Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Julaị 2017

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Onye Kraịst ò kwesịrị inwe ụdị égbè ọ bụla ọ ga-eji na-echebe onwe ya maka ndị ọjọọ?

Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst nwere ike ịgbalịsi ike ka ha chebe onwe ha, o kwesịghị ime ka ha mebie iwu Baịbụl. Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara iji ụdị égbè ọ bụla ma ọ bụ ngwá ọgụ ọzọ chebe onwe anyị maka ndị ọjọọ. Chegodị banyere ihe ndị a:

Ndụ dị nsọ n’anya Jehova, nke ka nke, ndụ ndị mmadụ. Ọbụ abụ bụ́ Devid ma na ọ bụ Jehova “bụ isi iyi nke ndụ.” (Ọma 36:⁠9) N’ihi ya, ọ bụrụ na Onye Kraịst ekpebie ime ihe ụfọdụ iji chebe onwe ya ma ọ bụ akụ̀ ya, ọ ga-agbalịsi ike ka ọ ghara igbu mmadụ, ka ọbara mmadụ ghara ịdị ya n’isi.​—⁠Diut. 22:8; Ọma 51:⁠14.

Ọ bụ eziokwu na mmadụ iji ihe ọ bụla echebe onwe ya nwere ike ime ka o gbuo ọchụ, égbè na-eme ka igbu mmadụ dị mfe, ma onye ahụ ọ̀ kpachaara anya ma ọ̀ bụ n’ọghọm. * Ihe ọzọ bụ na onye omekome bịa, o nwere ike ịbụ na ahụ́ erughị ya ala. N’ihi ya, ọ hụ na onye ọ bịakwutere nwere égbè, ihe nwere ike ịka njọ. E nwekwara ike igbu mmadụ.

Mgbe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha were mma agha n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, o bughị n’obi ka ha jiri ya chebe onwe ha. (Luk 22:​36, 38) Kama, ihe mere o ji sị ha weta mma agha bụ ka ọ kụziere ha ka ha ghara ịlụ ọgụ, ọ bụrụgodị na ìgwè mmadụ iwe ji eburu ngwá ọgụ bịa. (Luk 22:52)  Mgbe Pita ji otu n’ime mma agha ahụ gbupụ ohu nnukwu onye nchụàjà ntị, Jizọs sịrị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya.” Jizọs kwuziri otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, nke mere ka ndị na-eso ụzọ ya mara ihe ha kwesịrị ime ruokwa n’oge anyị a. Ọ sịrị: “Ndị niile na-eji mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.”​—⁠Mat. 26:​51, 52.

Ndị Chineke ‘na-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi’ otú ahụ Maịka 4:3 kwuru. Ihe a e ji mara ezigbo Ndị Kraịst dabara adaba n’ihe Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwuo ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.” (Rom 12:​17, 18) Pọl mere ihe a o kwuru n’agbanyeghị ọtụtụ nsogbu bịaara ya, ma ‘ihe ize ndụ si n’aka ndị na-apụnara mmadụ ihe.’ Ichebe onwe ya adịghị ya mkpa karịa ime ihe Baịbụl kwuru. (2 Kọr. 11:26) Kama, ọ tụkwasịrị Chineke na amamihe dị n’Okwu ya obi. Ụdị amamihe ahụ “dị mma karịa ngwá ọgụ.”​—⁠Ekli. 9:⁠18.

Ndị Kraịst ji ndụ kpọrọ ihe karịa ihe onwunwe. “Ihe [mmadụ] nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) N’ihi ya, ezigbo Ndị Kraịst na-eme ihe Jizọs kwuru ma ọ bụrụ na olu ọma ha ji gwa onye oji égbè ezu okwu emeghị ka ọ kwụsị inye ha nsogbu. Jizọs sịrị: “Emegwarala onye bụ́ ajọ mmadụ ihe o mere gị.” O nwedịrị ike ịpụta na anyị ga-enye onye ahụ uwe ime anyị na uwe elu anyị otú ahụ Jizọs kwuru. (Mat. 5:​39, 40; Luk 6:29) * Ma, mgbochi dị mma karịa ọgwụgwọ. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme ‘oké ngosi nke ihe anyị ji ebi ndụ,’ meekwa ka ndị agbata obi anyị mata na anyị bụ Ndịàmà Jehova na-eme udo, o nwere ike ime ka ndị omekome ndị na-eme tigbuo zọgbuo ghara ịchọrọ anyị bịa.​—⁠1 Jọn 2:16; Ilu 18:⁠10.

Ndị Kraịst anaghị eme ihe ga-enye akọnuche ndị ọzọ nsogbu. (Rom 14:21) Ụmụnna mata na nwanna nwere égbè o ji echebe onwe ya maka ndị ọjọọ, o nwere ike ịwụ ụfọdụ n’ime ha akpata oyi n’ahụ́ ma ọ bụdị mee ka ha sụọ ngọngọ. Ịhụnanya na-eme ka anyị mee ihe ga-adị ndị ọzọ mma, kama ichewe naanị maka onwe anyị, ọ bụrụgodị na ọ pụtara na anyị ga-ahapụ ihe anyị weere ka ihe ruuru anyị.​—⁠1 Kọr. 10:​32, 33; 13:​4, 5.

Ndị Kraịst na-agbasi mbọ ike ka ha bụrụ ndị e ji ama atụ. (2 Kọr. 4:2; 1 Pita 5:​2, 3) A gwachaa Onye Kraịst ihe Baịbụl kwuru, ya aka nwee égbè o ji echebe onwe ya maka ndị ọjọọ, a gaghịzi ewere onye ahụ ka onye e ji ama atụ. N’ihi ya, ọ gaghị eru eru ịrụ ọrụ ma ọ bụ inwe ihe ùgwù pụrụ iche n’ọgbakọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa Onye Kraịst nke na-arụ ọrụ na-eme ka ọ na-ebu égbè. Ọ ga-akara ya mma ịchọrọ ọrụ ọzọ. *

O doro anya na Onye Kraịst ga-eji aka ya kpebie otú ọ ga-esi na-echebe onwe ya, ezinụlọ ya, ma ọ bụ akụ̀ ya, nakwa ụdị ọrụ ọ ga na-arụ. Ma, ihe Baịbụl kwuru na-egosi na Chineke ma ihe, hụkwa anyị n’anya. Ndị Kraịst ṅụjuru mmiri ara afọ na-akwanyere ihe Baịbụl kwuru ùgwù. N’ihi ya, ha na-ekpebi na ha agaghị enwe égbè ha ga-eji na-echebe onwe ha maka ndị ọjọọ. Ha ma na ha tụkwasị Chineke obi, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru, Chineke ga-echebe ha, meekwa ka ha nweta ndụ ebighị ebi.​—⁠Ọma 97:10; Ilu 1:33; 2:​6, 7.

N’oké mkpagbu ahụ, Ndị Kraịst ga-atụkwasị Jehova obi. Ha agaghị agbalịwa ichebe onwe ha

^ para. 3 Onye Kraịst nwere ike ikpebi inwe égbè ọ ga-eji na-egbute anụ ma ọ bụ nke ọ ga-eji na-echebe onwe ya ka anụ ọhịa ghara imerụ ya ahụ́. Ma, mgbe ọ na-enweghị ihe e ji ya eme, ọ ga-akacha mma ka e wepụ mgbọ dị na ya, ma ọ bụdị tụkasịa ya ma dewe ya n’ebe a kpọchiri akpọchi. Ọ bụrụ na a machibidoro égbè iwu n’obodo ma ọ bụ na e nyere iwu ụfọdụ gbasara ya, Ndị Kraịst na-erubere iwu ahụ isi.​—⁠Rom 13:⁠1.

^ para. 2 Ị chọọ ịhụ ebe e kwuru gbasara mmadụ ichebe onwe ya ka a ghara idina ya n’ike, gụọ isiokwu bụ́ “Ụzọ A Pụrụ Isi Gbochie Ndina n’Ike,” nke gbara na Teta! July 8, 1993.

^ para. 4 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru ihe gbasara mmadụ ịrụ ọrụ ga-eme ka ọ na-ebu égbè, gụọ Ụlọ Nche November 1, 2005, peeji nke 31; na nke January 15, 1984, peeji nke 25 ruo 26.