Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Ọgọst 2017

 AKỤKỌ NDỤ

Ịtachi Obi n’Ọnwụnwa Mere Ka Jehova Gọzie M

Ịtachi Obi n’Ọnwụnwa Mere Ka Jehova Gọzie M

ONYE uwe ojii ndị Sọviet Yuniọn baara m mba, sị: “Ị bụ nna obi tara mmiri. Ị hapụrụ nwunye gị dị ime na obere nwa gị nwaanyị. Ònye ga na-akpa afọ ha ma na-elekọta ha? Kwuo na ị bụghịzi Onyeàmà Jehova ka ị laa.” M sịrị ya, “Mba, ahapụghị m ndị ezinụlọ m. Ọ bụ gị nwụchiri m. Gịnị mere i ji nwụchie m?” Onye uwe ojii ahụ ji iwe sị m: “O nweghị ihe ọjọọ karịrị ịbụ Onyeàmà Jehova.”

Ihe a mere n’afọ 1959, n’ụlọ mkpọrọ dị n’obodo Ekusk, dị na Rọshịa. Ka m kọọ ihe mere mụ na nwunye m, bụ́ Maria, ji jikere “ịta ahụhụ n’ihi ezi omume” na otú Jehova si gọzie anyị maka na anyị rubeere ya isi.​—⁠1 Pita 3:​13, 14.

A mụrụ m na Yukren n’afọ 1933, n’obodo Zọlọtniki. N’afọ 1937, nwanne mama m na di ya, bụ́ Ndịàmà Jehova, si Frans bịa ileta anyị. Ha nyere anyị akwụkwọ abụọ. A kpọrọ otu Government, kpọọ nke ọzọ Deliverance. Ọ bụ Watch Tower Society bipụtara ha. Mgbe papa m gụrụ akwụkwọ ndị a, o bidoghachiri inwe okwukwe na Chineke. Ọ dị mwute na ezigbo ọrịa bịara ya n’afọ 1939. Ma, tupu ya anwụọ, ọ gwara mama m, sị: “Ihe a bụ eziokwu Baịbụl. Kụziere ya ụmụ anyị.”

SAỊBERỊA BỤ EBE ỌHỤRỤ A GA-EKWUSA OZI ỌMA

N’ọnwa anọ n’afọ 1951, ndị ọchịchị chụpụrụ Ndịàmà Jehova na Sọviet Yuniọn, chụga ha Saịberịa. A chụpụrụ m na Yukren, chụpụkwa mama m na nwanne m nwoke nke m tọrọ, bụ́ Grigory. Anyị gbara ụgbọ okporo ígwè ihe karịrị puku kilomita isii, rute n’obodo Tulun dị na Saịberịa. Mgbe izu abụọ gara, nwanne m nwoke nke tọrọ m, bụ́ Bogdan, rutere n’otu ogige dị n’obodo Angask, nke dị nso n’ebe anyị nọ. A tụrụ ya mkpọrọ afọ iri abụọ na ise n’ebe a ga na-ata ya ahụhụ.

Mụ na mama m na Grigory ziri ozi ọma n’obere obodo ndị dị nso na Tulun. Ma, anyị chepụtara otú anyị ga-esi na-ezi ya. Dị ka ihe atụ, anyị na-ajụ ndị mmadụ, sị, “Ò nwere onye nọ ebe a chọrọ ire ehi ya?” Anyị hụ onye chọrọ ire ehi ya, anyị agwa ya na otú e si kee ehi dị ịtụnanya. Tupu onye ahụ amara ihe na-eme, anyị agwawala ya gbasara Onye kere ihe niile. N’oge ahụ, otu akwụkwọ akụkọ dere na Ndịàmà Jehova na-ajụ gbasara ehi, ma ihe ha na-achọ bụ atụrụ. Anyị chọtakwaranụ ndị yiri atụrụ. E nweghị ọgbakọ e kenyere ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Ndị bi na ya dị umeala n’obi,  na-anabatakwa ndị ọbịa. Ịmụrụ ha Baịbụl tọgburu anyị atọgbu. Ọgbakọ dị na Tulun ugbu a nwere ihe karịrị otu narị ndị nkwusa.

OTÚ ỌNWỤNWA SI BỊARA MARIA

Nwunye m bụ́ Maria mụtara eziokwu Baịbụl na Yukren mgbe a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ. Mgbe ọ dị afọ iri na asatọ, onye uwe ojii ndị Sọviet Yuniọn malitere inye ya nsogbu, na-agwa ya ka ha nwee mmekọahụ. Ma, ọ jụwapụrụ isi. Ọ lọtara otu ụbọchị, lee anya n’àkwà ya, hụ ka onye uwe ojii ahụ dina na ya. Nwunye m gbara ọsọ. Ezigbo iwe were nwoke ahụ, ya asị na ya ga-atụ nwunye m mkpọrọ maka na ọ bụ Onyeàmà Jehova. E mechara tụọ ya mkpọrọ afọ iri n’afọ 1952. Obi dị ya otú ahụ ọ dị Josef, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ n’ihi na o kweghị emebi iwu Jehova. (Jen. 39:​12, 20) Ọkwọ ụgbọala nke si n’ụlọikpe buga nwunye m n’ụlọ mkpọrọ sịrị ya, “Atụla ụjọ. Ọtụtụ ndị na-aga mkpọrọ, ma a na-akwanyere ha ùgwù ma ha lọta.” Ihe a o kwuru mere ka obi sie nwunye m ike.

Malite n’afọ 1952 ruo n’afọ 1956, a manyere nwunye m ịrụ ọrụ n’ụlọ mkpọrọ dị nso n’obodo Goki (nke a na-akpọzi Nizni Novgọrọd) dị na Rọshịa. E nyere ya iwu ka ọ na-abụ osisi, ma mgbe ezigbo oyi na-atụ. Ọ kpataara ya ọrịa. Ma, a tọhapụrụ ya n’afọ 1956, ya alaghachi Tulun.

ANỌGHỊ M NWUNYE M NA ỤMỤ M NSO

Mgbe otu nwanna nọ na Tulun gwara m na e nwere nwanna nwaanyị na-abịanụ, m gbaara ígwè gaa n’ebe bọs na-akwụsị ka m nyere ya aka bute ibu ya. Mgbe m hụrụ ya, ihe ya masịrị m ozugbo. Ọ dịghịrị m mfe ime ka ọ hụ m n’anya, ma m mechara nweta ya. Anyị lụrụ n’afọ 1957. Mgbe otu afọ gachara, anyị mụrụ ada anyị bụ́ Irina. Ma, obi ụtọ anyị nwere mgbe ahụ adịteghị aka. N’afọ 1959, a tụrụ m mkpọrọ n’ihi ibipụta akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. M nọrọ ọnwa isii naanị m n’ụlọ mkpọrọ. Ihe m na-eme ka obi ruo m ala n’oge ahụ bụ ikpe ekpere mgbe niile, ịbụ abụ Alaeze, na iche echiche otú m ga-esi ezi ozi ọma ma a tọhapụ m ọzọ.

Mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ n’afọ 1962

Mgbe otu nwoke na-eme nchọpụta nọ na-agba m ajụjụ ọnụ n’ụlọ mkpọrọ, o ji olu ike, sị: “N’oge na-adịghị anya, anyị ga-ekpochapụ unu niile n’obodo a.” M zara ya, sị: “Jizọs sịrị na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze n’ụwa niile. O nweghị onye ga-akwụsị ya.” Nwoke ahụ gbanwere aghụghọ ya, gbalịwazie ime ka m kwuo na abụghịzi m Onyeàmà Jehova, otú ahụ m kọrọ ná mbido. Ebe iyi m egwu ma ọ bụ ịchọ ịrata m na-emeghị ka m kwuo na abụghịzi m Onyeàmà Jehova, a tụrụ m mkpọrọ afọ asaa n’ebe a ga na-ata m ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ dị nso n’obodo Saransk. Mgbe m na-aga n’ụlọ mkpọrọ ahụ, a gwara m na nwunye m amụọla nwa anyị nwaanyị nke abụọ, bụ́ Olga. N’agbanyeghị na nwunye m na ụmụ anyị nwaanyị anọghị m nso, ihe kasiri m obi bụ na mụ na nwunye m na-erubere Jehova isi.

Maria na ụmụ anyị nwaanyị, bụ́ Olga na Irina, n’afọ 1965

Otu ugboro n’afọ, nwunye m na-esi Tulun bịa leta m na Saransk n’agbanyeghị na ọ na-agba ụgbọ okporo ígwè ụbọchị iri na abụọ uje na ụla. Kwa afọ, ọ na-ewetara m akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ. Ọ na-ezo Ụlọ Nche ndị e bipụtara ọhụrụ n’akpụkpọ ụkwụ ahụ. O nwere otu afọ nwunye m letara m nleta pụrụ iche. Ihe mere o ji pụọ iche bụ na ọ kpọ ụmụ anyị abụọ bịa. Chegodị ụdị obi ụtọ m nwere mgbe m hụrụ ha, mụ na ha anọrịa.

 EBE ỌHỤRỤ NDỊ ANYỊ GARA NA NSOGBU ỌHỤRỤ NDỊ BỊAARA ANYỊ

N’afọ 1966, a tọhapụrụ m n’ụlọ mkpọrọ, mụ na nwunye m na ụmụ anyị abụọ akwaga obodo Amavie, dị nso n’Oké Osimiri Ojii. N’ebe ahụ ka a mụrụ ụmụ anyị ndị nwoke bụ́ Yaroslav na Pavel.

Ọ dịghị anya, ndị uwe ojii ndị Sọviet Yuniọn bịara na-akwakasị ụlọ anyị, na-achọ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ha chọrọ ebe niile, ma ná nri ehi. Otu ụbọchị ndị uwe ojii ahụ nọ na-achọ ma hà ga-ahụ akwụkwọ, ọsụsọ nọ na-agba ha, uwe ha abụrụ sọ uzuzu. Nwunye m meteere ha ebere, ebe ọ bụ na ha na-eme ihe a gwara ha. O nyere ha juus, gbanyere ha mmiri n’efere, nyekwa ha ákwà nhicha ahụ́ na brọsh ha ga-eji hichaa uwe ha. Mgbe onyeisi ha rutere, ha gwara ya ihe ọma e meere ha. Mgbe ha pụrụ, onyeisi ahụ mụmụrụ ọnụ ọchị ma feere anyị aka. Obi dị anyị ụtọ ịhụ uru ‘iji ihe ọma emeri ihe ọjọọ’ na-aba.​—⁠Rom 12:⁠21.

N’agbanyeghị ihe ahụ ndị uwe ojii mere anyị, anyị akwụsịghị izi ozi ọma n’Amavie. Anyị mekwara ka okwukwe ndị nkwusa ole na ole nọ na Kuganisk, bụ́ obodo dị nso n’Amavie, sie ike. Obi dị m ezigbo ụtọ na e nwere ọgbakọ isii n’Amavie, nweekwa anọ na Kuganisk.

N’afọ niile ahụ, o nwere mgbe ụfọdụ anyị na-efelighị Jehova otú anyị kwesịrị. Ma, obi dị anyị ụtọ na Jehova si n’aka ụmụnna ji obi ha niile na-efe ya gbazie anyị ma mee ka okwukwe anyị sie ike. (Ọma 130:⁠3) Nnukwu nsogbu ọzọ bịaara anyị bụ na ndị na-arụrụ ndị uwe ojii ọrụ ji aghụghọ bata n’ọgbakọ. Ha mere ka à ga-asị na ha na-anụ ọkụ n’obi, na-ekwusasi ozi ọma ike. E nyedịrị ụfọdụ n’ime ha ihe ùgwù n’ọgbakọ. Ma ka oge na-aga, anyị chọpụtara ndị ha bụ.

N’afọ 1978, mgbe nwunye m dị afọ iri anọ na ise, ọ dịkwara ime ọzọ. Ebe ọ bụ na ọ na-arịa ọrịa obi na-ekweghị ala ala, ụjọ tụrụ ndị dọkịta na ọ ga-anwụ. Ha gbalịrị ime ka o kweta ite ime, ya ajụ. N’ihi ya, ụfọdụ ndị dọkịta ji ndụdụ na-esogharị ya ebe ọ bụla ọ gara n’ụlọ ọgwụ, na-achọ ịgba ya ọgwụ ka ọ mụọ nwa na-akaghị aka. Ọ gbapụrụ n’ụlọ ọgwụ ka ihe ọ bụla ghara ime nwa o bu n’afọ.

Ndị uwe ojii gwara anyị kwapụ n’obodo ahụ. Anyị kwagara n’otu obodo dị nso na Talin, dị n’Estonia. Estonia so ná mba Sọviet Yuniọn n’oge ahụ. Na Talin, Maria mụrụ agadaga nwa nwoke aha ya bụ Vitaly. Ihe ahụ dọkịta kwuru emeghị.

Anyị mechara si Estonia kwaga Nezlobnaya, bụ́ obere obodo dị n’ebe ndịda Rọshịa. Anyị ji akọ na-ezi ozi ọma n’obodo ndị dị nso ebe ahụ, bụ́ obodo ndị si n’ebe niile n’ụwa na-abịa ezuru ike. Ha na-abịa ka a gwọọ ha ọrịa, ma ụfọdụ n’ime ha na-enwezi olileanya ndụ ebighị ebi ma ha lawa.

ANYỊ ZỤRỤ ỤMỤ ANYỊ KA HA HỤ JEHOVA N’ANYA

Anyị gbalịrị ịzụ ụmụ anyị ka ha hụ Jehova n’anya, meekwa ka ha chọsie ike ijere ya ozi. Anyị na-akpọ ụmụnna ndị ụmụ anyị ga-amụta ezigbo ihe n’aka ha ka ha bịa n’ụlọ anyị. Onye anyị na-akpọkarị ka ọ bịa n’ụlọ anyị bụ nwanne m nwoke bụ́ Grigory. Ọ bụ onye nlekọta sekit malite n’afọ 1970 ruo n’afọ 1995. Obi na-atọ ndị ezinụlọ anyị niile ụtọ ma ọ bịa, n’ihi na ọnụ na-abụ ya ọchị ọchị, ọ na-akpakwa mmadụ ọchị. Anyị nwee ndị  ọbịa, anyị na-eji ihe e kwuru na Baịbụl mee gwam gwam gwam. Ka ụmụ anyị na-eto, akụkọ Baịbụl na-atọgbu ha atọgbu.

Ụmụ m ndị nwoke na ndị nwunye ha.

Si n’aka ekpe gaa n’aka nri, n’azụ: Yaroslav, Pavel, Jr., Vitaly

N’ihu: Alyona, Raya, Svetlana

N’afọ 1987, nwa anyị nwoke bụ́ Yaroslav kwagara n’obodo Riga dị na Latvia, bụ́ ebe o kwusawara ozi ọma n’enweghị onye ga-enye ya nsogbu. Ma mgbe ọ jụrụ ịrụ ọrụ onye agha, a tụrụ ya mkpọrọ otu afọ na ọnwa isii. Ọ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ itoolu dị iche iche. Ihe ndị m kọọrọ ya gbasara mgbe m nọ n’ụlọ mkpọrọ nyeere ya aka ịtachi obi. O mechara ghọọ ọsụ ụzọ. N’afọ 1990, nwa anyị bụ́ Pavel chọrọ ịsụ ụzọ na Sakalin, bụ́ agwaetiti dị n’ebe ugwu Japan. Ọ dị afọ iri na itoolu n’oge ahụ. Anyị achọbughị ka ọ gaa. E nwere naanị ndị nkwusa iri abụọ n’agwaetiti ahụ niile. Isi ebe anyị bi gawa ya karịrị puku kilomita itoolu. Ma, anyị mechara kweta. Ihe ahụ o kpebiri ime magburu onwe ya. Ndị bi ebe ahụ gere ntị n’ozi ọma e ziri ha. N’ime afọ ole na ole, e nwee ọgbakọ asatọ. Pavel jere ozi na Sakalin ruo n’afọ 1995. N’oge ọ na-eje ozi n’ebe ahụ, ọ bụ naanị anyị na nwa anyị nwoke nke ikpeazụ, bụ́ Vitaly, nọ n’ụlọ. Kemgbe Vitaly dị obere, ịgụ Baịbụl na-atọ ya ụtọ. Ọ malitere ịsụ ụzọ mgbe ọ dị afọ iri na anọ. Mụ na ya sụkọrọ ụzọ afọ abụọ. Ọ tọgburu anyị atọgbu. Mgbe ọ dị afọ iri na itoolu, ọ hapụrụ anyị, gaa ghọọ ọsụ ụzọ pụrụ iche.

N’afọ 1952, onye uwe ojii gwara nwunye m, sị: “Kwuo na ị bụghịzi Onyeàmà Jehova, ma ọ bụ gị agaa mkpọrọ afọ iri. Mgbe ị ga-apụta, i meela agadi. Ị ga na-anọkwa naanị gị.” Ma, ọ bụghị ihe mechara mee. Obi dị anyị ụtọ na Jehova, ụmụ anyị, na ọtụtụ ndị anyị nyeere aka ha abata n’ọgbakọ hụrụ anyị n’anya. Obi dị mụ na nwunye m ụtọ ịga ebe ụmụ anyị na-eje ozi. Anyị hụrụ otú obi si na-atọ ndị niile ụmụ anyị nyeere aka ha abata n’ọgbakọ.

OBI DỊ ANYỊ ỤTỌ MAKA IHE ỌMA JEHOVA MEERE ANYỊ

N’afọ 1991, e wepụrụ iwu a machibidoro Ndịàmà Jehova na Rọshịa. Ihe a mere ka ụmụnna na-ekwusasikwu ozi ọma ike. Ọgbakọ anyị zụdịrị bọs ka anyị nwee ike ịna-aga ekwusa ozi ọma ná ngwụcha izu ọ bụla n’obodo dị iche iche dị anyị nso.

Mụ na nwunye m n’afọ 2011

Obi dị m ụtọ na Yaroslav na nwunye ya, bụ́ Alyona, Pavel na nwunye ya, bụ́ Raya, na-eje ozi na Betel. Vitaly bụ onye nlekọta sekit. Ya na nwunye ya, bụ́ Svetlana, na-eleta ọgbakọ dị iche iche. Ada anyị bụ́ Irina na di ya, na ụmụ ha bi na Jamanị. Di ya bụ́ Vladimir na ụmụ ha atọ bụ ndị okenye n’ọgbakọ. Nwa anyị nwaanyị bụ́ Olga bi n’Estonia. Ọ na-akpọkwa m mgbe niile. Ọ dị mwute na nwunye ọma m bụ́ Maria nwụrụ n’afọ 2014. M na-atụsi anya ike ịhụ mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ. Ugbu a, m bi n’obodo Belgọrọd. Ụmụnna ndị bi n’obodo a na-enyere m ezigbo aka.

N’afọ niile m jeerela Jehova ozi, amụtala m na irubere Jehova isi na-efu ihe, ma otú Jehova si eme ka obi ruo anyị ala bụ akụ̀ bara ezigbo uru. Ngọzi ndị mụ na nwunye m nwetarala n’ihi ịtụkwasị Jehova obi karịrị ihe m tụrụ anya ya. Tupu ọchịchị Sọviet Yuniọn adaa n’afọ 1991, e nwere ihe ji obere karịa puku ndị nkwusa iri anọ. Taa, e nwere ihe karịrị narị puku ndị nkwusa anọ n’obodo ndị ahụ bụ́bu Sọviet Yuniọn. Adị m afọ iri asatọ na atọ ugbu a, ka bụrụkwa okenye n’ọgbakọ. Ọ bụ aka Jehova nọ na-enyere m n’oge niile ahụ mere ka m tachie obi. N’eziokwu, Jehova agọziela m nke ukwuu.​—⁠Ọma 13:​5, 6.