IHE Ọ PỤTARA

Ọ bụrụ na mmadụ bụ onye a ga-atụkwasịli obi, obi ga-esi ndị mụrụ ya, ndị enyi ya na ndị were ya n’ọrụ ike na ọ ga na-eme ihe dị mma. Ụdị onye ahụ na-eme ihe iwu kwuru, na-emezu nkwa ya, na-ekwukwa eziokwu mgbe niile.

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọtụtụ mgbe, ihe ga-eme ka ndị mụrụ gị na-enye gị ohere ime ihe ị chọrọ bụ ma ọ bụrụ na i gosila ha n’oge gara aga na ha ga-atụkwasịli gị obi.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sarahi kwuru, sị: “Otú kacha mma ị ga-esi eme ka ndị mụrụ gị na-atụkwasị gị obi bụ ịna-akpa àgwà ka onye ṅụjuru mmiri ara afọ, ma mgbe gị na ha nọ ma mgbe gị na ha na-anọghị.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-emenụ omume dị mma.”—1 Pita 2:12.

IHE I NWERE IKE IME

Ọ bụrụ na ị na-achọ ka ana-atụkwasịkwu gị obi ma ọ bụ ka a maliteghachi ịtụkwasị gị obi, ihe ndị a na-esonụ ga-enyere gị aka.

Na-ekwu eziokwu: Ozugbo i bidoro ịgha ụgha, ndị mmadụ ga-akwụsị ịna-atụkwasị gị obi. Ma, ọ bụrụ na ị na-ekwu eziokwu, karịchaa ma i mejọọ ihe, ndị ọzọ ga na-atụkwasị gị obi.

Otú nwa okorobịa aha ya bụ Caiman kwuru, sị: “Ọ na-adị mfe mmadụ ikwu eziokwu mgbe ọ na-agaghị eme ka e lewa ya anya ọjọọ. Ma ọ bụrụ na ị na-ekwu eziokwu, ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka e lewa gị anya ọjọọ, ndị mmadụ ga na-atụkwasịkwu gị obi.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”—Ndị Hibru 13:18.

Na-eme ihe ga-eme ka a tụkwasị gị obi: Otu nchọpụta e mere n’Amerịka gosiri na otu n’ime ihe atọ kacha mkpa ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-achọ bụ onye ha ga-atụkwasịli obi. Ime ihe ndị ga-eme ka a na-atụkwasị gị obi ugbu a ga-enyere gị aka mgbe i toro.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sarah kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na-ama mgbe ọ bụla m rụrụ ọrụ ha kenyere m n’ụlọ n’echeghị ka ha chetara m ya echetara. Ka m na-emekwu otú ahụ, ha na-atụkwasịkwu m obi.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “M nwere ntụkwasị obi na ị ga-ekwere, . . . ebe m maara na ị ga-eme ọbụna karịa ihe m na-ekwu.”—Faịlimọn 21.

Na-enwe ndidi. Ọ na-adị mfe ịchọpụta na mmadụ na-eto ogologo, ma ọ na-ewe oge ịchọpụta ma mmadụ ò tozuola okè. Ọ bụ ya mere ndị na-eto eto ji kwesị ịna-enwere ndị mụrụ ha na ndị ọzọ ndidi.

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Brandon kwuru, sị: “Ọ bụghị i mee otu ihe dị mma, gị atụwa anya ka ndị mụrụ gị na ndị ọzọ jiri maka ya tụkwasịwa gị obi. Kama, ị nọgide na-eme ihe dị mma, ka oge na-aga, ha ga-atụkwasịwa gị obi.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Yirinụ . . . ogologo ntachi obi, dị ka uwe.”—Ndị Kọlọsi 3:12.