Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)  |  Julaị 2016

Na-achọ Alaeze Chineke, Ọ Bụghị Ihe Onwunwe

Na-achọ Alaeze Chineke, Ọ Bụghị Ihe Onwunwe

“Na-achọnụ alaeze [Chineke], a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a.”—LUK 12:31.

ABỤ: 40, 98

1. Olee ihe dị́ iche n’ihe dị́ anyị mkpa na ihe anyị chọrọ?

A NA-EKWUKARỊ na ọ bụghị ihe niile ndị mmadụ chọrọ dị ha mkpa. Ọ dị ka ụfọdụ ndị anaghị aghọta ihe dị́ iche n’ihe dị́ ha mkpa na ihe ha chọrọ. Gịnị dị iche na ha abụọ? “Ihe dị́ anyị mkpa” bụ ihe anyị ga-enwerịrị n’ihi na ma anyị enweghị ya, anyị agaghị adị ndụ. Dị ka ihe atụ, nri, uwe, na ebe obibi dị anyị ezigbo mkpa. “Ihe anyị chọrọ” bụ ihe na-agụ anyị agụụ ka anyị nwee, ma ya abụrụ na ma anyị enweghị ya, anyị ka ga-adị ndụ.

2. Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị mmadụ chọrọ?

2 Ihe ndị mmadụ chọrọ nwere ike ịdị iche iche n’ihi ebe ha bi. Ná mba ndị ka na-emepe emepe, o nwere ike ịna-agụ ọtụtụ ndị agụụ ka ha nweta ego ha ga-eji zụọ ekwentị, ọgba tum tum, ma ọ bụ ala. Ná mba ndị mepere emepe, ndị mmadụ nwere ike ịna-achọ inwe uwe ndị dị́ oké ọnụ, ụlọ bukwuru ibu ma ọ bụ ụgbọala ka oké ọnụ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, ma anyị  akpacharaghị anya, anyị nwere ike ịmalite ịhụ ihe onwunwe n’anya, na-achọ inwetakwu ihe, ma nke aka anyị ga-eru ma nke aka anyị na-agaghị eru.

KPACHARA ANYA KA Ị GHARA ỊHỤ IHE ONWUNWE N’ANYA

3. Gịnị bụ ịhụ ihe onwunwe n’anya?

3 Gịnị bụ ịhụ ihe onwunwe n’anya? Ọ bụ mmadụ ikwe ka ihe onwunwe dịrị ya mkpa karịa adịm ná mma ya na Chineke. Ihe na-akpata ya bụ ihe na-agụ mmadụ agụụ, ihe o weere ka ihe kacha mkpa, na ihe ọ na-achụ ná ndụ. Ọ na-eme ka ọ na-agụsi mmadụ ike inwekwu ihe. O nwere ike ịbụ na onye hụrụ ihe onwunwe n’anya abụghị ọgaranya ma ọ bụ onye na-azụ ihe ndị dara oké ọnụ. Ndị ogbenye nwedịrị ike ịhụwa ihe onwunwe n’anya ma ghara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke.—Hib. 13:5.

4. Olee otú Setan si agbalị iji “ọchịchọ nke anya” arata anyị?

4 Setan chọrọ iji ihe ndị a na-emepụta n’ụwa a mee ka anyị chee na ọ bụ inwe ọtụtụ ihe ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Ọ bụ aka ochie n’iji “ọchịchọ nke anya” arata mmadụ. (1 Jọn 2:15-17; Jen. 3:6; Ilu 27:20) E nwere ọtụtụ ihe a na-emepụta n’ụwa, ma ndị bụ́ ọkpọka ma ndị na-enweghị ihe ha bụ. Ụfọdụ n’ime ha nwekwara ike ịmasị anyị. Ò nwetụla mgbe ị zụrụ ihe na-adịghị gị mkpa maka na ihe ahụ chabara gị n’anya mgbe ị hụrụ ya ma ọ bụ mgbe a na-akpọsa ya? Ì mechara chọpụta na o nweghị oké uru ihe ahụ baara gị? Ọ bụrụ na anyị ana-azụ ihe ndị na-adịghị anyị mkpa, ọ ga-eme ka ihe siere anyị ike, ike ana-agwụkwa anyị. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka uche anyị pụọ n’ozi anyị na-ejere Jehova, anyị agaghịzi enwe ohere ịmụ Baịbụl, ịkwadebe maka ọmụmụ ihe, ịga ọmụmụ ihe, na ịgachi ozi ọma anya. Cheta na Jọn onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa.”

5. Olee ihe nwere ike ime mmadụ ma ọ bụrụ na ihe kacha ya mkpa bụ ịkpata akụ̀?

5 Setan chọrọ ka anyị bụrụ ndị ohu Akụnụba kama ịbụ ndị ohu Jehova. (Mat. 6:24) Ma ọ bụrụ na ihe kacha anyị mkpa bụ ịkpata akụ̀, ndụ anyị agaghị enwe isi. O nwere ike ime ka obi ghara ịna-ezu anyị ike. Nke kadị njọ bụ na okwukwe anyị agaghịzi esi ike. (1 Tim. 6:9, 10; Mkpu. 3:17) Ọ ga-adị ka ihe ahụ Jizọs kwuru n’ilu ọ tụrụ gbasara ọgha mkpụrụ. Ọ sịrị na mgbe a kụrụ mkpụrụ Alaeze Chineke “n’etiti ogwu . . . , ọchịchọ maka ihe ndị ọzọ na-awabata ma kpagbuo okwu ahụ, o wee ghọọ nke na-amịghị mkpụrụ.”—Mak 4:14, 18, 19.

6. Gịnị ka akụkọ Barọk na-akụziri anyị?

6 Chegodị banyere Barọk, bụ́ odeakwụkwọ Jeremaya onye amụma. Mgbe ọ fọrọ obere ka e bibie Jeruselem otú e buru n’amụma, Barọk malitere ‘ịchọrọ onwe ya ihe ukwu,’ bụ́kwanụ ihe na-agaghị abara ya ezigbo uru. Ma naanị ihe o kwesịrị ịna-atụ anya inweta bụ ihe Jehova kwere ya ná nkwa, ya bụ, ichebe ya ka ọ ghara ịnwụ. (Jere. 45:1-5) O doro anya na o nweghị onye Chineke ga-echebe akụ̀ ya ma o bibiwa obodo ahụ. (Jere. 20:5) Ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, ugbu a abụghị oge anyị ga-eji na-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ. Anyị ekwesịghị ịtụ anya na e nwere akụ̀ anyị a na-agaghị ebibi n’oké mkpagbu ahụ n’agbanyeghị otú anyị si jiri ya kpọrọ ihe.—Ilu 11:4; Mat. 24:21, 22; Luk 12:15.

7. Olee ihe anyị ga-elebara anya, n’ihi gịnịkwa?

7 N’ihe Jizọs kụziri n’elu ugwu, o kwuru otú kacha mma anyị ga-esi na-akpata ihe anyị ga-eji na-egbo mkpa anyị ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị  anya, anyị achụwazie ego ọnwụ ọnwụ ma ọ bụ chegbuwe onwe anyị gabiga ókè. (Mat. 6:19-21) Ka anyị gụọ Matiu 6:25-34 ma kọwaa ya. Ọ ga-eme ka obi sie anyị ike na anyị kwesịrị ‘ịna-achọ alaeze Chineke,’ ọ bụghị ihe onwunwe.Luk 12:31.

JEHOVA NA-EGBORO ANYỊ MKPA ANYỊ

8, 9. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị dị́ anyị mkpa? (b) Olee ihe Jizọs ma banyere ụmụ mmadụ na mkpa ha?

8 Gụọ Matiu 6:25. Mgbe Jizọs gwara ndị mmadụ ka ha ‘kwụsị ịna-echegbu onwe ha banyere mkpụrụ obi ha,’ ọ pụtara na ọ na-agwa ha echegbuzila onwe ha. Ha nọ na-echegbu onwe ha n’ihe ha na-ekwesịghị ịna-echegbu onwe ha maka ya. E nwere ezigbo ihe mere Jizọs ji gwa ha ka ha kwụsị ime otú ahụ. Ọ bụrụgodị na ihe mere mmadụ ji na-echegbu onwe ya bụ ihe dị́ mkpa, o nwere ike ime ka ọ ghara iji obi ya niile na-efe Chineke, nke bụ́kwanụ ihe kacha mkpa ná ndụ. Otú Jizọs si hụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya mere ka ọ dọọ ha aka ná ntị ugboro anọ ọzọ ka ha kwụsị ịna-echegbu onwe ha.—Mat. 6:27, 28, 31, 34.

9 Gịnị mere Jizọs ji gwa anyị ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere ihe anyị ga-eri, ihe anyị ga-aṅụ ma ọ bụ ihe anyị ga-eyi? Ọ̀ bụ na ụdị ihe ndị a esoghị n’ihe ndị dị anyị mkpa ná ndụ? O doro anya na ha so. Ọ bụrụ na anyị enweghị ego anyị ga-eji zụọ ihe ndị ahụ, ọ̀ bụ na anyị agaghị echegbuwe onwe anyị? N’eziokwu, anyị ga-echegbuwe onwe anyị. Jizọs makwa na anyị ga-eme otú ahụ. Ọ ma ihe niile dị́ ndị mmadụ mkpa. Ọ makwa na “n’oge ikpeazụ,” ndị na-eso ụzọ ya ga-ebi ‘n’oge tara akpụ.’ (2 Tim. 3:1) Ụfọdụ n’ime nsogbu na-echi ọtụtu ndị ọnụ n’ala taa bụ enweghị ọrụ, ihe ịda oké ọnụ, ụkọ nri, na ịda ogbenye. Ma, Jizọs makwa na ndụ ‘dị mkpa karịa ihe oriri, na ahụ́ dịkwa mkpa karịa uwe.’

10. Mgbe Jizọs na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ekpe ekpere, olee ihe o kwuru ha kwesịrị iwere ka ihe kacha mkpa?

10 Jizọs ebula ụzọ kụziere ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arịọ Nna ha nke eluigwe ka ọ na-egboro ha mkpa ha. Ọ gwara ha ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa.” (Mat. 6:11) Otú o si kwuo ya n’oge ọzọ bụ: “Nye anyị nri anyị ga-eri taa dị ka ihe ga-ezuru anyị taa si dị.” (Luk 11:3) Ma, ndụmọdụ a o nyere apụtaghị na anyị kwesịrị ịna-eche mgbe niile banyere inweta ihe dị́ anyị mkpa. N’otu ekpere ahụ, o mere ka o doo anya na ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa dị mkpa karịa ikpe ekpere maka mkpa anyị. (Mat. 6:10; Luk 11:2) Iji mee ka ndị na-eso ụzọ ya kwụsị ịna-echegbu onwe ha, o chetaara ha otú Jehova si elekọta ihe niile o kere eke.

11, 12. Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jehova si elekọta anụ ufe nke eluigwe? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 Gụọ Matiu 6:26. Anyị kwesịrị ‘ileru anụ ufe nke eluigwe anya.’ N’agbanyeghị na ha dị obere, ha na-eri ihe buru ibu, ma mkpụrụ osisi, ma ụmụ ahụhụ, ma idide. A sị na nnụnụ hà ka mmadụ, nri ha ga na-eri gaara aka nke mmadụ na-eri. Ma, ha anaghị akọ ugbo ma kụọ mkpụrụ ha ga-eri. Ọ bụ Jehova na-enye ha ihe niile ha na-eri. (Ọma 147:9) Ma, ị manụ na ọ naghị etinye ha nri n’ọnụ. Ọ bụ ha na-aga chọta ihe ha ga-eri. Ma, nri ha juru eju bara abara.

12 O meghị Jizọs obi abụọ na Nna ya ga na-egboro ụmụ mmadụ mkpa ha ebe ọ bụ na ọ na-enye ụmụ nnụnụ nri. [1] (1 Pita 5:6, 7) Ọ gaghị etinye anyị nri n’ọnụ. Ma, o nwere ike ịgọzi mbọ anyị  na-agba ịkọpụta nri anyị ga-eri ma ọ bụ ịkpata ego anyị ga-eji na-azụ ihe anyị ga-eri n’ụbọchị. Anyị nwee mkpa, o nwere ike imetụ ndị ọzọ aka n’obi ka ha nye anyị ihe ha nwere. N’agbanyeghị na Jizọs ekwughị banyere inye ụmụ nnụnụ akwụ́ ha ga-ebi, Jehova enyela ha amamihe, nkà, na ahịhịa ha ga-eji na-akpa akwụ́ ha. Jehova nwekwara ike inyere anyị aka ka anyị nweta ebe anyị na ezinụlọ anyị ga-ebi.

13. Olee ihe gosiri na anyị bara uru karịa anụ ufe nke eluigwe?

13 Jizọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ̀ bụ na unu adịghị oké ọnụ ahịa karịa [anụ ufe nke eluigwe]?” O doro anya na Jizọs bu n’obi na ya ga-eji ndụ ya chụọ àjà n’oge na-adịghị anya iji zọpụta ụmụ mmadụ. (Tụlee Luk 12:6, 7.) E nweghị ihe ndị ọzọ Chineke kere eke Jizọs nwụrụ maka ha. Ọ nwụghị maka ụmụ nnụnụ, kama ọ nwụrụ maka anyị ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi.—Mat. 20:28.

14. Olee ihe onye na-echegbu onwe ya na-agaghị emeli?

14 Gụọ Matiu 6:27. Gịnịzi mere Jizọs ji kwuo na onye na-echegbu onwe ya agaghị agbakwụnyeli otu kubit n’afọ ndụ ya? Ọ bụ n’ihi na ichegbu onwe anyị banyere mkpa anyị kwa ụbọchị agaghị enyere anyị aka ịdị ogologo ndụ. Kama ime otú ahụ, nchegbu nwere ike ime ka anyị nwụchuo ọnwụ.

15, 16. (a) Gịnị ka anyị na-amụta n’otú Jehova si elekọta okooko lili dị́ n’ọhịa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, n’ihi gịnị?

15 Gụọ Matiu 6:28-30. È nwere onye na-achọghị ịna-eyi uwe mara mma, nke ka nke, n’ozi ọma, n’ọmụmụ ihe ma  ọ bụ ná mgbakọ? Ma, ànyị kwesịrị ‘ịna-echegbu onwe anyị banyere uwe’? Jizọs kwuwere ọzọ banyere ihe ndị Jehova kere. Na nke ugbu a, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe “n’okooko lili dị n’ọhịa.” O nwere ike ịbụ na ihe Jizọs bu n’obi bụ ụdị okooko lili dị́ iche iche. Ha niile na-ama ezigbo mma. Ihe ndị ahụ Chineke kere anaghị akpa ogho, jiri ya kwaa uwe ha ga-eyi. Ma, ha na-ama mma dị́ egwu ma ha waa okooko. “Ọbụna Sọlọmọn, n’ebube ya niile, eyighị uwe mara mma dị ka otu n’ime ha.”

16 Echefula ihe mere Jizọs ji kwuo ihe ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na Chineke na-eyiwe ahịhịa ndụ dị n’ubi uwe, . . . ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karị, unu ndị okwukwe nta?” O doro anya na ọ ga-eme otú ahụ. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs enwechaghị okwukwe. (Mat. 8:26; 14:31; 16:8; 17:20) Ha kwesịrị inwekwu okwukwe na Jehova ma tụkwasịkwuo ya obi. Anyịnwa kwanụ? Okwukwe anyị ò siri ezigbo ike na Jehova chọrọ ịna-egboro anyị mkpa anyị nakwa na ọ ga-emeli ya?

17. Gịnị nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma?

17 Gụọ Matiu 6:31, 32. Anyị ekwesịghị ịna-eme ka ndị “mba ọzọ,” bụ́ ndị na-enweghị okwukwe ná Nna anyị nke eluigwe, Onye na-elekọta ndị bu ụzọ na-achọ Alaeze ya. Anyị gbawa mbọ ka anyị nweta ihe niile “ndị mba ọzọ na-achụsi ike,” ọ ga-eme ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. Kama ime otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na anyị mee ihe anyị kwesịrị ime, nke bụ́ iwere ihe gbasara ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa, ọ ga na-egboro anyị mkpa anyị niile. Ọ bụrụ na anyị ‘na-asọpụrụ Chineke,’  afọ kwesịrị iju anyị na anyị nwere “ihe oriri na uwe.”—1 Tim. 6:6-8.

Ì BU ỤZỌ NA-ACHỌ ALAEZE CHINEKE?

18. Olee ihe Jehova ma banyere anyị n’otu n’otu? Oleekwa ihe ọ ga-emere anyị?

18 Gụọ Matiu 6:33. Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị iwere Alaeze Chineke ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha. Jizọs kwuru na anyị mee otú ahụ, ‘a ga-atụkwasịrị anyị ihe ndị ọzọ a niile.’ Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ kọwara n’amaokwu bú ụzọ, sị: “Nna unu nke eluigwe maara na ihe a niile dị unu mkpa.” O sighịrị Jehova ike ịma ụdị nri, uwe, na ebe obibi dị́ anyị mkpa, tupudị anyị amata na ha dị anyị mkpa. (Fil. 4:19) Ọ ma uwe anyị nke chọwarala ịka. Ọ ma ihe anyị kwesịrị ịna-eri na ụlọ ga-aba anyị na ndị ezinụlọ anyị. Jehova ga-emerịrị ka anyị nweta ihe dị́ anyị mkpa n’eziokwu.

19. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị banyere echi?

19 Gụọ Matiu 6:34. Buru n’uche na Jizọs kwuru nke ugboro abụọ, sị: “Unu echegbula onwe unu.” Ọ chọrọ ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị maka echi, kama ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. Mmadụ chegbuwe onwe ya banyere ihe nwere ike ime echi, o nwere ike ime ka ọ tụkwasịwa onwe ya obi kama ịtụkwasị Chineke obi, nke nwere ike ime ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma.—Ilu 3:5, 6; Fil. 4:6, 7.

JEHOVA GA-ATỤKWASỊRỊ GỊ IHE NDỊ ỌZỌ MA I BURU ỤZỌ NA-ACHỌ ALAEZE YA

Ì nwere ike iselata aka n’ihe ndị na-eri gị oge ka i nwee ike jekwuoro Jehova ozi? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20)

20. (a) Gịnị ka i nwere ike ikpebi ime n’ozi Jehova? (b) Olee otú i nwere ike isi selata aka n’ihe ndị na-eri gị oge?

20 Ọ ga-aghọ anyị ahịa ma ịchụ akụnụba mee ka anyị ghara ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Kama, anyị kwesịrị iji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, ì nwere ike ịgafe n’ọgbakọ ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma? Ì nwere ike ịbụ ọsụ ụzọ? Ọ bụrụ na ị bụ ọsụ ụzọ, ì nwere ike idejupụta akwụkwọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze? Ị̀ ga-ewepụtali onwe gị na-aga arụ ọrụ nwa oge n’alaka ụlọ ọrụ anyị ma ọ bụ n’ọfis ndị nsụgharị? Ị̀ ga-esoli ná ndị na-enyere ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka, soro ha na-arụ ọrụ ụbọchị ole na ole n’izu? Chee otú ị ga-esi selata aka n’ihe ndị na-eri gị oge, ka i nwee ike ijekwuru Chineke ozi. Tụlee igbe bụ́ “ Otú Ị Ga-esi Selata Aka n’Ihe Ndị Na-eri Gị Oge,” kpeekwa ekpere banyere ya. Bidokwa ime ihe ndị ga-enyere gị aka ime ihe i kpebiri ime.

21. Olee ihe ga-eme ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?

21 E nwere ezigbo ihe mere Jizọs ji gwa anyị ka anyị na-achọ Alaeze Chineke, ọ bụghị ihe onwunwe. Anyị mee otú ahụ, anyị agaghị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị bụ́ mkpa anyị. Anyị na Jehova ga-adịkwu ná mma n’ihi na obi siri anyị ike na ọ ga na-elekọta anyị. Anyị ga na-ejide onwe anyị ma ghara ịna-azụ ihe niile ụwa a na-emepụta, ọ bụrụgodị ihe aka anyị ga-eru. Iselata aka n’ihe ndị na-eri anyị oge ugbu a ga-enyere anyị aka ‘ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ nke Chineke kwere anyị ná nkwa.—1 Tim. 6:19.

^ [1] (paragraf nke 12) Ị chọọ ịghọta ihe mere Jehova nwere ike iji kwe ka nri kọọ Onye Kraịst, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” n’Ụlọ Nche Septemba 15, 2014, peeji nke 22.