọ.”—Gallup Youth Survey, 2014

Taakwa, ọtụtụ ndị ekpebiela iwepụ aka ná ntụrụndụ ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ nwere ihe jikọrọ ya na mgbaasị. Dị ka ihe atụ, mgbe Maria * dị afọ iri na abụọ, ọ na-enwe ike ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu, ma ọ bụ ikwu nsogbu na-abịanụ. Ọ na-agụrụ ụmụ klas ya kaadị tarọt. Ebe ọ bụ na ihe ọ bụla ọ gwara ha na-eme, o mere ka ọ bamikwuo n’ime mgbaasị.

Maria chere na ọ bụ Chineke nyere ya ikike ime ihe ndị a iji nyere ndị mmadụ aka. Ọ sịrị: “Ma, o nwere ihe nọ na-enye m nsogbu n’obi. Ọ bụ ndị ọzọ ka m na-eji kaadị ndị ahụ akọrọ ọdịnihu ha. Anaghị m enwe ike iji ha akọ ọdịnihu nke m, ma ọ na-agụsi m agụụ ike ịmata ọdịnihu m.”

Maria kpere ekpere maka ọtụtụ ihe na-agba ya gharịị. Ndịàmà Jehova mechara  bido mụwara ya Baịbụl. Maria mụtara na ikike o ji na-akọ ọdịnihu esighị n’ebe Chineke nọ. Ọ mụtakwara na ndị niile chọrọ ka ha na Chineke dịrị ná mma ga-ebibi ihe ọ bụla e ji eme mgbaasị ha nwere. (1 Ndị Kọrịnt 10:21) Gịnị mechara mee? Maria tụfuru akwụkwọ na ihe ndị ọzọ niile o ji eme mgbaasị. Ugbu a, ọ na-akọziri ndị ọzọ eziokwu ndị ọ mụtara na Baịbụl.

Mgbe Michael ka bụ onye na-eto eto, o nwere ezigbo mmasị n’ịgụ akwụkwọ ndị a kọrọ gbasara ndị ji ike ndị mmụọ ọjọọ na-akpa ike. Ọ sịrị: “Ọ na-amasị m ịdị ka ndị ọgbọ m m gụrụ gbasara ha n’akwụkwọ ndị ahụ.” Ntakịrị ntakịrị, Michael bidoro ịna-agụ akwụkwọ mgbaasị na akwụkwọ ndị òtù ọjọọ. Michael kwuru, sị: “M bidoro inwe mmasị n’akwụkwọ na fim mgbaasị n’ihi na m chọrọ ịmata ihe dị na ha.”

Mgbe Michael bidoro mụwa Baịbụl, ọ matara na ya kwesịrị ichebara ụdị akwụkwọ ndị ọ na-agụ echiche. Ọ sịrị: “Eji m akwụkwọ depụta ihe niile gbasara mgbaasị m nwere ma bibie ha. M mụtakwara ihe ná 1 Ndị Kọrịnt 10:31. Ebe ahụ sịrị: ‘Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.’ M gụwa akwụkwọ ọ bụla ugbu a, ajụjụ m na-ajụzi onwe m bụ, ‘Ihe a m na-agụ n’akwụkwọ a ọ̀ ga-eme ka m bido ime ihe na-agaghị ewetara Chineke otuto?’ Ọ bụrụ otú ahụ, m na-akwụsị ịgụ ya.”

Nkọwa ahụ akọwara Baịbụl ka oriọna dabara adaba n’ihi na ọ na-enye ìhè na-eme ka mmadụ mata na ime mgbaasị enweghị uru ọ bara. (Abụ Ọma 119:105) Ma, o nwekwara ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru. O mere ka anyị mata banyere nkwa magburu onwe ya Chineke kwere banyere ụwa ndị mmụọ ọjọọ na-agaghị anọ na ya. Uru ọ ga-abara ụmụ mmadụ karịrị akarị. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 37:10, 11 kwuru, sị: “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”

^ para. 10 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.