Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Jenụwarị 2014

 ISIOKWU TETA! A

Àgwà Ndị Na-abara Anyị Uru

Àgwà Ndị Na-abara Anyị Uru

O nwere ụbọchị otu nwaanyị aha ya bụ Christina tụtụtara otu akpa ego juru n’ebe ọ na-arụ ọrụ. Ego ahụ karịrị ụgwọ ọnwa a ga-akwụ ya n’afọ iri abụọ. Ọ tụrụ ya n’anya ịhụ ụdị ego ahụ. Ebe ọ bụ na ọ ma onye nwe ya, gịnị ka ọ ga-eme? Ọ bụrụ gị, gịnị ka ị ga-eme? Ihe ọ bụla ị zara ga-egosi ụdị onye ị bụ, gosikwa ma ị̀ na-akwụwa aka ọtọ.

O nwere àgwà ndị ọ ga-abụ anyị na-akpa ndị mmadụ ana-ele anyị anya ọma ma na-akwanyere anyị ùgwù. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịgbaghara ndị mejọrọ anyị, ịkwụwa aka ọtọ, ịhụ ndị ọzọ n’anya, iji ndụ akpọrọ ihe, na ịrụ ahụ́ anyị ụka. Ọ bụ otú anyị si akpa àgwà ka ndị mmadụ ji ama otú anyị si ele ihe anya, ihe anyị ji kpọrọ ihe, otú anyị na ndị ọzọ si emekọrịta ihe nakwa otú anyị si azụ ụmụ anyị. N’agbanyeghị na ihe ga na-aga aga ma ndị mmadụ na-akpa ezigbo àgwà, ọtụtụ ndị anaghị akpa ezigbo àgwà.

ÀGWÀ ỌMA ALAALA

N’afọ 2008, o nwere ndị gbara ndị na-eto eto n’Amerịka ajụjụ ọnụ gbasara otú ha si ele àgwà ọma anya. Onye so gbaa ndị ahụ ajụjụ ọnụ kwuru na ihe na-ewute ya bụ na o nweghị ezigbo ihe ha kwuru gbasara àgwà ọma. Ọtụtụ n’ime ha kwuru na idina mmadụ n’ike ma ọ bụkwanụ igbu ọchụ adịghị mma. Ma, o nweghị oké ihe ha kwuru gbasara àgwà ọma na àgwà ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ha ekwughị na onye mmanya na-egbu ekwesịghị ịnya ụgbọala, nke ha ji ekwu na mmadụ ekwesịghị ịghọ aghụghọ n’ule ma ọ bụkwanụ na di ma ọ bụ nwunye ekwesịghị ịgba n’èzí. Otu nwa agbọghọ kwudịrị na o nweghị ihe gbasara  ya na àgwà ọma na àgwà ọjọọ. Ọtụtụ ndị na-asịkwa na mmadụ kwesịrị ime ihe ọ bụla obi ya gwara ya mee. Mmadụ ò kwesịrị ime ihe ọ bụla obi ya gwara ya, ma ihe ahụ ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị?

Ọ bụ eziokwu na ịhụnanya na-esi n’obi, ma Baịbụl kwuru na obi anyị dị aghụghọ, na-esikwa ike njite. (Jeremaya 17:9) Ihe a Baịbụl kwuru na-egosi ihe mere àgwà ọjọọ ji ju ebe niile. Ị manụ na o kwuru kemgbe ọtụtụ afọ na n’oge ikpeazụ ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị na-enweghị obi mmadụ na ndị na-eme ihe ike. O kwukwara na ha ga-abụ ndị na-ahụghị ezi ihe n’anya nakwa ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.—2 Timoti 3:1-5.

Ihe a Baịbụl kwuru kwesịrị ime ka anyị ghara ịtụkwasị onwe anyị obi ma ghara ime ihe ọ bụla obi anyị gwara anyị. Cheta na Baịbụl sịrị: “Onye tụkwasịrị obi n’obi nke ya dị nzuzu.” (Ilu 28:26) Anyị ga na-akpa àgwà ọma ma ọ bụrụ na ihe dị mma na-abanye n’obi anyị. Olee ihe ga-enyere anyị aka? Ọtụtụ ndị na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru n’ihi na ha ma na ọ na-ekwu ihe n’ezoghị ọnụ, ihe ọ na-ekwukwa bụ eziokwu.

ÀGWÀ NDỊ ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-AKPA

Àgwà ndị Baịbụl gwara anyị na-akpa bara uru. Uru anyị na-erite ma anyị na-akpa ha na-egosikwa na Chineke chọrọ ka anyị na-akpa ha. Ka anyị kwuo gbasara ole na ole n’ime ha. Ha bụ ịhụnanya, obiọma, imesapụ aka na ịkwụwa aka ọtọ.

Ịhụ ndị ọzọ n’anya.

Otu akwụkwọ kwuru na obi ga na-adị onye hụrụ ndị ọzọ n’anya ụtọ. N’eziokwu, obi na-adị anyị ụtọ ma ndị ọzọ hụ anyị n’anya. Anyị kwesịkwara ịhụ ndị ọzọ n’anya. Ma, ọ́ bụghị ya, obi agaghị na-adị anyị ụtọ.

Ihe Baịbụl kwuru: “Yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Pọl kwukwara ná 1 Ndị Kọrịnt 13:2, sị: ‘Ọ bụrụ na enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ.’

Ịhụnanya Baịbụl na-ekwu okwu ya n’amaokwu ndị a abụghị ịhụnanya elu ọnụ ma ọ bụ nke a na-eme na fim. Kama, ọ bụ ụdị nke ga-eme ka anyị nwee ike inyere onye anyị na-amaghị aka, n’atụghị anya ka ọ kwụọ anyị ụgwọ ihe anyị meere ya. Baịbụl kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 13:4-7, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. [Ọ dịghị] ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ n’ihi ajọ omume, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. Ọ na-edi ihe niile, . . . na-atachi obi n’ihe niile.”

Ọ bụrụ na ụdị ịhụnanya a adịghị n’ezinụlọ, o nweghị onye nọ n’ezinụlọ ahụ obi ga na-adị ụtọ. Ndị ụdị ihe a na-akacha enye nsogbu bụ ụmụaka. Otu nwaanyị aha ya bụ Monica kwuru na o nweghị ụdị mmegbu a na-emegbughị ya mgbe ọ bụ nwata. Ọ sịrị na o nweghị onye hụrụ ya n’anya nakwa na ya enweghị olileanya ọ bụla. Ma, mgbe ọ dị afọ iri na ise, ọ gakwuuru nne na nna mama ya, ha na ya ebiri. Ha bụ Ndịàmà Jehova.

Monica kwuru, sị: “Mgbe mụ na ha biri afọ abụọ, ha kụziiri m ihe m ga-eme ka m hụ ndị  ọzọ n’anya nakwa otú mụ na ndị ọzọ ga-esi na-emekọrịta ihe n’agbanyeghị na m bụ onye ihere. Ha nyeere m aka ịbụ ezigbo mmadụ.” Monica alụọla di mụta ụmụ atọ. Ya na di ya na-ebikwa n’udo. Ha na ụmụ ha na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụ otu n’ime ụzọ ha si egosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya.

Otu n’ime ihe na-eme ka ndị mmadụ ghara ịhụ ibe ha n’anya bụ ịhụ akụnụba n’anya. Ọtụtụ ndị na-ekwu na o nweghị ihe ka mmadụ inwe ego na ikpori ndụ. Ma, ọtụtụ ndị achọpụtala na inwe ego anaghị eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị nwere ego anaghị enwe obi ụtọ. O teekwala Baịbụl kwuru ya n’Ekliziastis 5:10. Ebe ahụ sịrị: “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ. Nke a kwa bụ ihe efu.” Baịbụl kwukwara, sị: “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya.”—Ndị Hibru 13:5.

Obiọma na imesapụ aka.

Otu akwụkwọ kwuru na inye ndị ọzọ ihe na-eme ka anyị nwee obi ụtọ karịa mgbe ndị ọzọ nyere anyị ihe.

Ihe Baịbụl kwuru: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ Ndịozi 20:35.

Otú kacha mma anyị ga-esi enye ndị ọzọ ihe bụ iji ike anyị na oge anyị na-enyere ha aka. Tụlegodị ihe otu nwaanyị aha ya bụ Karen mere. O nwere otu ụbọchị ọ nya ụgbọala pụta hụ otu nwaanyị na ụmụ ya abụọ ndị nwaanyị n’ebe ụgbọala ha kwụwara ha. Nwaanyị ahụ na otu nwa ya na-aga ịba ụgbọelu. Ma, ụgbọala ha ji aga n’ọdụ ụgbọelu emebiela, o nweghịkwa tagzi ha ga-eji aga. Mgbe Karen hụrụ ha, ya agwa ha ka ya buga ha n’ọdụ ụgbọelu ahụ, n’agbanyeghị na iru ebe ahụ ga-ewe ha nkeji iri anọ na ise. Mgbe o bugachara ha na-alọta, ya ahụ nwa agbọghọ nke ọzọ ka ọ ka nọ ebe ahụ ụgbọala ha mebiri.

Nwa agbọghọ ahụ agwa Karen na di ya na-abịa iburu ya.

Karen agwa ya na obi dị ya ụtọ na ọ bịawala. Tupu Karen alawa, ya agwa ya na ya na-aga ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha.

Nwa agbọghọ ahụ ajụọ ya ma ọ̀ bụ Onyeàmà Jehova.

Karen gwara ya na ya bụ Onyeàmà Jehova, ha abụọ ekwurịta banyere ya.

Mgbe izu ole na ole gachara, nwa agbọghọ ahụ so mama ya gaa njem ahụ degaara Karen akwụkwọ ozi. Ihe o dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ: “Mụ na mama m na-ekele gị maka ibuga anyị n’ọdụ ụgbọelu ụbọchị ahụ. E wezụga aka ahụ i nyeere anyị, anyị agaraghị aga njem ahụ. Nwanne m nwaanyị gwara m na ị bụ Onyeàmà Jehova, ka a sịkwa ihe mere i ji meere anyị ihe ọma ahụ. Mama m bụ Onyeàmà Jehova. Mụnwa bụkwa, ma, anaghịzi m aga ọmụmụ ihe. Ma, m ga-amalitaghachi ịga.” Mgbe Karen gụchara akwụkwọ ozi ahụ, obi tọrọ ya ụtọ na ya nyeere ụmụnna ya abụọ aka. Anya mmiri gbakwara ya.

Otu nwoke na-ede akwụkwọ dere na onye na-enyere onye ọzọ aka na-enyekwara onwe ya aka. Ihe mere anyị ji kwesị ịna-enyere ndị ọzọ aka bụ na Chineke kere anyị ka anyị na-akpa àgwà ka ya, o keghị anyị ka anyị  na-achọ naanị ọdịmma onwe anyị.—Jenesis 1:27.

Ịkwụwa aka ọtọ.

Ihe na-agakarị nke ọma n’ebe ndị mmadụ na-akwụwa aka ọtọ. N’ebe ọ bụla ọtụtụ ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ, onye ọ bụla ga na-atụ ibe ya egwu, o nweghị onye ga-atụkwasị ndị ọzọ obi. Ihe ga na-agakwa aka ekpe aka ekpe.

Ihe Baịbụl kwuru: “Ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu [Chineke]?” Gịnị bụ azịza ajụjụ a? “Ọ bụ onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ, . . . na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.” (Abụ Ọma 15:1, 2) Anyị kwesịrị ịna-akwụwa aka ọtọ mgbe niile, dịkwa ka anyị kwesịrị ịhụ ndị ọzọ n’anya, bụrụ ndị obiọma ma na-emesapụ aka. Ọ bụghị anyị kwụwa aka ọtọ taa, ya ruo echi anyị arụrụwa aka.

Ọ̀ kwa ị ka chetara Christina, nwaanyị ahụ tụtụtara akpa ahụ ego dị? Ihe dị ya mkpa abụghị ịba ọgaranya, kama ọ bụ ime ihe Chineke chọrọ. Mgbe onye nwe ego ahụ chị obi n’aka chọrọ ego ahụ bịa, ya agwa ya na ya tụtụtara ego ya. Otú Christina si nyeghachi ya ego ahụ tụrụ ya n’anya. Ihe ahụ o mere mekwara ka obi dị onye ọ na-arụrụ ọrụ ụtọ. Ọ bụ ya mere o ji mechaa bulie ya n’ọkwá ka ọ bụrụ onye na-elekọta ihe niile ha na-ere. Ị manụ na onye mmadụ nwere ike inye ụdị ọkwá a bụ onye ọ tụkwasịrị obi. Ihe ahụ 1 Pita 3:10 kwuru bụ eziokwu chara acha. Ebe ahụ sịrị: “Onye chọrọ ịhụ ndụ n’anya, chọọkwa iji anya ya hụ ezi ụbọchị, ya gbochie . . . egbugbere ọnụ ya ikwu okwu aghụghọ.”

“NA-EJE IJE N’ỤZỌ NDỊ EZI MMADỤ”

Baịbụl kwuru ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme. Ihe ndị ahụ ọ gwara anyị gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya n’ihi na ha na-enyere anyị aka ije “ije n’ụzọ ndị ezi mmadụ.” (Ilu 2:20; Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị ahụ Chineke chọrọ ka anyị na-eme, ọ pụtara na anyị hụrụ ya n’anya. Ọ ga-agọzikwa anyị. Leenụ nkwa Chineke kwere anyị. ‘Debe ụzọ Chineke, ọ ga-ebulikwa gị elu inweta ụwa. Mgbe a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ị ga-ahụ ya.’—Abụ Ọma 37:34.

N’ọdịnihu, Chineke ga-eji ihe ọma kwụọ ndị niile na-erubere ya isi ụgwọ ọrụ. Ha ga-ebi n’ụwa udo ga-adị, nke ihe ọjọọ na-agaghị adị. Ihe ndị a niile gosiri na anyị kwesịrị ịmụ gbasara àgwà ndị Baịbụl kwuru ka anyị na-akpa.