Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! Nke 1 n'Afọ 2016

 IHE BAỊBỤL KWURU

Ọgwụgwụ Ụwa

Ọgwụgwụ Ụwa

Baịbụl kwuru na 1 Jọn 2:17, sị: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa.” Gịnị ka “ụwa” a a kpọrọ aha ebe a pụtara? Olee otú ọ ga-esi gabiga? Oleekwa mgbe ọ ga-agabiga?

Olee “ụwa” a na-ekwu na ọ ga-agabiga?

IHE BAỊBỤL KWURU

N’amaokwu ahụ, ụwa ahụ a kpọrọ aha nwere ‘ọchịchọ’ nke Chineke kpọrọ asị. N’ihi ya, o doro anya na ọ gaghị abụ ala nkịtị anyị na-azọ ụkwụ ka a na-ekwu okwu ya. Kama, ihe ọ pụtara bụ ụmụ mmadụ ndị merela onwe ha ndị iro Chineke n’ihi na ha anaghị erubere ya isi. (Jems 4:4) Ụmụ mmadụ ndị a “ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke bụ́ mbibi ebighị ebi.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:7-9) Ma, ụmụ mmadụ ndị ‘na-abụghị nke ụwa’ n’ihi na ha na-erubere Jizọs isi, ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 15:19.

Baịbụl kwukwara na 1 Jọn 2:17, sị: “Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ihe Abụ Ọma 37:29 kwuru gosikwara na ọ bụ n’ụwa a ka ndị na-eme uche Chineke ga-ebi. Ọ sịrị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”

“Unu ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna anyị adịghị n’ime ya.”1 Jọn 2:15.

Olee otú a ga-esi bibie ụwa?

IHE BAỊBỤL KWURU

E nwere ụzọ ihe abụọ Chineke ga-eme. Nke mbụ, ọ ga-ebibi okpukpe ụgha niile. Na Baịbụl, e ji okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa tụnyere nwaanyị akwụna aha ya bụ “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 17:1-5; 18:8) Okpukpe ndị a na-ekwu na ha na-ejere Chineke ozi, ma, ọ bụ ndị ọchịchị ka ha tụkwasịrị obi. Ndị ọchịchị a ga-emechakwa bibie ha. Baịbụl kwuru, sị: “[Ha] ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị, laakwa ya n’iyi ma mee ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erikwa anụ ya [ya bụ, akụnụba ya] ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam.”—Mkpughe 17:16.

Ihe nke abụọ Chineke ga-eme bụ ibibi ndị ọchịchị ahụ, ya bụ “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi,” na ndị ọzọ na-eme ihe ọjọọ. Ọ ga-ebibi ha ‘n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.’ A na-akpọ agha ahụ agha “Amagedọn.”—Mkpughe 16:14, 16.

“Chọọnụ Jehova, unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa . . . Chọọnụ ezi omume, chọọnụ ịdị umeala n’obi. Ma eleghị anya, a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”Zefanaya 2:3.

 Olee mgbe a ga-ebibi ụwa a?

IHE BAỊBỤL KWURU

Mgbe Chineke ga-ebibi ụwa a bụ mgbe ozi ọma Alaeze ya a na-ekwusa iji dọọ ụmụ mmadụ aka ná ntị juru ya afọ, ha anụ ya ma ghọta na ọ bụ ọchịchị ya ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ. (Daniel 7:13, 14) Jizọs Kraịst kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Otu n’ime ihe ndị na-egosi na ọgwụgwụ ụwa eruwela nso bụ ozi ọma Alaeze ahụ a na-ekwusa. Ozi ọma a na-egosikwa na Chineke nwere obi ebere ma na-ekpe ikpe ziri ezi. Ihe ndị ọzọ a ga-eji mara na ọgwụgwụ ụwa adịla nso bụ agha, ala ọma jijiji, ụkọ nri, na ọrịa dị iche iche.—Matiu 24:3; Luk 21:10, 11.

Ihe ndị ahụ abụghị naanị ihe Baịbụl kwuru ga-egosi na ọgwụgwụ ụwa adịla nso. O kwukwara gbasara otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà. Ọ sịrị: “A ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” *2 Timoti 3:1-5.

N’oge na-adịghị anya, ụwa ọjọọ a ‘ga-agabiga.’1 Jọn 2:17

Ihe ndị a niile Baịbụl kwuru ndị ga-egosi na ọgwụgwụ ụwa adịla nso malitere imezu n’afọ 1914 mgbe a lụrụ Agha Ụwa Mbụ. Kemgbe ahụ, a na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe dị iche iche n’ụwa. Obi dịkwa Ndịàmà Jehova ụtọ na e ji ikwusa ozi ọma a mara ha. Akwụkwọ ha kacha eji eme ya bụ Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova.

“Na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.”Matiu 25:13.

^ para. 14 Ị chọọ ịgụkwu gbasara ihe e kwuru ebe a, gụọ isi nke itoolu n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike inweta ya na www.jw.org/ig.

GỤKWUO GBASARA YA

A Ga-azọpụta Ọtụtụ Ndị Mgbe Ọgwụgwụ Ụwa Ga-abịa—Gịnwa Nwekwara Ike Iso na Ha

Ma, olee ihe ị ga-eme ka a zọpụta gị? Ọ̀ bụ ịna-akwakọta ihe oriri na ihe ndị ọzọ maka ọgwụgwụ ụwa?