Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Mee 2014

 IHE BAỊBỤL KWURU

Ịkpa Ókè Agbụrụ

Ịkpa Ókè Agbụrụ

Ebee ka agbụrụ dị iche iche si?

“Adam gụrụ nwunye ya Iv, n’ihi na ọ ga-aghọ nne nke onye ọ bụla dị ndụ.”—Jenesis 3:20.

IHE NDỊ ỌKACHAMARA NA-EKWU

Ngalaba òtù UN a na-akpọ UNESCO kwuru na mmadụ niile si otu ebe nakwa na ọ bụ otu nna mụrụ ha niile.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke kere otu nwoke na otu nwaanyị. Aha ha bụ Adam na Iv. Ọ sịrị ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.” (Jenesis 1:28) Ihe a Baịbụl kwuru na-egosi na ọ bụ Adam na Iv bụ nne na nna anyị mbụ. Ka ọtụtụ afọ gachara, Chineke ji iju mmiri mebie ụwa. Naanị mmadụ asatọ ka iju mmiri ahụ na-egbughị. Ha bụ Noa na nwunye ya na ụmụ ha nakwa ndị nwunye ha. Baịbụl kwuru na ọ bụ ụmụ Noa mụziri mmadụ niile.—Jenesis 9:18, 19.

 È nwere agbụrụ ka ibe ya?

“[Chineke sitere] n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.”—Ọrụ Ndịozi 17:26.

IHE ỤFỌDỤ NDỊ KWURU

Ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga, e nwere ndị malitere ikwu na agbụrụ ha ka ndị nke ọzọ. Dị ka ihe atụ, ndị Nazi kwuru na otú e si kee ha mere ka ha ka agbụrụ ndị ọzọ. Ma, ndị UNESCO kwukwara na ebe ọ bụ na mmadụ niile si otu ebe, e nweghị agbụrụ ka ibe ya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọrụ Ndịozi isi iri amaokwu iri atọ na anọ na iri atọ na ise kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” N’ihi ya, e nweghị onye kwesịrị ịna-ekwu na e nwere agbụrụ ka ibe ya.

Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gosikwara na anyị ekwesịghị ịna-eche na agbụrụ anyị ka agbụrụ ọzọ. Ọ sịrị: “Unu niile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Ọ rịọkwara Chineke ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịna-akpa ókè kama ka ha “dị n’otu.”—Jọn 17:20-23; 1 Ndị Kọrịnt 1:10.

È nwere mgbe a ga-akwụsị ịkpa ókè agbụrụ?

‘N’oge ikpeazụ, a ga-eme ka ugwu nke ụlọ Jehova guzosie ike, mba niile ga-enubakwa n’ime ya.’—Aịzaya 2:2.

IHE ỤFỌDỤ NDỊ CHERE

Otú ndị mmadụ si emesi ndị na-abụghị ndị agbụrụ ha ike na-eme ka ọtụtụ ndị na-ekwu na mbọ niile ndị ọchịchị na-agba ka ndị mmadụ ghara ịna-akpa ókè agbụrụ enweghị isi. Ụfọdụ ndị na-ekwukwa na o nweghị mgbe a ga-akwụsị ịkpa ókè agbụrụ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke agaghị agbachi ndị mmadụ nkịtị ka ha nọgide na-akpa ókè agbụrụ. Kama n’Alaeze ya, “ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile” ga-adị n’otu, na-efekwa ya. Ha ga-ahụkwa ibe ha n’anya. (Mkpughe 7:9) Alaeze Chineke abụghị ihe dị mmadụ n’obi. Kama, ọ bụ ọchịchị Chineke ga-eji gbanwee ụwa a, bụ́ ebe ọ chọrọ ka ndị mmadụ biri n’akpaghị ókè agbụrụ. *

^ para. 15 Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ isi nke atọ n’akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova biri ya.

GỤKWUO GBASARA YA

ỤLỌ NCHE

Olee Mgbe Ịkpọasị Na-agaghị Adịkwa n’Ụwa?

Akụkọ ndị mmadụ kọrọ na-egosi na Baịbụl na-enyere ndị mmadụ aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. Olee mgbe ịkpọasị ga-akwụsịcha?