Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Mee 2014

 ISIOKWU TETA! A | ÀNỌ M NDỤ EME GỊNỊ?

Olileanya Dị

Olileanya Dị

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”ABỤ ỌMA 37:11.

Baịbụl kwuru na ndụ ụmụ mmadụ ‘jupụtara ná nsogbu.’ (Job 14:1) Taa, e nweghị onye nọ n’ụwa ga-asị na ihe niile dịịrị ya mma. Ma, e nwere ndị ike ụwa gwụrụla, ya adị ha ka ha enweghịzi olileanya nakwa na ihe agaghị adịkwara ha mma ọzọ. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, cheta na Baịbụl kwuru na olileanya dị. O kwuru na ihe ga-adịrị ma gịnwa ma ụmụ mmadụ niile mma. Dị ka ihe atụ:

  • Baịbụl kwuru na Jehova Chineke buuru anyị niile ihe ọma n’obi.—Jenesis 1:28.

  • Jehova kwekwara nkwa na ya ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs.—Aịzaya 65:21-25.

  • Obi sikwara anyị ike na ọ ga-eme ihe ahụ o kwere ná nkwa. Mkpughe 21:3, 4 kwuru, sị:

    “Ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”

Ihe a Baịbụl kwuru abụghị nrọ. Jehova Chineke ga-emezurịrị ihe ahụ o kwuru, ọ na-agụsi ya agụụ ike ime ya, o nwekwara ike ọ ga-eji eme ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke ga-eme ihe niile o kwere anyị ná nkwa. Nkwa ahụ mere ka anyị mara na e nwere ihe anyị nọ ndụ eme.

IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Ọ bụrụgodị na nsogbu ụwa a mere ka ike ụwa gwụ gị, nkwa Baịbụl kwere anyị nwere ike inyere gị aka ịna-edi nsogbu ndị ahụ.

IHE I NWERE IKE IME: Chọpụta ihe Baịbụl kwuru na Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu. Ndịàmà Jehova ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị ahụ. I nwere ike ịjụ ndị nke nọ n’obodo unu ma ọ bụ gị agaa n’adres Ịntanet bụ́ www.jw.org/ig. *

^ para. 11 Ihe i nwere ike ime: Gaa n’adres Ịntanet bụ́ www.jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa Ọ́BÁ AKWỤKWỌ. N’ebe ahụ e dere chọwa, denye “ịda mbà n’obi” ma ọ bụ “mmadụ igbu onwe ya,” ị ga-ahụ ihe ga-enyekwuru gị aka.

GỤKWUO GBASARA YA

Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma M Daa Mbà n’Obi?

E nwere ihe atọ Chineke na-enye ndị dara mbà n’obi ga-enyere ha aka maka nsogbu ha.

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gụọ banyere ozi ọma si n’aka Chineke, ihe mere ozi ahụ ji dị mkpa na ihe i kwesịrị ime.