Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! MEE 2014

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Ị Hụwa Ihe Ị Na-atụghị Anya Ya n’Ebe Di Gị Nọ

Ị Hụwa Ihe Ị Na-atụghị Anya Ya n’Ebe Di Gị Nọ

IHE BỤ́ NSOGBU

Tupu gị na di * gị alụọ, unu abụọ bụ nnu na mmanụ. Ma ugbu a, obi na-agbawa gị maka na unu bụzi òké na nwamba.

E nwere ihe unu ga-eme ka unu biwekwa n’udo. Ma, ka anyị buru ụzọ kwuo banyere ihe nwere ike ịbụ ya kpatara nsogbu unu.

IHE KPATARA YA

Ihe agbanweela. Ịchọ ihe ụmụaka ga-eri, ilekọta ụmụaka na imeta ndị di gị mma nwere ike ime ka gị na di gị na-enwe nghọtahie. Ihe ndị ọzọ unu na-atụghị anya ya nwekwara ike ịkpatara unu nsogbu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ihe esiwere unu ike ma ọ bụkwanụ na e nwere onye ikwu unu na-arịa ọrịa.

O yiri ka unu agaghị ekpezili. Mgbe gị na di gị na-alụbeghị, ihe ọ bụla o mere gị anaghị adị gị ka ihe, ị na-agbaghara ya. Ma ugbu a unu lụrụ, ị chọpụtala na otú unu si akparịta ụka, otú unu si azụ ihe nakwa otú unu si ekpezi ma unu see okwu amasịghị gị. Ihe ndị ọ na-abụ ya mee mgbe mbụ ya adị gị ka o nweghị ihe o mere bụzi ihe na-esere unu okwu ugbu a.

Obi gị adịkwaghị n’ebe ọ nọ. Okwu ọjọọ di gị gwarala gị, ihe ndị o mere gị, na okwu ndị unu sere unu na-etinyebeghị ọnụ nwere ike ime ka ị na-anọrọ onwe gị. Nke ka njọ bụ na o nwekwara ike ime ka obi gị dịrị na nwoke ọzọ.

Ọ bụghị ihe ị tụrụ anya ya ka ị na-ahụ. Tupu ụfọdụ alụọ di, ha na-ele onye chọrọ ịlụ ha anya ka mmụọ ozi nakwa na e nweghị onye ọzọ dị ka ya. Iche otú ahụ nwere ike ime nwaanyị a na-alụ ọhụrụ obi ụtọ, ma, ụdị echiche a na-akpatakarị nsogbu. Ha nwehaala nsogbu ọ bụla, ya ahụ na otú akị ilu si ada n’ọnụ abụghị otú o si atọ. Obi ya ga na-agwazi ya na ọ bụghị onye a ka ya kwesịrị ịlụ.

 IHE I NWERE IKE IME

Na-echeta ihe dị mma di gị na-eme. Gbalịa megodị ihe a: Depụta àgwà atọ dị mma di gị na-akpa. Debe ihe ahụ i dere n’ebe ị ga na-ahụ ya mgbe niile. Ị nọtụ nọtụ, gị ele ya ka i cheta ihe mere i ji lụọ ya. Ọ bụrụ na ị na-echeta àgwà ọma di gị na-akpa, ọ ga-eme ka unu na-ebi n’udo, meekwa ka i nwee ike idi ihe ọ bụla o mere gị.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Rom 14:19.

Wepụtanụ oge unu ga-eji na-anọrị. O nwere ike ịbụ na tupu unu alụọ, unu na-ewepụtabu oge na-anọrị. Mgbe ahụ, ọ na-adị na-agụ gị agụụ ka unu nọrịa, unu na-ekwukwa oge unu ga-eji nọrịa. Ọ́ gaghị adị mma ka unu mewekwa ụdị ihe ahụ ugbu a? Wepụtanụ oge na-aga ebe naanị unu abụọ ga-anọ otú ahụ unu na-emebu. Ime otú ahụ ga-enyere unu aka ịhụkwu ibe unu n’anya, meekwa ka i nwee ike ịna-edi ihe ọ bụla o mere gị.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 5:18.

Gwa ya ihe o mere gị. Ọ bụrụ na di gị emee ihe na-adịghị gị mma ma ọ bụ kwuo ihe were gị iwe, ya abụrụ ihe ị ga-elegharali anya, i nwere ike ileghara ya anya. Ma, ọ bụrụ na ị gaghị elegharali ihe ahụ anya, wetuo obi gwa ya otú ihe ahụ o mere dị gị n’obi. Eburula ya iwe n’obi. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, gị na ya kwuo banyere ya n’ụbọchị ahụ.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Efesọs 4:26.

Ọ bụrụ na di gị emee ihe na-adịghị gị mma ma ọ bụ kwuo ihe were gị iwe, ì nwere ike ileghara ihe ahụ anya?

Ghọta na ọ bụghị ihe i chere ka o bu n’obi. O nwere ike ịbụ na ihe i bu n’obi abụghị ka ị kpasuo di gị iwe. Kọwaara ya ihe i bu n’obi, rịọkwa ya ka ọ gbaghara gị. Kwuzienụ ihe unu ga na-eme ka unu ghara ịna-akpasu ibe unu iwe. Ihe a Baịbụl kwuru ga-enyere unu aka. Ọ sịrị: “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.”—Ndị Efesọs 4:32.

Ghọta na unu nwere ike ise okwu. Baịbụl kwuru na ndị lụrụ di na nwunye “ga-enwe mkpagbu.” (1 Ndị Kọrịnt 7:28) Ọ bụrụ na ihe ọ bụla eseere unu okwu, ekpebila ozugbo na ọ bụghị ụdị onye a ka i kwesịrị ịlụ. Kama, gị na di gị gbalịa dozie ihe seere unu, ‘na-edikwaranụ ibe unu ihe ma na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.’ —Ndị Kọlọsi 3:13.

^ para. 4 Ihe e kwuru n’isiokwu a gbasakwara ụmụ nwoke ndị lụrụ nwaanyị.