Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! NỌVEMBA 2013

 IHE BAỊBỤL KWURU

Mmadụ Inwe Mmekọahụ Tupu Ọ Lụọ Di Ma Ọ Bụ Nwunye

Mmadụ Inwe Mmekọahụ Tupu Ọ Lụọ Di Ma Ọ Bụ Nwunye

Mmadụ inwe mmekọahụ tupu ọ lụọ di ma ọ bụ nwunye ọ̀ dị njọ?

“N’ihi na ihe Chineke chọrọ bụ ka  . . . unu zere ịkwa iko.”—1 Ndị Tesalonaịka 4:3.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

N’ebe ụfọdụ, ọ bụghị ihe ọjọọ ma mmadụ abụọ torola eto nwee mmekọahụ. N’ebe ụfọdụkwa, ọ bụghị ihe ọjọọ ma ndị na-eto eto na-egwu egwuregwu iberiibe.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ihe Baịbụl kpọrọ ụdị mmekọahụ ọ bụla mmadụ na-enwe mgbe ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye bụ “ịkwa iko.” Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya “zere ịkwa iko.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) E nwere mmehie ndị Baịbụl kwuru na ndị na-eme ha agaghị eketa Alaeze Chineke. Ụfọdụ n’ime ha bụ mmadụ ịkwa iko mgbe ọ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko, mmadụ ikpere arụsị, ịṅụbiga mmanya ókè, ime mgbaasị, igbu ọchụ, na izu ohi.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10; Mkpughe 21:8.

IHE MERE O JI GBASA GỊ

Baịbụl kwuru na “Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko” ikpe. (Ndị Hibru 13:4) Ọ bụrụ na anyị na-erube isi n’iwu Chineke nyere gbasara mmekọahụ, ọ pụtara na anyị hụrụ Jehova n’anya. (1 Jọn 5:3) Ọ na-agọzikwa ndị na-erube isi n’iwu ya.—Aịzaya 48:18.

 Ọ̀ dị njọ ndị na-abụghị di na nwunye igwu egwuregwu iberiibe?

“Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu.”—Ndị Efesọs 5:3.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ bụ ihe ọjọọ. Ma, o nweghị ihe o mere ma ha na-egwu egwuregwu iberiibe.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọ bụghị naanị ịkwa iko ka Baịbụl kwuru na ọ dị njọ. O kwukwara na “adịghị ọcha” na “omume rụrụ arụ” adịghị mma. (2 Ndị Kọrịnt 12:21) Ọ pụtara na e nwere ụdị egwuregwu ndị na-abụghị di na nwunye nwere ike igwu ya adị njọ n’anya Chineke n’agbanyeghị na ha enweghị mmekọahụ.

Ihe Baịbụl na-ekwu bụ na ọ bụ naanị ndị bụ di na nwunye kwesịrị ịna-egwu ụdị egwuregwu ndị ahụ. Baịbụl kwukwara na “iji anyaukwu na-enwe agụụ mmekọahụ” adịghị mma. (1 Ndị Tesalonaịka 4:5) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ pụtara gịnị? Chegodị banyere ihe a gbasara ma nwoke ma nwaanyị. Nwa agbọghọ nwere ike ikpebi na e nweghị ihe ga-eme ka ya na enyi ya nwoke nwee mmekọahụ. Ma, ya na ya ana-egwu egwuregwu iberiibe. Ihe a ha na-eme gosiri na ha na-enwere ihe na-abụghị nke ha anyaukwu. N’ihi ya, ha ‘ji anyaukwu na-enwe agụụ mmekọahụ.’ Baịbụl kwuru na ndị na-akpa ụdị àgwà a agaghị eketa Alaeze Chineke.—Ndị Efesọs 5:3-5.

Olee otú anyị ga-esi zere mmekọahụ rụrụ arụ?

“Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ.”—1 Ndị Kọrịnt 6:18.

IHE MERE O JI GBASA GỊ

Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye chọrọ ka ya na Chineke dịrị ná mma, o kwesịghị inwe mmekọahụ.—Ndị Kọlọsi 3:5, 6.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ọ pụtara na mmadụ kwesịrị izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka ọ kwaa iko. (Ilu 22:3) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ achọghị itinye aka n’omume rụrụ arụ, ya na ndị na-eleghara ihe Chineke kwuru gbasara mmekọahụ anya ekwesịghị ịna-akpa. Baịbụl gwara anyị, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.”—Ilu 13:20.

Ọ bụrụ na mmadụ na-eche banyere ihe na-adịghị mma, o nwere ike ime ka onye ahụ tinye aka n’omume rụrụ arụ. (Ndị Rom 8:5, 6) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-ege egwú rụrụ arụ ma ọ bụ na-ele fim na-egosi ebe a na-eme ihe rụrụ arụ. Anyị ekwesịghịkwa ịna-agụ akwụkwọ ọ bụla na-ekwu banyere ịkwa iko ma ọ bụ omume ndị ọzọ Chineke kpọrọ asị.—Abụ Ọma 101:3.

GỤKWUO GBASARA YA

Ọ̀ Dị Mma Ka Nwoke na Nwaanyị Buru Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?

Chọpụta ihe Baịbụl kwuru banyere mmekọ nwoke na nwaanyị na ihe ndị yiri ya.