ABỤ m onye Nọtan Ayaland. A mụrụ m n’afọ 1965. Mama m na papa m bụ ndị ogbenye. Mgbe m na-eto n’obodo a na-akpọ Deri, ndị Katọlik na ndị Protestant anaghị esi otu ụzọ aga. Esemokwu ha ruru ihe karịrị afọ iri atọ. Ndị Protestant ka ndị Katọlik n’obodo anyị. Ndị Katọlik na-ekwu na ndị Protestant anaghị ekwe ka ndị nọ n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha megharịa ahụ́ nakwa na ha anaghị ekwe ewe ha n’ọrụ. Ha na-ekwukwa na ha ji ndị uwe ojii na-echi ha ọnụ n’ala nakwa na a naghị ekwe enye ha ebe ha ga-ebi.

Mmegbu juru ebe niile n’obodo anyị, a na-echikwa ndị mmadụ ọnụ n’ala. Enweghị m ike ịgụta ugboro ole e tiri m ihe ma ọ bụ ugboro ole a kpụpụtara m n’ụgbọala tụdo m égbè ma ọ bụkwanụ ugboro ole ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị soja jidere m gbaa m ajụjụ. Ha jidekwara m ọtụtụ ugboro tinyecha m aka n’ahụ́ na-achọ ma ha ga-ahụ ihe dị ka égbè. Ihe a niile were m iwe, m wee kpebie na mụ na ha ga-achịpụ ya.

E nwere mmadụ iri na anọ ndị amị gbagburu mgbe ha na-eme ngagharị iwe n’obodo anyị. Iji na-echeta ndị ahụ, ụfọdụ ndị obodo anyị malitere ịna-eme ngagharị iwe kwa afọ. Eso m ná ndị mere ngagharị iwe nke afọ 1972. N’afọ 1981, mmadụ iri nọ na mkpọrọ nwụrụ n’ihi na ha jụrụ iri nri maka na ike mkpọrọ agwụla ha. A na-emekwa ngagharị iwe iji cheta ha, esokwa m mee ngagharị iwe ndị ahụ. N’oge ahụ, ndị Briten  anaghị ekwe ka onye ọ bụla jiri ọkọlọtọ ndị Ayaland, ma m na-eji ya, m na-edekwa ihe n’ebe ọ bụla m hụrụ iji katọọ ndị Briten. O nweghị mgbe a na-anaghị enwe arụ a kpasara onye Katọlik. Nke a na-emekwa ka a malite ime ngagharị iwe. A malite ya, ọ na-adị ka ngagharị iwe nkịtị, ma, ọ naghị adị anya a malite imebisi ihe.

Mgbe m nọ mahadum, m na-eso ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ eme ngagharị iwe. M mechara kwaga Lọndọn. Eso m na-eme ngagharị iwe iji gosi na obi adịghị anyị mma maka otú ndị gọọmenti si eme iwu na-abara naanị ndị ọgaranya uru. Ha na-ejikwa iwu ndị ahụ emesi ndị ogbenye ike. O nwekwara mgbe ndị ọchịchị bepụrụ ego n’ụgwọ ọnwa ndị ọrụ bekee. Nke a mere ka ndị ọrụ bekee gbaa abụbụ ọrụ. Esokwa m gbaa abụbụ ọrụ ahụ. Esokwa m mee ngagharị iwe n’afọ 1990 mgbe gọọmenti kwuru na onye ọ bụla torola eto ga na-atụ ụtụ isi. Mgbe anyị mere ngagharị iwe a, e mebisiri ihe n’otu ámá ndị mmadụ na-ezukọtakarị na Lọndọn.

Nsogbu niile a bịara gwụ m ike. Ọ na-abụ anyị mechaa ngagharị iwe, ihe akakwuo njọ kama ịdị mma.

Ọ bụ n’oge ahụ ike ihe a niile gwụrụ m ka otu enyi m nwoke gwara m banyere Ndịàmà Jehova. Ha ji Baịbụl kụziere m na Chineke hụrụ mmadụ niile n’anya nakwa na ọ ga-edozi nsogbu niile ọchịchị ụmụ mmadụ kpatarala. (Aịzaya 65:17; Mkpughe 21:3, 4) N’agbanyeghị na ndị mmadụ na-eburu ndị ha na-achị ihe ọma n’obi, ha enweghị ike ime ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ ibe ha asị. Ihe mere ya bụ na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-akpata nsogbu ndị dị n’ụwa. Ma, ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-achị ụmụ mmadụ, ọ ga-enyere anyị aka imeri ná mgba anyị na ha na-agba.—Jeremaya 10:23; Ndị Efesọs 6:12.

Mgba niile m gbara n’oge ahụ dị ka ebe mmadụ ji nkata na-ekuru mmiri. Obi dị m mma ugbu a maka na amarala m na o nwere mgbe mmegbu na-agaghịzi adị n’ụwa a. N’oge ahụ, e nweghị onye ga-aka ibe ya.

Baịbụl kwuru na Jehova Chineke “hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) O so n’ihe mere obi ji sie anyị ike na ọ ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị imegbu ibe ha. Anyị manụ na ọchịchị mmadụ enweghị ike ịkwụsị mmegbu. (Daniel 2:44) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú Jehova ga-esi kwụsị mmegbu, gwa Ndịàmà Jehova nọ n’ebe i bi. I nwekwara ike ịga n’adres bụ́ www.jw.org/ig.

N’agbanyeghị na ndị mmadụ na-eburu ndị ha na-achị ihe ọma n’obi, ha enweghị ike ime ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ ibe ha asị