Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Nke 2 n'Afọ 2017

 IHE BAỊBỤL KWURU

Obe

Obe

Ọtụtụ ndị na-ewere obe ka njirimara Ndị Kraịst. Ma, ọ bụghị mmadụ niile kweere na e kwesịrị ịna-anya ya n’olu ma ọ bụ na-ekowe ya n’ụlọ ma ọ bụ na chọọchị.

Jizọs ọ̀ nwụrụ n’elu obe?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU

 

Mgbe ndị Rom gburu Jizọs, ha kpọgidere ya n’obe e ji osisi abụọ rụọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

 

A “kpọgburu [Jizọs] n’elu osisi.” (Ọrụ 5:30, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Okwu abụọ ndị dere Baịbụl ji kọwaa ihe e ji gbuo Jizọs pụtachara otu ogwe osisi, ọ bụghị osisi abụọ. Akwụkwọ a na-akpọ Crucifixion in Antiquity kwuru na okwu Grik bụ́ stau·rosʹ, pụtara “otu ogwe osisi kwụ ọtọ. Ọ bụghị ‘obe.’” Okwu bụ́ xyʹlon e dere n’Ọrụ Ndịozi 5:30 pụtara “naanị osisi kwụ ọtọ ma ọ bụ ogwe osisi ndị Rom ji akpọgbu ndị mmadụ, ma ndị mmadụ na-asị na a kpọgburu ndị ahụ n’obe.” *

Baịbụl kwukwara na otú e si gbuo Jizọs kwekọrọ n’ihe iwu ndị Izrel oge ochie kwuru. Iwu ahụ sịrị: “Ọ bụrụkwa na mmadụ emee mmehie ga-eme ka a ma ya ikpe ọnwụ, e wee gbuo ya, i wee kwụwa ya n’osisi, . . . n’ihi na ihe a bụrụ ọnụ n’ebe Chineke nọ ka onye a kwụwara n’osisi bụ.” (Diuterọnọmi 21:22, 23) Pọl onyeozi dekwara gbasara iwu a. Ọ sị na Jizọs ‘bụ onye a bụrụ ọnụ n’ọnọdụ anyị, n’ihi na e dere, sị: ‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ọ bụla a kwụwara n’osisi [xyʹlon] bụ.’” (Ndị Galeshia 3:13) Ihe Pọl na-ekwu n’ebe a bụ na Jizọs nwụrụ n’elu osisi, ya bụ, n’elu otu ogwe osisi.

“Onye ha gbukwara, na-akwụba Ya n’elu osisi.”Ọrụ Ndịozi 10:39, Bible Nsọ nke Union Version.

 Ò nwere mgbe ụmụazụ Jizọs ji obe fee Chineke ma ọ bụ jiri ya mere njirimara Ndị Kraịst?

IHE BAỊBỤL KWURU

 

O nweghị ebe ọ bụla Baịbụl kwuru ihe gosiri na Ndị Kraịst oge mbụ ji obe fee Chineke. Kama, ọ bụ Ndị Rom nọ n’oge ahụ bụ ndị ji obe na-efe chi ha dị iche iche. Ihe dị ka narị afọ atọ Jizọs nwụchara, eze ukwu Rom bụ́ Kọnstantin ji obe mere njirimara ndị agha ya. Mgbe e mechakwara, ndị chọọchị bidoro iji ya efe ofufe.

Ebe ọ bụ na ndị ọgọ mmụọ ji obe fee chi ha, olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-esi jirikwa obe fee Chineke? Ha agaghị eme ụdị ihe ahụ. Ha maara na kemgbe ụwa, Chineke akwadoghị iji “ọdịdị nke ihe oyiyi ọ bụla” fee ya ofufe, nakwa na Ndị Kraịst kwesịrị ‘ịgbara ikpere arụsị ọsọ.’ (Diuterọnọmi 4:15-19; 1 Ndị Kọrịnt 10:14) “Chineke bụ Mmụọ,” n’ihi ya, mmadụ apụghị ịhụ ya anya. Ndị Kraịst oge mbụ ejighị ụdị ihe oyiyi ọ bụla fee Chineke ka o nyere ha aka ịbịaru Chineke nso. Kama nke ahụ, ha fere Chineke “n’ime mmụọ,” ya bụ, ha kwere ka mmụọ nsọ Chineke a na-anaghị ahụ anya na-edu ha. Ha fekwara ya “n’eziokwu,” ya bụ, ha kwere ka uche Chineke e dere n’Akwụkwọ Nsọ duzie ha.—Jọn 4:24.

“Ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu.”Jọn 4:23.

Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi gosi na ha na-akwanyere Jizọs Kraịst ùgwù?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

 

“O kwesịrị ekwesị, dịkwa mma ka a na-akwanyere ihe e ji zọpụta anyị ùgwù, na-efekwa ya ofufe. . . . Onye na-akwanyere ihe oyiyi ndị ahụ ùgwù, na-akwanyere onye ha na-anọchi anya ya ùgwù.”—New Catholic Encyclopedia.

IHE BAỊBỤL KWURU

 

Ndị Kraịst kwesịrị ịna-akwanyere Jizọs ùgwù, n’ihi na ọnwụ ya mere ka e nwee ike ịna-agbaghara ha mmehie, ka ha nwee ike ịbịaru Chineke nso, na inweta ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16; Ndị Hibru 10:19-22) A gwaghị Ndị Kraịst na otú ha ga-esi na-akwanyere àjà Jizọs ùgwù bụ iji obe na-efe ofufe ma ọ bụkwanụ ịna-ekwu na ha kweere na Jizọs naanị n’ọnụ. Kama, Baịbụl sịrị, “ọ bụrụ na okwukwe enweghị ọrụ, ọ nwụrụ anwụ.” (Jems 2:17) Ndị Kraịst kwesịrị isi n’omume ha gosi na ha kweere na Jizọs. Olee otú ha ga-esi eme ya?

Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya nke Kraịst nwere na-akpali anyị, n’ihi na ihe anyị kwubiri bụ na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile . . . ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ihi ha, e wee kpọlite ya.” (2 Ndị Kọrịnt 5:14, 15) Ịhụnanya a pụrụ iche Kraịst gosiri ụmụ mmadụ na-akpali Ndị Kraịst ịgbanwe ndụ ha ma ṅomiwe ya. Ihe a bụ ụzọ kacha mma ha ga-esi na-akwanyere Jizọs ùgwù, karịa iji ihe oyiyi na-eme ya.

“Nke a bụ uche Nna m, na onye ọ bụla nke na-ahụ Ọkpara ahụ ma nwee okwukwe na ya ga-enwe ndụ ebighị ebi.”Jọn 6:40.

^ para. 8 A Critical Lexicon and Concordance to the English and Greek New Testament, 11th Edition, by Ethelbert W. Bullinger, peeji nke 818-819.