Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Septemba 2014

 ISIOKWU TETA! A

Olee Otú Ndị Mmadụ Ga-esi Na-adị n’Udo?

Olee Otú Ndị Mmadụ Ga-esi Na-adị n’Udo?

Jọn bụ onye agbata obi Ben. * Ha abụọ dịkwa n’udo. Ma, otu ụbọchị, ndị enyi Ben bịara oriri na nkwari n’ụlọ ya, ha megidere mkpọtụ ruo ime abalị. Mgbe Jọn gwara Ben na mkpọtụ ha na-eme karịrị akarị, iwe were ya. Ha baara ibe ha mba. Mgbe e mechara, ha kwụsịrị ighe ibe ha ọnụ.

ỤDỊ ihe a na-emekwa ọtụtụ ndị. Mmadụ abụọ nwee nghọtahie, ha na-ewesakarị ibe ha iwe. Onye nke ọ bụla nwekwara ike ịna-ekwu na ọ bụ onye nke ọzọ chọrọ okwu. Ọ bụrụ na ha ekpezighị, ha nweziri ike ịghọ ndị iro.

O nwere ike ịbụ na ụdị ihe a emetụla gị. O nwekwara ike ịbụ na otú ihe ahụ si mee adịghị gị mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ n’ime anyị chọrọ ka anyị na ndị enyi anyị na ndị agbata obi anyị na-adị n’udo. Ma, olee otú anyị na ha ga-esi na-adị n’udo mgbe ọ bụla anyị na ha nwere nghọtahie? Ànyị nwere ike ichefu ihe ọjọọ mmadụ mere anyị ma gbaghara ya? Ànyị nwere ike iji obiọma dozie ihe na-esere anyị na ndị ọzọ?

Chegodị ihe kpataara Jọn na Ben esemokwu. Ọ bụ ihe ndị a: (1) Ben chọrọ Jọn okwu, (2) otú Jọn si gwa Ben okwu adịghị ya mma, (3) ha abụọ were iwe, (4) o nweghị onye n’ime ha chọrọ ịgbaghara ibe ya.

Mgbe e mechara, ha chebakwuuru ihe ha mere echiche. Ha kpeziri, dịwakwa n’udo. Gịnị nyeere ha aka? E nwere ihe ọtụtụ ndị na-eme ma ha na ndị enyi ha see okwu. Ihe ahụ na-eme ka adịm ná mma ha bụrụ a kwaa a kwụrụ. Ọ bụ ihe ahụ ka Ben na Jọn mere.

Ebe ị ga-ahụ ihe ndị ahụ nyeerela ọtụtụ ndị enyi aka bụ na Baịbụl. Ọ bụ ya bụ akwụkwọ a kacha agụ n’ụwa niile. Ọ na-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ndị ga-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo. Ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ bụ nghọta, amamihe, obiọma, ịhụnanya, na ndidi.—Ilu 14:29; 1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.

Otú Jọn na Ben si mechaa kpezie na-egosi otú Baịbụl si enyere ndị mmadụ aka ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo. Baịbụl enyekwarala  ọtụtụ ndị ọzọ aka, ma ndị na-akpabu àgwà ọjọọ na-ekweghị ha nkwụsị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl nyeere otu nwoke bi n’Ọstrelia aha ya bụ Robert aka ya akwụsị iwe iwe ọkụ. O nyekwaara nwoke ọzọ bụ onye Timọ-Lest aha ya bụ Nelson aka ya na onye ọ kpọburu asị abụrụ enyi. Olee otú Baịbụl si nyere Robert na Nelson aka? Ka anyị hụ ihe ha kwuru mgbe ndị dere akwụkwọ a gbara ha ajụjụ ọnụ.

AJỤJỤ ỌNỤ NKE MBỤ

ROBERT, biko, gwa anyị banyere onwe gị.

Mgbe m na-eto, udo adịghị n’ụlọ anyị. Dị ka ihe atụ, papa m bụ onye iwe ọkụ. E nweghị mgbe ọ naghị eti m ihe. Oge ụfọdụ, o tichaa m ihe, ọbara eju m ahụ́, anaghịkwa m ama onwe m. O meziri ka m na-ewe iwe ọkụ, na-alụkwa ọgụ aghara aghara. Mgbe m dị afọ iri na isii, e tinyere m n’ụlọ akwụkwọ ebe a na-enyere ụmụaka ndị na-akpa àgwà ọjọọ aka. Anọrọ m ebe ahụ afọ abụọ. M mechara meta ihe e ji tụọ m mkpọrọ. Mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, m kwagara Ọstrelia, buru n’obi na ndụ m ga-agbanwe.

Robert na-ewebu iwe ọkụ, na-alụkwa ọgụ. O nwekwara mgbe ọ gara mkpọrọ

Ebe ahụ ị kwagara ò mere ka ị gbanwee?

Ọ bụghị ebe ahụ mere ka m gbanwee, kama, ọ bụ ihe m mụtara na Baịbụl mgbe mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ ihe. Ma, m ka na-agba mbọ ka m kwụsị ịna-ewe iwe ọkụ. Oge ụfọdụ, ike ụwa na-agwụ m, mụ ana-eche na m gaghị agbanweli. Otu ụbọchị, m nọdụrụ ala chebara ihe dị n’Ilu 19:11 echiche. Ebe ahụ sịrị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.” Ebe ọ bụ nghọta na-eme ka mmadụ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, m malitere iche ihe na-eme ka anyị kwuo ihe ụfọdụ ma ọ bụ mee ihe ụfọdụ. Ka oge na-aga, m malitere ịna-enwekwuru ndị mmadụ ndidi, na-agbagharakwa ha, na-aghọtakwu ihe mere ha ji eme ụfọdụ ihe.

Gwatụnụ anyị otú ihe a Baịbụl kwuru si nyere gị aka.

Otu ụbọchị, m mere ihe were enyi m nwoke nnukwu iwe, ya anọrọ n’ihu ndị ọzọ baara m ezigbo mba. Otú o si baa mba ahụ were m iwe. Ma, mgbe m chetara na Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara iji “ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ,” m rịọrọ ya mgbaghara ozugbo. (Ndị Rom 12:17) M mechara gakwuru ya mgbe obi jụụrụ ya, ya agwa m na ya na nwunye ya sere okwu. Anyị kpeziri, ya emechaa zụtara m renkootu. M nọ na-eche ihe gaara eme ma a sị na ihe a mere mgbe m na-agbanwebeghị.

Olee otú unu si edozi esemokwu n’ụlọ unu?

Mụ na nwunye m mụtara nwa nwoke dị afọ iri abụọ ugbu a. Anyị na-enwekwa nghọtahie otú ahụ ezinụlọ ndị ọzọ si enwe. Ma, amụtala m ọtụtụ ihe na Baịbụl, mụtakwa ihe mere m ji kwesị ịna-arịọ mgbaghara. Ọ bụrụ na anyị na-eji obi anyị niile arịọ mgbaghara, ọ ga-enyere anyị aka ka anyị na ndị ọzọ ghara ịna-ese okwu.

 AJỤJỤ ỌNỤ NKE ABỤỌ

NELSON, ihu bụ gị ọchị ọchị, gị na ndị mmadụ na-adịkwa ná mma. Ma, ọ̀ kwa e nwere mgbe gị na ndị mmadụ na-anaghị adị n’udo?

Ee. Mgbe m na-eto eto, m nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke na-agba ndị ọchịchị mgba okpuru. E nwere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ na-alụso ndị òtù anyị ọgụ. Akpọkwara m ndị niile nọ n’òtù ahụ asị. M gara mụọ karat ka m nwee ike ịna-alụ ọgụ nke ọma. Onye chọhaala m okwu, etikaa m ya ahụ́.

Nelson bụbu onye òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-agba ndị ọchịchị mgba okpuru

Gịnị mere i ji gbanwee?

Mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, mụ ana-emekwa ihe m mụtara. E nwere amaokwu Baịbụl abụọ kacha metụ m n’obi. Nke mbụ bụ Matiu 7:12, ọ sịrị: “Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” Amaokwu nke abụọ bụ Matiu 22:39. Ebe ahụ sịrị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” M hụrụ otú Ndịàmà Jehova ndị ahụ si hụ ndị mmadụ n’anya n’agbanyeghị ebe ha si. M chọrọ ịna-eme ka ha. M mụtakwara ịna-ahụ ndị mmadụ n’anya. Otú m si emezi tụrụ ndị ma m n’anya, ha anaghịzi atụ m ụjọ.

È nwetụla mgbe i mere otú i si emebu?

Ee, ọ na-esiri m ike ijide onwe m n’ụlọ m. Dị ka ihe atụ, o nwere ụbọchị iwe were m, mụ etie nwunye m ihe. Nwunye m mechara gbaghara m. Ma, ihe a m mere wutekwara m, mụ ekpebie na mụ ga-agbasi mbọ ike na-ejide onwe m.

I kwuru na ndị mmadụ anaghị atụzi gị ụjọ. Kọọrọ anyị ihe mere nke gosiri na a naghịzi atụ gị ụjọ.

Otu ụbọchị, m hụrụ otu nwoke nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ha na ndị òtù m nọbu na ya na-alụ ọgụ. Aha nwoke ahụ bụ Augusto. Mgbe ọ hụrụ m, o kweghị abịa m nso. M kelere ya nke ọma, gwa ya ka anyị chefuo ihe ọ bụla na-esere anyị. M gwakwara ya ka ọ bịa n’ụlọ m. Mgbe ọ bịara n’ụlọ m hụ na mụ agbanweela, o juru ya anya. Ọ malitekwara ịmụ Baịbụl. Augusto bụzi enyi m, bụrụkwa Onyeàmà Jehova ibe m.

 “Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”

Ihe na-akpata esemokwu karịrị akarị, ọ bụghịkwa mmadụ niile ga-achọ ka gị na ha dịrị n’udo. Ma, Baịbụl gwara anyị ihe anyị ga-eme. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”—Ndị Rom 12:18.

Akụkọ mmadụ abụọ a anyị kọrọ n’isiokwu a na-egosi na ime ihe Baịbụl kwuru bara uru. Ọ na-enyere ndị mmadụ aka ịgbanwe àgwà ọjọọ ọ bụla “gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’obi ha. (2 Ndị Kọrịnt 10:4) Ọ bụ ya mere Ilu 3:17, 18 ji kwuo banyere amamihe dị na Baịbụl, sị: “Ụzọ ya bụ ụzọ obi ụtọ, okporo ụzọ ya niile bụkwa udo. Ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ, ndị na-ejidesikwa ya aka ike ka a ga-akpọ ndị obi ụtọ.”

Nelson na Augusto bụzi ezigbo enyi

Ị̀ chọrọ ka gị na ndị mmadụ na-adị n’udo, gị ana-enwekwa obi ụtọ? Ị̀ chọrọ ka gị na enyi gị ghara itisa ma unu segodị okwu? Ọ bụrụ na ọ bụ ihe ị chọrọ, Baịbụl ga-enyere gị aka ma i mee ihe o kwuru.

^ para. 3 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ

Gịnị Bụ Ọmụmụ Baịbụl?

Chọpụta azịza ajụjụ a na-ajụ gbasara otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl.