Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! SEPTEMBA 2014

 IHE BAỊBỤL KWURU

Nrọ Ndị Si n’Aka Chineke

Nrọ Ndị Si n’Aka Chineke

È nwetụla mgbe Chineke gwara ụmụ mmadụ okwu ná nrọ?

“[Onye amụma Chineke bụ́] Daniel rọrọ nrọ . . . mgbe o dina n’elu ihe ndina ya. O wee dee nrọ ahụ n’akwụkwọ n’oge ahụ. Ọ kọrọ ihe niile ọ hụrụ.”—Daniel 7:1.

IHE BAỊBỤL KWURU

E nwere ọtụtụ ụzọ Chineke si agwa ndị mmadụ okwu. N’oge e dere Baịbụl, o nwere mgbe ọ gwara ndị mmadụ okwu ná nrọ. Ma, nrọ ndị ahụ abụghị ụdị nrọ ndị na-enweghị isi ndị mmadụ na-arọ kwa ụbọchị. Nrọ ndị si n’aka Chineke na-edo anya. Ọ naghị abụ otú ọ masịrị onye, ya esi kọwaa ha. Dị ka ihe atụ, ná nrọ Daniel onye amụma rọrọ, ọ hụrụ anụ ọhịa dị iche iche ndị nọchiri anya alaeze dị iche iche malite na Babịlọn ruo ná ndị nke na-achị taa. (Daniel 7:1-3, 17) Ná nrọ ka Chineke gwara Josef ka ọ kpọrọ Meri na Jizọs gbaga n’Ijipt. Ọsọ ahụ ha gbara mere ka Eze Herọd ghara igbu Jizọs. Mgbe Herọd nwụrụ, Chineke si ná nrọ gwa Josef na ọ nwụọla, gwakwa ya ka ọ kpọrọ Meri na Jizọs laghachi Izrel.—Matiu 2:13-15, 19-23.

 Chineke ọ̀ na-agwa ndị mmadụ okwu ná nrọ taa?

“Unu agabigala ihe e dere ede.”—1 Ndị Kọrịnt 4:6.

IHE BAỊBỤL KWURU

Nrọ ndị e dere na Baịbụl so n’ihe ndị Chineke mere ka ụmụ mmadụ mara. E dekwara ihe ndị ahụ na Baịbụl. Gbasara ihe ndị dị na Baịbụl, 2 Timoti 3:16, 17 kwuru, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.”

Otú Baịbụl si kwadebe anyị n’ụzọ zuru ezu bụ na o mere ka anyị mara ihe niile anyị kwesịrị ịma banyere Chineke, àgwà ya, ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme, nakwa ihe mere o ji kee ụwa. N’ihi ya, Chineke anaghịzi agwa ụmụ mmadụ okwu ná nrọ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu na ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme, anyị ekwesịghị ‘ịgabiga ihe e dere’ na Baịbụl. Ị manụ na ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ niile ka Baịbụl ruru aka. Ha niile nwekwara ike ịmụ ihe ndị Chineke gwara anyị na Baịbụl, ma nrọ ndị e dere na ya.

Gịnị mere ị ga-eji tụkwasị nrọ na ọhụụ ndị dị na Baịbụl obi?

“Ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.”—2 Pita 1:21.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọtụtụ n’ime nrọ ndị mmadụ rọrọ e dere na Baịbụl na ọhụụ ndị dị na Baịbụl bụcha amụma ka e ji ha buo. Amụma ndị ahụ na-enyere anyị aka ịhụ na ndị dere Baịbụl na-ekwu eziokwu nakwa na Baịbụl si n’aka Chineke. Ì kwetara na ihe ndị ha dere bụ eziokwu? Ka anyị tụlee otu ihe atụ na Daniel 8:1-7. Daniel dere ya ná ngwụcha ọchịchị Babịlọn.

Amụma ahụ kwuru na e nwere otu mkpi nke ga-akwatu otu ebule, merie ya. Daniel anọghị chewe ihe ọhụụ ahụ nwere ike ịpụta. Kama, mmụọ ozi Chineke gwara ya, sị: “Ebule ahụ . . . nke nwere mpi abụọ na-anọchi anya ndị eze Midia na Peshia. Mkpi ahụ gbajuru ajị n’ahụ́ na-anọchi anya eze Gris.” (Daniel 8:20, 21) Ihe ndị mere eme gosiri n’eziokwu na Midia na Peshia meriri ndị Babịlọn ghọzie alaeze ukwu. Ma, mgbe ihe dị ka narị afọ abụọ gara, Alegzanda Onye Ukwu bụ́ onye Gris meriri Midia na Peshia. Otú amụma a si mezuo ka amụma ndị ọzọ na nrọ ndị dị na Baịbụl sikwa na-emezu. Ihe a so n’ihe ndị mere Baịbụl ji dị iche n’akwụkwọ ndị ọzọ ndị mmadụ na-ewere na ha dị nsọ. O mekwara ka anyị tụkwasị ihe ndị dị na Baịbụl obi.