Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Mach 2015

 ISIOKWU TETA! A | BAỊBỤL Ọ̀ KA BARA URU?

Ịkwụwa Aka Ọtọ

Ịkwụwa Aka Ọtọ

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu [Chineke]? . . . Ọ bụ onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ, onye na-eme ezi omume, onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.”Abụ Ọma 15:1, 2.

URU Ọ BARA: Ịkwụwa aka ọtọ na-amasị ọtụtụ ndị. Ma, gịnị ka ụfọdụ ndị na-eme ma ha chọpụta na o nweghị onye ga-ejide ha ma ha gwuo wayo ma ọ bụ were ihe na-abụghị nke ha? Ọ bụ ụdị ndị ha bụ n’eziokwu ga-ekpebi ihe ha ga-eme.

E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Raquel. Ọrụ ya bụ ịzụrụ ụlọ ọrụ ha ihe. O kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị na-ere ahịa gwara m na ọ bụrụ na m na-agba ha aka ahịa, ha ga na-enye m ego ha kwesịrị ịna-esepụrụ ụlọ ọrụ anyị. Ma, echetara m ihe Baịbụl kwuru gbasara ịkwụwa aka ọtọ ma gwa ha na achọghị m. Mgbe onye m na-arụrụ ọrụ nụrụ ihe a merenụ, ọ tụkwasịkwuru m obi.”

A sị na Raquel kwetara ihe a ha kwuru, ọ gaara enwe ego. Ma, gịnị ga-eme ma onye ọ na-arụrụ ọrụ chọpụta ihe merenụ? Ì chere na ọ gaghị achụ ya n’ọrụ? Onye ọzọ ọ̀ ga-ekwe iwe ya n’ọrụ ma ọ chọpụta na ọ naghị akwụwa aka ọtọ? Ihe ka ya mkpa bụ inwe aha ọma na ime ihe na-agaghị enye akọnuche ya nsogbu. Ilu 22:1 kwuru, sị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu; amara dị mma karịa ọbụna ọlaọcha na ọlaedo.”

Onye Jessie na-arụrụ ọrụ tụkwasịrị ya obi n’ihi na ọ na-akwụwa aka ọtọ

Onye ọzọ na-akwụwa aka ọtọ bụ Jessie. Àgwà ọma ọ na-akpa mere ka onye ọ na-arụrụ ọrụ tụkwasị ya obi. Olee uru ọ baara ya? E buliri ya n’ọkwá, nyekwuo ya ohere ịna-eme ihe ụfọdụ ọ chọrọ. N’ihi ya, o nwekwuru oge ya na ndị ezinụlọ ya ga-eji na-anọrị, nwekwuokwa ohere ọ ga-eji na-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke.

Ndị ụfọdụ chọọ iwe ndị mmadụ n’ọrụ, ha na-aga chọwa ndị ha ma na ha na-akwụwa aka ọtọ. Dị ka ihe atụ, manịja otu ụlọ ọrụ dị na Filipinz degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’obodo ahụ akwụkwọ ozi. O kwuru ka Ndịàmà Jehova tinye akwụkwọ ka o wee ha n’ọrụ. O kwuru, sị: “Ha na-arụsi ọrụ ike, na-akwụwa aka ọtọ, jirikwa obi ha niile na-arụ ọrụ.” Ọ bụ Jehova Chineke ka e kwesịrị ikele n’ihi na ọ bụ ya na-akụziri anyị ka anyị ‘kpọọ ihe ọjọọ asị, hụkwa ezi ihe n’anya.’—Emọs 5:15.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.

TETA!

Àgwà Ndị Na-abara Anyị Uru

Ọtụtụ ndị na-asị na mmadụ kwesịrị ime ihe ọ bụla obi ya gwara ya. Ọ̀ bụ otú o kwesịrị ịdị? Gụọ àgwà ndị Baịbụl chọrọ ka anyị na-akpa.