Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Jenụwarị 2015

 ISIOKWU TETA! A

Ihe Na-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ

Ihe Na-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ

“Obi ga na-adị m ụtọ ma m lụhaala di, mụta ụmụ.”

“Obi ga na-adị m ụtọ ma m biri n’ụlọ nke m.”

“Obi ga na-adị m ụtọ ma m nweta ezigbo ọrụ.”

“Obi ga-adị m ụtọ ma . . .”

Ì CHETỤLA ụdị ihe a? Mgbe i nwetara ihe ahụ bụ́ mkpa gị, ị̀ ka na-enwe obi ụtọ, ka ihe ahụ ọ̀ kwụsịrị ime gị obi ụtọ ka oge na-aga? N’eziokwu, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị nweta ihe anyị chọrọ, ma ihe ahụ na-emecha gbụ anyị. N’ihi ya, ihe na-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ abụghị ihe onye ahụ nwere ma ọ bụ ihe ndị o merela ná ndụ. Otú ahụ ọ bụ ihe dị iche iche na-eme ka ahụ́ sie anyị ike ka ọtụtụ ihe si eme ka anyị na-enwe ezigbo obi ụtọ.

Anyị niile dị iche iche. Ihe mere gị obi ụtọ nwere ike ọ gaghị eme onye ọzọ obi ụtọ. Ka anyị na-eto, ihe ndị na-emebu anyị obi ụtọ nwere ike ghara ịna-emezi anyị obi ụtọ. Ma, a chọpụtala na e nwere ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ nọgide na-enwe obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, ihe mmadụ nwere iju ya afọ, enwereghị ndị ọzọ anyaụfụ, ịhụ ndị ọzọ n’anya nakwa ịna-eche echiche nke ọma. Ka anyị tụlee ihe mere ihe ndị a ga-eji mee ka anyị nwee obi ụtọ.

 1. NWEE AFỌ OJUJU

Eze Sọlọmọn kwuru na “ego bụ ihe nchebe.” Ma, o kwukwara, sị: “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ. Nke a kwa bụ ihe efu.” (Ekliziastis 5:10; 7:12) Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ọ pụtara na n’agbanyeghị na ego na-enyere anyị aka igbo mkpa, anyị ekwesịghị ịdị anyaukwu n’ihi na ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-enwe afọ ojuju. Eze Sọlọmọn gbara mbọ ka ọ mata ma ego na akụnụba hà na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ọ sịrị: “Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla anya m chọrọ nke m na-enyeghị ya. Ọ dịghị ụdị aṅụrị ọ bụla m gbochiri obi m inwe.”—Ekliziastis 1:13; 2:10.

Eze Sọlọmọn rụrụ ọtụtụ ụlọ na ọtụtụ ebe mara mma a na-anọ atụrụ ndụ, nweekwa ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi n’ihi na ọ bụ ọgaranya ngada. Ihe ọ bụla ọ chọrọ, ọ na-enweta ya. Ma, gịnị ka ọ mụtara? Ihe ndị ahụ niile o nwere mere ya obi ụtọ, ma obi ụtọ ahụ adịteghị aka. Ọ sịrị na “ihe niile bụ ihe efu” nakwa na ‘ọ dịghị ihe ọ bụla bara uru.’ O mechadịrị kpọọ ndụ asị. (Ekliziastis 2:11, 17, 18) N’eziokwu, Sọlọmọn mụtara na mmadụ ịkpakọba akụnụba anaghị eme ka onye ahụ nwee afọ ojuju. *

Ihe a Sọlọmọn kwuru na nchọpụta ndị e merela n’oge anyị a hà na-ekwu otu ihe? Otu akwụkwọ kwuru gbasara ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ kwuru na onye kpatahaala ihe ọ ga-eri, ego ndị ọzọ na-abatazi ya n’aka adịchaghịzi mkpa iji nwee afọ ojuju. A chọpụtakwala na mmadụ agaghị enwe obi ụtọ ma ọ na-achụ akụnụba ọnwụ ọnwụ ma leghara ihe ndị dị mkpa ná ndụ anya, dị ka ihe ndị gbasara ofufe Chineke.

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya, ka unu nọ na-enwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ugbu a.”Ndị Hibru 13:5.

2. ENWELA ANYAỤFỤ

Obi anaghị adị onye anyaụfụ mma ma ọ hụ ihe ndị ọzọ nwere yanwa na-enweghị. Ọ na-achọkwa inweta ihe ahụ. Anyaụfụ na-eji nwayọọ nwayọọ amalite. Ọ na-emekwa ka mmadụ ghara ịna-enwe obi ụtọ. Olee otú anyaụfụ si amalite? Olee otú anyị ga-esi mata ma ànyị na-enwere ndị ọzọ anyaụfụ? Oleekwanụ otú anyị ga-esi zere ya?

Otu akwụkwọ a ma ama kwuru na ndị ndị mmadụ na-enwere anyaụfụ na-abụkarị ndị ha na ha hà, dị ka ndị ọgbọ ha ma ọ bụ ndị ha na ha na-azụ otu ụdị ahịa ma ọ bụ ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ. Dị ka ihe atụ, onye na-ere ose agaghị enwewere dọkịta anyaụfụ. Ma, o nwere ike inwere onye ọzọ na-ere ose anyaụfụ.

Ihe mere na Peshia n’oge ochie ga-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe a. Ndị nwere agba n’ọchịchị obodo ahụ enwereghị eze Peshia anyaụfụ, kama onye ha nweere anyaụfụ bụ Daniel. Otú ha si na-atajiri ya anya mere ha ji kpaa nkata igbu ya. Ma, nkata ahụ kụrụ afọ n’ala. (Daniel 6:1-24) Akwụkwọ ahụ anyị kwuru okwu ya kwukwara na onye ọ bụla ekwesịghị ichefu na anyaụfụ nwere ike ime  ka mmadụ mee ihe na-adịghị mma. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị jirila merụọ ndị ọzọ ahụ́. *

Anyaụfụ na-eme ka ihe kwesịrị ịna-eme mmadụ obi ụtọ ghara ime ya obi ụtọ

Olee otú anyị ga-esi mata ma ànyị na-enwere ndị ọzọ anyaụfụ? Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: ‘Obi ọ̀ na-adị m mma ma m hụ na ihe na-agara onye ọgbọ m nke ọma? Ọ̀ na-ewute m ma ọ bụrụ na ihe agaraghị nwanne m ma ọ bụ nwa klas anyị ma akwụkwọ ma ọ bụ onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nke ọma?’ Ihe ọ bụla ị zara ga-egosi ma ị̀ na-enwere ndị ọzọ anyaụfụ. (Jenesis 26:12-14) Otu akwụkwọ kwuru gbasara otú ụmụ mmadụ si akpa àgwà sịrị na e nweghị ihe ọma e meere onye anyaụfụ na-eme ya obi ụtọ. Ihe ndị kwesịrị ịna-eme ya obi ụtọ anaghị eme ya obi ụtọ n’ihi na ihe anaghị atụ ya n’anya.

Ịdị umeala n’obi na inwe obiọma ga-eme ka anyị ghara ịna-enwere ndị ọzọ anyaụfụ. Àgwà abụọ a ga-emekwa ka anyị ghara ịna-ewere ha iwe maka otú ha si akpa àgwà. Baịbụl gwara anyị ka anyị “ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ” ka anyị.—Ndị Filipaị 2:3.

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Ka anyị ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, na-akpali ịsọ mpi n’etiti onwe anyị, na-enwere ibe anyị anyaụfụ.”Ndị Galeshia 5:26.

3. HỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA

Otu akwụkwọ kwuru gbasara otú ndị mmadụ si akpa àgwà sịrị na ihe kacha eme ka ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ bụ ha na ndị ọzọ ịdị ná mma, ọ bụghị ọrụ ha, ego ha na-akpata, ebe ha bi ma o bụ ahụ́ ike. Ihe ọ pụtara bụ na anyị chọọ ịna-enwe obi ụtọ, anyị ga-ahụ ndị ọzọ n’anya, hanwa ahụkwa anyị n’anya. Otu onye so dee Baịbụl kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ.’—1 Ndị Kọrịnt 13:2.

E nweghị onye na-agaghị ahụli mmadụ n’anya, e nweghịkwa onye a na-agaghị ahụli n’anya. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Vanessa si n’ụlọ ha gbapụ mgbe ọ dị afọ iri na anọ. Ihe mere o ji gbapụ bụ na nna ya bụ́ onye aṅụrụma na-eti ya ihe mgbe niile. Vanessa gara biri n’ụlọ ndị ọzọ, mechaakwa gaa biri n’otu ebe ndị na-enweghị ụlọ na-ebi. Mgbe ọ nọ ebe ahụ, ọ rịọrọ Chineke ka o nyere ya aka. Chineke zara ya ekpere mgbe ndị na-elekọta ebe ahụ zigara ya ka ọ gaa biri na nke otu ezinụlọ na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ndị ezinụlọ ahụ nwere ogologo ntachi obi na obiọma n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 13:4) Otú ndị ezinụlọ ahụ si emeso ya nakwa ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl nyeere ya aka ịgbanwe otú o si ele ndụ anya, ọ malitekwara inwe obi ụtọ. O kwuru na ya malitekwara ime nke ọma n’ụlọ akwụkwọ.

N’agbanyeghị na Vanessa echefubeghị ihe papa ya mere ya, ọ hụrụ di ya na ụmụ ya abụọ n’anya ugbu a.

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”Ndị Kọlọsi 3:14.

 4. MỤTA ỊNA-EDI IHE

E nweghị onye na-enweghị nsogbu ná ndụ. Baịbụl kwuru na e nwere ‘oge ịkwa ákwá na oge ịkwa ákwá arịrị.’ (Ekliziastis 3:4) Ọ bụrụ na anyị amụta idi ihe, ọ gaghị esiri anyị ike ịna-edi nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Ka anyị tụlee akụkọ ụmụ nwaanyị abụọ aha ha bụ Carol na Mildred.

Carol na-arịa ọrịa shuga. Ọ naghị eku ume nke ọma ma o hiwe ụra, ọkpụkpụ azụ na-enyekwa ya nsogbu. Ọrịa anya emeekwala ka anya aka ekpe ya kpọọ. N’agbanyeghị ihe a niile, ọ sịrị: “Anaghị m ekwe ka obi na-ajọ m njọ mgbe niile. Ma, e nwere mgbe m na-eche ụwa m. M chetụ obere, mụ akwụsị. M na-ekele Chineke maka ihe ndị m ka nwere ike ime, karịchaa, ịna-enyere ndị mmadụ aka.”

Mildred nwekwara ọrịa ndị ọ na-arịa. Ọ na-arịa ogbu na nkwonkwo, kansa ara nakwa ọrịa shuga. Ma dị ka Carol, ọ naghị echegbu onwe ya. Ọ sịrị: “M hụrụ ndị mmadụ n’anya, na-akasikwa ha obi ma ha na-arịa ọrịa. Ime otú ahụ na-enyere m aka idi ụwa m. N’eziokwu, achọpụtala m na anaghị m echegbu onwe m ma m kasiwe ndị ọzọ obi.”

Ịkasi ndị ọzọ obi na-eme Carol na Mildred obi ụtọ

Ọ bụ eziokwu na Carol na Mildred na-agba mbọ ilekọta onwe ha, mkpa ha bụ ka ha ghara ịna-echegbu onwe ha nakwa ka ha jiri oge ha na-eme ihe bara uru. N’ihi ya, obi ụtọ ha na-enwe enweghị atụ. Otú ha si edi nsogbu ha na-enyekwara ndị ọzọ ụwa na-esiri ike aka idi nke ha.

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Obi ụtọ na-adịrị onye na-atachi obi n’ọnwụnwa, n’ihi na mgbe a nwapụtara ya, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ.”Jems 1:12.

Amamihe dị na Baịbụl bụụrụ “ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ, ndị na-ejidesikwa ya aka ike ka a ga-akpọ ndị obi ụtọ.” (Ilu 3:13-18) Ọ ga-adị mma ka ị mụọ Baịbụl ka i wee jiri anya gị hụ uru amamihe dị na ya bara. A si ka ekwuwe, Chineke, bụ́ onye Baịbụl si n’aka ya, bụ “onye obi ụtọ.” Ọ chọkwara ka ị na-enwe obi ụtọ.—1 Timoti 1:11.

^ para. 11 Ihe a e kwuru gbasara Sọlọmọn dị n’Ekliziastis 2:1-11.

^ para. 17 Onye ọzọ ndị mmadụ meere anyaụfụ bụ Jizọs Kraịst. Mak 15:10 kwuru na “ọ bụ anyaụfụ mere ndị isi nchụàjà ji nyefee” Jizọs ka e gbuo ya.