Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2017

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere ihe Matiu kọrọ banyere ihe ndị merenụ mgbe Jizọs na-etolite ji dị iche n’ihe Luk kọrọ?

Ihe Matiu kọrọ banyere ihe ndị merenụ mgbe a mụrụ Jizọs na ihe ndị mere mgbe ọ na-etolite dịtụ iche n’ihe Luk kọrọ n’ihi na ebe ha lekwasịrị anya dị iche iche.

Matiu lekwasịrị anya n’ihe gbasara Josef. Ọ kọrọ ihe Josef mere mgbe ọ matara na Meri dị ime, otú mmụọ ozi si kọwaara ya ná nrọ ihe mere Meri ji dị ime, na otú o si mee ihe mmụọ ozi ahụ gwara ya. (Mat. 1:​19-25) Matiu kwukwara gbasara otú mmụọ ozi si gwa Josef ná nrọ ka ọ gbalaga Ijipt, otú ya na ezinụlọ ya si gbapụ, otú mmụọ ozi si gwa ya ná nrọ ka ọ laghachi Izrel, ya alaghachi, na otú o si kpebie ịkpọrọ ndị ezinụlọ ya gaa biri na Nazaret. (Mat. 2:​13, 14, 19-23) N’isi nke mbụ na nke abụọ n’Oziọma Matiu, a kpọrọ Josef aha ugboro asaa, kpọọ Meri aha ugboro anọ.

Ma Luk lekwasịrị anya n’ihe gbasara Meri. Ọ kọrọ otú mmụọ ozi Gebriel si bịa na nke Meri, otú Meri si gaa leta Elizabet, na ihe ndị o kwuru iji too Jehova. (Luk 1:​26-56) Luk kwukwara ihe Simiọn gwara Meri gbasara ahụhụ Jizọs ga-ata n’ọdịnihu. N’akụkọ Luk kọrọ gbasara otú Meri na ndị ezinụlọ ya si gaa n’ụlọ nsọ mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, o kwuru ihe Meri kwuru, ọ bụghị ihe Josef kwuru. Luk kwukwara na Meri nọ na-eche ihe ihe ndị ahụ niile merenụ pụtara. (Luk 2:​19, 34, 35, 48, 51) N’isi nke mbụ na nke abụọ n’Oziọma Luk, a kpọrọ Meri aha ugboro iri na abụọ, kpọọ Josef aha naanị ugboro atọ. N’ihi ya, Matiu kọwakwuru ihe nọ na-echegbu Josef na ihe o mere. Luk akọwakwuo ihe nọ na-echegbu Meri na ihe ndị mere ya.

Ihe ọzọ bụ na otú e si dee agbụrụ Jizọs n’Oziọma Matiu dị iche n’otú e si dee ya n’Oziọma Luk. Matiu kwuru ebe ezinụlọ Josef si, kwuokwa ihe gosiri na Jizọs ga-enweta ihe ruuru ya, ya bụ, ọchịchị Devid ebe ọ bụ na Josef weere ya ka nwa ya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Josef si n’ezinụlọ Eze Devid, bụ́ onye mụtara Sọlọmọn. (Mat. 1:​6, 16) Ma, Luk kwuru ebe ezinụlọ Meri si, kwuokwa ihe gosiri na Jizọs bụ onye ketara ọchịchị Devid “dị ka anụ ahụ́ si dị.” (Rom 1:⁠3) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Meri si n’ezinụlọ Eze Devid, bụ́ onye mụtara Netan. (Luk 3:31) Ma, gịnị mere Luk agụnyeghị Meri n’ụmụ Hilaị, bụ́ nna Meri mgbe ọ na-ede usoro ọmụmụ? Ọ bụ n’ihi na ndị a na-edepụta aha ha n’usoro ọmụmụ bụ naanị ụmụ nwoke ndị nọ n’ezinụlọ ahụ. N’ihi ya, mgbe Luk kpọrọ aha Josef ma kọwaa na Josef bụ nwa Hilaị, ihe ndị mmadụ ghọtara bụ na Josef bụ ọgọ Hilaị.​—⁠Luk 3:⁠23.

Usoro ọmụmụ Matiu na Luk dere mere ka o doo anya na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. N’eziokwu, a ma usoro ọmụmụ Jizọs ama nke na ndị Farisii na ndị Sadusii kwetara na ọ bụ eziokwu. Taa, ma usoro ọmụmụ Jizọs nke Matiu dere ma nke Luk dere so n’ihe ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, meekwa ka obi sie anyị ike na nkwa ndị na-emezubeghị Chineke kwere ga-emezurịrị.