“Toonụ Jaa, . . . n’ihi na ọ dị ụtọ—e kwesịrị ito ya.”​—⁠ỌMA 147:⁠1.

ABỤ: 104, 152

1-3. (a) Olee mgbe o nwere ike ịbụ na e dere Abụ Ọma nke 147? (b) Olee ihe anyị ga-amụta n’Abụ Ọma nke 147?

MMADỤ rụọ ọrụ ya nke ọma ma ọ bụ kpaa àgwà ọma, e kwesịrị ito ya. Ebe anyị na-emere mmadụ ibe anyị otú ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ito Jehova Chineke karị? Anyị na-eto ya maka ike ya dị egwu, nke anyị na-ahụ n’ihe ndị dị ebube o kere. Anyị na-etokwa ya maka na o ji Ọkpara ya chụọ àjà iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya.

2 Onye dere Abụ Ọma nke 147 chọsiri ike ịna-eto Jehova, gwakwa ndị ọzọ ka ha soro ya na-eto Chineke.​—⁠Gụọ Abụ Ọma 147:​1, 7, 12.

3 Anyị amaghị onye dere Abụ Ọma nke 147. Ma, ọ dị ka onye ahụ ọ̀ dịrị ndụ mgbe Jehova mere ka ndị Izrel si na Babịlọn lọta Jeruselem. (Ọma 147:⁠2) Ọbụ abụ ahụ toro Jehova maka na ndị ya bizi n’ala ha, na-efe ya. Ma, o kwuru ihe ndị ọzọ mere e ji kwesị ịna-eto Jehova. Olee ihe ndị ọ bụ? Olee ihe ndị mere i ji kwesị ịna-ebi ndụ otú ga-egosi na ị ‘na-eto Jaa’? *​—⁠Ọma 147:⁠1.

 JEHOVA NA-AGWỌ NDỊ OBI GBAWARA

4. Olee otú ọ ga-abụrịrị na obi dị ndị Izrel mgbe Eze Saịrọs sịrị ha lawa? N’ihi gịnị?

4 Chegodị otú obi dị ndị Izrel mgbe ha nọ na Babịlọn. Ndị dọọrọ ha n’agha nọ na-akwa ha emo, sị: “Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ Zayọn.” N’oge ahụ, e bibiela Jeruselem, bụ́ ihe kacha eme ka ha na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova. (Ọma 137:​1-3, 6) Ọ dịghị ndị Juu nke ịbụ abụ. Obi gbawara ha. E kwesịrị ịkasi ha obi. Ma, Jehova si n’aka Saịrọs eze Peshia napụta ha otú ahụ o buru n’amụma. Saịrọs meriri Babịlọn ma kwuo, sị: “Jehova . . . enyewo m . . . ọrụ iwuru ya ụlọ na Jeruselem Onye ọ bụla n’ime unu, n’etiti ndị ya niile, ka Jehova bụ́ Chineke ya nọnyere ya. Ya lawa.” (2 Ihe 36:23) Chegodị otú ihe a si kasie ndị Izrel bi na Babịlọn obi.

5. Gịnị ka ọbụ abụ chọpụtara banyere ike Jehova nwere ịgwọ ndị mmadụ?

5 Ihe Jehova mere abụghị naanị ịkasi mba Izrel obi, kama ọ kasikwara onye ọ bụla n’ime ha obi. Ọ na-emekwa otú ahụ n’oge anyị a. Ọbụ abụ ahụ dere banyere Chineke, sị: “Ọ na-agwọ ndị e tiwara obi, ọ na-ekechikwa ọnyá na-egbu ha mgbu.” (Ọma 147:⁠3) O doro anya na ihe banyere ndị nwere nsogbu na-emetụ Jehova n’obi, ma nsogbu ha ọ̀ bụ ọrịa ma ọ̀ bụ na obi gbawara ha. N’oge anyị a, Jehova chọsiri ike ịna-akasi anyị obi na ịna-eme ka obi dị anyị mma. (Ọma 34:18; Aịza. 57:15) Ọ na-enye anyị amamihe na ike anyị ga-eji na-edi nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị.​—⁠Jems 1:⁠5.

6. Olee uru ihe ọbụ abụ kwuru n’Abụ Ọma 147:4 baara anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

6 Ọbụ abụ ahụ kwuweziri gbasara eluigwe. O kwuru na Jehova “na-agụ kpakpando niile ọnụ; ọ na-akpọ ha niile aha ha.” (Ọma 147:⁠4) Gịnị mere o ji hapụ ihe ọ na-ekwubu, kwuwezie gbasara ihe ndị dị n’eluigwe? Chegodị echiche. Ọbụ abụ ahụ nwere ike iji anya ya hụ kpakpando. Ma, ọ maghị ole ha dị. Kemgbe ọtụtụ afọ, kpakpando ole ụmụ mmadụ ga-ahụli ebuola ezigbo ibu. Ndị sayensị achọpụtala na e nwere ọtụtụ ijeri kpakpando n’ụyọkọ kpakpando a na-akpọ Milky Way. O nwere ike ịbụ na ụyọkọ kpakpando ndị dị n’eluigwe ruru ọtụtụ puku ijeri. Anyị bụ́ ụmụ mmadụ agaghị agụtali kpakpando ọnụ. Ma, Chineke na-akpọ ha niile aha. Ọ pụtara na Jehova weere kpakpando nke ọ bụla ka ihe pụrụ iche. (1 Kọr. 15:41) Ndị mmadụ Chineke kekwaranụ? Ebe ọ bụ na Chineke ma ebe kpakpando nke ọ bụla dị n’oge ọ bụla, ọ makwa gịnwa nke ọma. Ọ ma ebe ị nọ, otú obi dị gị, na ihe bụ́ mkpa gị mgbe ọ bụla.

7, 8. (a) Jehova napụtawa ndị ya ná nsogbu bịaara ha, gịnị ka ọ na-echeta? (b) Nye ihe atụ gosiri otú Jehova si enyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè aka.

7 Ọ bụghị naanị na Jehova ji gị kpọrọ ihe, kama o nwere ike ọ ga-eji nyere gị aka ná nsogbu ndị na-abịara gị, nweekwa ọmịiko. (Gụọ Abụ Ọma 147:⁠5.) I nwere ike iche na nsogbu gị akarịala nakwa na ị gaghị edili ya. Chineke ghọtara ihe ị na-agaghị edili. Ọ ‘na-echeta na ị bụ ájá.’ (Ọma 103:14) Ebe anyị bụ ndị na-ezughị okè, anyị na-emejọ ọtụtụ ugboro. Anyị na-akwa mmakwaara maka ihe ndị anyị kwujọrọ, ihe ọjọọ gụrụ anụ ahụ́ anyị, ma ọ bụ anyaụfụ anyị nwere. Ụdị ihe ahụ anaghị eme Jehova. Ma, otú o si aghọta anyị enweghị atụ. A gaghị achọpụtachali ya.​—⁠Aịza. 40:⁠28.

 8 O nwere ike ịbụ na ị hụla otú Jehova si jiri ike ya dị ukwuu nyere gị aka mgbe ọnwụnwa bịaara gị. (Aịza. 41:​10, 13) Dị ka ihe atụ, chegodị banyere otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Kyoko. Obi dara ya mbà mgbe ọ gafechara n’ọgbakọ ọhụrụ e zigara ya. Olee otú Jehova si gosi na ọ ghọtara nsogbu nwanna nwaanyị a? N’ọgbakọ ahụ ọ nọzi, ụmụnna ghọtara otú obi dị ya. Ọ dị ya ka Jehova ọ̀ nọ na-asị ya: “Ahụrụ m gị n’anya, ọ bụghị naanị maka na ị bụ ọsụ ụzọ, kama maka na ị bụ nwa m nwaanyị na onye nyefere m onwe ya. M chọrọ ka obi na-adị gị ụtọ na ị bụ Onyeàmà m.” Gịnwa kwanụ? Olee otú Jehova sirila gosi gị na a gaghị ‘akọchali akụkọ banyere nghọta ya’?

JEHOVA NA-ENYE ANYỊ IHE NDỊ DỊ ANYỊ MKPA

9, 10. Jehova nyewere anyị aka, olee ihe kacha mkpa ọ na-ebu ụzọ emere anyị? Nye ihe atụ.

9 Mgbe ụfọdụ, mkpa gị nwere ike ịbụ ihe ahụ́ gị chọrọ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ichegbuwe onwe gị ma ị̀ ga-enwekwa nri ga-ezuru gị. Ma, ọ bụ Jehova kere ụwa ka o nwee ike ịna-emepụta nri, ma nke ụmụ ugoloọma na-ebeku ya ga na-eri. (Gụọ Abụ Ọma 147:​8, 9.) Ebe ọ bụ na Jehova na-enye ụmụ nnụnụ nri, ka obi sie gị ike na ọ ga na-egboro gị mkpa gị.​—⁠Ọma 37:⁠25.

10 Nke kacha mkpa bụ na Jehova na-enye anyị ihe ga-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ọ na-enyekwa anyị ‘udo ya nke karịrị echiche niile.’ (Fil. 4:​6, 7) Dị ka ihe atụ, chee banyere otu nwanna aha ya bụ Mutsuo na nwunye ya. Jehova nyeere ha aka mgbe mmiri si n’oké osimiri bibie ọtụtụ ihe na Japan n’afọ 2011. N’ụbọchị ahụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ihe niile ha nwere lara n’iyi. Ha rịgooro n’elu ụlọ ha, nọrọ ebe ahụ chi abọọ, oyi anyụọ ha ịkpakwụ. N’ụtụtụ, ha malitere ịchọ ihe ga-agba ha ume. Naanị akwụkwọ ha hụrụ bụ Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2006. Ka nwanna ahụ na-asape akwụkwọ ahụ, ọ hụrụ isiokwu bụ́ “Mkpamkpa Kacha Njọ Mmiri Kpatụrụla.” Ọ kọrọ banyere ala ọma jijiji mere na Sumatra n’afọ 2004, nke mere ka mmiri si n’oké osimiri kpaa mkpamkpa kacha njọ a hụtụrụla kemgbe ụwa. Nwanna a na nwunye ya bere ákwá ka ha na-agụ gbasara ihe ahụ merenụ. Ha ghọtara otú Chineke si hụ ha n’anya, nke mere o ji si otú ahụ gbaa ha ume mgbe ha chọrọ ya. Jehova sikwa n’ụzọ ndị ọzọ gbooro ha mkpa ha. Ụmụnna wetaara ha ihe oriri na uwe. Ma ihe kacha gbaa ha ume bụ nleta ụmụnna na-anọchite anya nzukọ Chineke letara ọgbakọ ha. Nwanna ahụ sịrị: “Ọ dị m nnọọ ka Jehova ọ̀ nọ onye ọ bụla n’ime anyị n’akụkụ, na-elekọta anyị. Ọ kasiri anyị ezigbo obi.” Chineke na-ebu ụzọ enye anyị ihe ga-eme ka okwukwe anyị sie ike, gboziere anyị mkpa anyị ndị ọzọ.

IHE Ị GA-EME KA CHINEKE NYERE GỊ AKA

11. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nyere anyị aka?

11 Jehova dị njikere mgbe niile ‘inyere ndị dị umeala n’obi aka.’ (Ọma 147:6a) Ma, gịnị ka anyị ga-eme ka o nyere anyị aka? Anyị na ya kwesịrị ịdị n’ezigbo mma. Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ka anyị na ya nwee ike ịdị ná mma. (Zef. 2:⁠3) Ndị dị umeala n’obi na-echere Chineke ka ọ kwụsị mmegbu a na-emegbu ha na ahụhụ ha na-ata. Jehova na-ele ndị dị otú ahụ anya ọma.

12, 13. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ịgbara ọsọ ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nyere anyị aka? (b) Ònye ka ihe ya na-amasị Jehova?

 12 Ma, Chineke “na-ewedaru ndị ajọ omume ala.” (Ọma 147:6b) Anyị achọghị ka Chineke mee anyị otú ahụ. Anyị chọrọ ka ọ hụ anyị n’anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpọ ihe ọ kpọrọ asị asị. (Ọma 97:10) Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpọ mmekọahụ rụrụ arụ asị. Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịgbara ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị kwaa iko ọsọ, ma ile ndị gba ọtọ. (Ọma 119:37; Mat. 5:28) O nwere ike isiri anyị ike. Ma, anyị kwesịrị ịgba mbọ mee ya n’ihi na ọ ga-eme ka Jehova gọzie anyị.

13 Anyị agaghị emerili n’ọgụ a n’ike nke onwe anyị. Anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Obi ọ̀ ga-adị ya ụtọ ma anyị gbalịwa iji “ike ịnyịnya” zọpụta onwe anyị, ya bụ, ịtụkwasị ndị mmadụ obi? Mbanụ. Anyị ekwesịghịkwa ịtụkwasị “ụkwụ mmadụ” obi, ya bụ, ịna-eme ka ọ̀ bụ anyịnwa ma ọ bụ mmadụ nkịtị ga-azọpụtali anyị. (Ọma 147:10) Kama ime otú ahụ, anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Ọ naghị eme ka ụmụ mmadụ. Ike ịnụ arịrịọ anyị anaghị agwụ ya, anyị rịọgodị ya ugboro ugboro. Abụ Ọma 147:11 sịrị: “Ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ ndị na-atụ egwu ya, ee, ndị na-echere obiọma ya.” Ebe ọ hụrụ anyị n’anya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ gaghị ahapụ anyị nakwa na ọ ga-enyere anyị aka imeri ihe ọjọọ ọ bụla na-agụ anyị.

14. Gịnị mere ka obi sie ọbụ abụ ahụ ike?

14 Jehova na-emesi anyị obi ike na ọ ga-enyere ndị ya aka ma ọ gbajuo dọrọ. Mgbe ndị Izrel si Babịlọn lọghachi Jeruselem, ọbụ abụ ahụ chere banyere otú Jehova si nyere ha aka. Ọ bụrụ abụ, sị: “O mewo ka ihe e ji atụchi ọnụ ụzọ ámá gị sie ike; ọ gọziwo ụmụ gị nọ n’ime gị. Ọ na-eme ka udo dị n’ókèala gị.” (Ọma 147:​13, 14) Obi siri ọbụ abụ ahụ ike mgbe ọ matara na Jehova ga-eme ka ọnụ ụzọ ámá Jeruselem sie ike. Ọ bụ ihe mere ka obi sie ya ike na Jehova ga-echebe ndị ya.

Olee otú Okwu Chineke nwere ike isi nyere anyị aka ma ọ dị anyị ka ọnwụnwa bịaara anyị ọ̀ karịala? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 ruo na nke 17)

15-17. (a) Olee otú obi nwere ike ịdị anyị mgbe ụfọdụ maka ọnwụnwa bịaara anyị, ma olee otú Jehova si eji Okwu ya enyere anyị aka? (b) Nye ihe atụ na-egosi otú ‘okwu Chineke si agba ọsọ.’

15 Nsogbu ndị bịaara gị nwere ike ime ka ị chịrị obi n’aka. Jehova ga-enyeli gị amamihe ị ga-eji die ya. Ọbụ abụ ahụ kwuru na Chineke “na-ezite okwu ya n’ụwa; okwu ya na-agbakwa oké ọsọ.” Mgbe o kwuchara banyere snoo na mkpụrụ mmiri Chineke na-eme ka ọ daa, ọ jụrụ, sị: “Ònye pụrụ idi oyi ya?” O kwukwara na Chineke “na-ezipụ okwu ya, wee gbazee ha.” (Ọma 147:​15-18) Ebe Chineke ma ihe niile, bụrụ onye kacha ike, na-agwakwa snoo na mkpụrụ mmiri ihe ha ga-eme, ka obi sie gị ike na ọ ga-enyere gị aka ná nsogbu ọ bụla bịaara gị.

16 N’oge anyị a, Jehova na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl eduzi anyị. “Okwu ya na-agbakwa oké ọsọ,” nke pụtara na ọ na-eduzi anyị n’oge kwesịrị ekwesị. Chegodị uru ị na-erite n’ịgụ Baịbụl, n’ịmụ akwụkwọ ndị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụtara anyị, n’ile Ihe Omume Tiivi anyị, n’ịga na jw.org, nakwa n’aka ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ. (Mat. 24:45) Ọ̀ bụ na ị hụbeghị otú Jehova si eduzi anyị n’oge kwesịrị ekwesị?

17 Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Simone hụrụ otú Okwu Chineke si nyere ya aka. Ọ dị ya ka e nweghị ihe ọ dị mma ya. O chekwara na Jehova anaghị  ele ya anya ọma. Ma, n’oge ndị obi dara ya mbà, o kpesiri ekpere ike, na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka. Ọ mụsikwara Baịbụl ike. O kwuru, sị: “E nwetụbeghị nsogbu bịaara m, Jehova ahapụ ime ka m dị ike, duziekwa m.” Ihe a enyerela ya aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ya.

18. Gịnị mere obi ji sie gị ike na Chineke meere gị ihe ọma, gịnịkwa mere i ji kwesị ‘ịna-eto Jaa’?

18 Ọbụ abụ ahụ ma na Chineke meere ndị ya ihe ọma pụrụ iche. Ọ bụ naanị ha ka Chineke nyere “okwu” ya, “ụkpụrụ ya na mkpebi ikpe ya.” (Gụọ Abụ Ọma 147:​19, 20.) Taa, otu n’ime ihe ọma Chineke meere anyị bụ na ọ bụ naanị anyị ka ọ kpọkwasịrị aha ya. Anyị ma Jehova. Okwu ya na-eduzikwa anyị. Ọ bụ ya mere anyị na ya ji dị ná mma. Ọ̀ bụ na i kwesịghị ịna-eme otú ahụ onye dere Abụ Ọma nke 147 mere, ya bụ, ‘ịna-eto Jaa,’ na-agwakwa ndị ọzọ ka ha mee otú ahụ?

^ para. 3 “Jaa” bụ otú e si akpọbiri aha Jehova.