Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Teta!  |  Julaị 2013

 ISIOKWU TETA! A

Ihe Ị Ga-eme Ka Ndị Omekome Ghara Inweta Gị!

Ihe Ị Ga-eme Ka Ndị Omekome Ghara Inweta Gị!

O nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Karin. * O kwuru, sị: “Mụ na ndị enyi m pụọ, ọ bụ ha na-edula m ma chi jie. Ma, o nwere otu ụbọchị ike gwụchara m, mụ agbaa tagzi.

“Nwoke na-anya ya buuru m tinye isi ebe ọzọ. Mgbe anyị ruru otu ebe, ya achọọ idina m. M tisiri mkpu ike, ya ahapụ m. Mgbe ọ bịara ọzọ, mụ etie mkpu gbawa ọsọ.

“Tupu ihe a emee, m na-eche na iti mkpu agaghị eme ka onye chọrọ idina mmadụ ghara idina ya. Ọ bụ ụbọchị ahụ ka m matara na iti mkpu bara uru.”

O NWERE obodo ụfọdụ ị ga-aga, ndị omekome eju ya. Dị ka ihe atụ, e nwere ihe otu ọkàikpe kwuru gbasara otu obodo. Ọ sị na onye ọ bụla nọ n’obodo ahụ nwere ike ịdaba n’aka ndị omekome otu ụbọchị. Ma, o nwere ebe ị ga-aga, ndị omekome agaghị ehi nne. Ọ bụrụgodị na ndị omekome ehighị nne n’ebe i bi, i kwesịghị iche na o nweghị ihe ha ga-eme gị. Ọ bụrụ na i chee otú ahụ, i nwere ike ịdaba n’aka ha.

Ma ndị omekome hà hiri nne n’ebe i bi ma ọ bụ na ha ehighị nne, gịnị ka ị ga-eme ka gị na ndị ikwu na ibe gị ghara ịdaba n’aka ha? Otu ihe i nwere ike ime bụ ihe a Baịbụl kwuru n’Ilu 22:3. Ebe ahụ sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.” Ndị uwe ojii na-agwakarị ndị mmadụ ka ha mee ihe ọ bụla ha nwere ike ime ka ha ghara ịdaba n’aka ndị omekome.

Mmadụ daba n’aka ndị omekome, ha nwere ike imerụ ya ahụ́ ma ọ bụkwanụ zuo ya ohi. Ma, ọ bụghị naanị ihe abụọ a ka ha na-eme mmadụ. Ihe ọzọ bụ na mmadụ daba n’aka ha, ọ ga-esi ike onye ahụ echefuo ihe ha mere ya. Ahụ́ agaghị na-eru ya ala, o nweghịkwa onye ọ ga-atụkwasị obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị ghara ịdaba n’aka ha. Ka anyị tụlee ihe anyị nwere ike ime ka anyị ghara ịdaba n’aka ndị omekome. Ndị anyị ga-atụle gbasara ha bụ ndị oji égbè ezu ohi, ndị na-edina mmadụ n’ike ma ọ bụ ndị na-egwusa mmadụ egwuregwu iberiibe ọ na-achọghị, ndị na-eji Ịntanet egwu wayo, na ndị na-eji aha onye ọzọ egwu wayo.

 IJI ÉGBÈ EZU OHI

Olee otú ha si eme ya? Ọ na-abụ ha hụ onye ha ga-ezu ohi, ha atụwa ya égbè nara ya ihe ya.

Olee nsogbu ndị ọ na-akpata? O nwere mgbe e zuru ohi n’ọtụtụ ebe na Briten. Otu ọkàiwu kwuru na o nweghị onye e merụrụ ahụ́, ma ọ na-abụ ndị ahụ e zuru ohi nọkata obi amapụ ha. Ọ sịrị na obi erughị ọtụtụ n’ime ha ala ruo ọtụtụ ọnwa. Ha anaghịkwa ehi ụra. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ha niile kwuru na ọ na-abụ ha na-arụ ọrụ, obi ha anaghị adị n’ọrụ ha na-arụ.

Olee ihe i nwere ike ime?

  • Ọ bụ ndị anya na-erughị ala ka a na-ezukarị ohi. N’ihi ya, anya kwesịrị ịna-eru gị ala

    Anya ruo gị ala. Ọ bụghị onye ọ bụla onye ohi hụrụ ka ọ na-ezu ohi. Ọ bụ ndị anya na-erughị ala ka ha na-ezu ohi. N’ihi ya, anya kwesịrị ịna-eru gị ala. Aṅụla oké mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike n’ihi na ọ ga-eme ka anya ghara ịdị gị nkọ. Otu akwụkwọ kwuru na ọ bụrụ na mmadụ na-aṅụ mmanya ma ọ bụ ọgwụ ike, ọ ga-esi ike ya echebara ihe echiche mara mgbe e nwere nsogbu.

  • Dozie ihe gị edozie. Ọ bụrụ na i nwere ụgbọala, hụ na ị na-akpọchi ya akpọchi. Na-akpọchikwa ụlọ gị akpọchi. Ekwela ka onye ị na-amaghị bata n’ụlọ gị. Ọ bụrụ na i nwere ihe ndị dara oké ọnụ, edowele ha ebe ndị mmadụ ga na-ahụ ha. Ilu 11:2 kwuru na “ndị dị obi umeala nwere amamihe.” Ndị a na-ezukarị ohi bụ ndị na-eme ka ndị mmadụ hụ ihe dara oké ọnụ ha nwere.

  • Na-ege ndị ọzọ ntị. Ilu 12:15 kwuru na “ụzọ onye nzuzu ziri ezi n’anya ya, ma onye na-aṅa ntị na ndụmọdụ maara ihe.” Mgbe ọ bụla ị na-aga ihe, na-ege ndị mmadụ na ndị ọchịchị ntị. Ha nwere ike ịgwa gị ebe ndị ọjọọ na-anọkarị. Ha nwekwara ike ịgwa gị ihe ị ga-eme ka ndị omekome ghara ịnara gị ihe i ji ma ọ bụkwanụ ka ị ghara ịdaba n’aka ha.

IDINA MMADỤ N’IKE MA Ọ BỤ IGWUSA YA EGWUREGWU IBERIIBE Ọ NA-ACHỌGHỊ

Olee otú ha si eme ya? Ọ na-abụ ha hụ mmadụ ha abagide ya dinaa ya. Ma, ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-abụ idina mmadụ. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ igwusa mmadụ egwuregwu iberiibe ọ na-achọghị.

Olee nsogbu ndị ọ na-akpata? Otu nwa agbọghọ e dinara n’ike kwuru na ọ bụghị naanị mgbe ahụ a na-edina mmadụ ka ihe a na-eme ya na-enye ya nsogbu. Ọ na-enyekwa ya nsogbu ka oge na-aga. O kwuru na onye ahụ e dinara anaghị echefu ihe e mere ya echefu. Ike ụwa na-abịakwa gwụ ya. Ihe ọzọ bụ na obi anaghị adị ikwu na ibe ya mma. Ma, anyị ga-echeta na ọ bụghị onye ahụ e dinara mere e ji dinaa ya. Ọ bụ onye ahụ dinara ya ka ihe niile dị n’isi.

Olee ihe i nwere ike ime?

  • Anọla ebe ọ bụla na-eme gị obi abụọ. Ndị uwe ojii Amerịka kwuru na ọ bụrụ na obi erughị gị ala ma gị na mmadụ nọrọ, ọ ga-aka mma ka i si ebe ahụ pụọ. Ha kwukwara na mmadụ e kwesịghị ịnọ ebe ọ bụla na-eme ya obi abụọ. Ọ bụrụ na obi gị na-agwa gị ka i si ebe ahụ pụọ, pụwa ozugbo”

  • Anya ruo gị ala, atụkwala ụjọ. Ọ bụ ndị anya na-erughị ala na ndị na-atụkarị ụjọ ka ndị na-edina mmadụ n’ike na-edinakarị. N’ihi ya, atụla ụjọ ma ị na-aga ebe ọ bụla ị na-aga. Anya ruokwa gị ala.

  • Gbapụ ozugbo. Mmadụ bịa idina gị n’ike tie mkpu. (Diuterọnọmi 22:25-27) Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ isi ebe ahụ gbapụ ma ọ bụkwanụ gị emee ka ị̀ na-aba ya ọgụ. O nwere ike imegharị  ya anya. Ọ bụrụkwa na ị ga-agbali ọsọ, si n’ebe ahụ gbapụ, kpọọkwa ndị uwe ojii. *

IJI ỊNTANET EGWU WAYO

Olee otú ha si eme ya? Ọ na-abụ ha gaa n’Ịntanet, ha emee ka hà bụ ndị ọrụ gọọmenti na-ana ndị mmadụ ụtụ isi. Ọ bụrụ ebe gọọmenti na-enye ndị na-enweghị ọrụ, ndị ọrịa na ndị agadi ego, ha na-aga n’Ịntanet mee ka hà bụ ndị ahụ ka gọọmenti nwee ike inye ha ego. Ha na-ejikwa kaadị na-abụghị nke ha azụ ihe. Mgbe ụfọdụ, ha na-anarakwa ndị mmadụ ego kwe ha nkwa na ha ga-ebugara ha ahịa ma ha agaghị ebuga ya. O nwekwara ndị nke na-egosi ndị mmadụ ihe na-abụghị nke ha ka ha nwee ike iji ya napụta ha ego.

Olee nsogbu ndị ọ na-akpata? Ndị na-eji Ịntanet egwu wayo na-egwu ma gọọmenti ma ndị mmadụ ọtụtụ ijeri dọla. Were ihe mere Sandra dị ka ihe atụ. Ndị na-eji Ịntanet egwu wayo ziteere ya ozi. Ha jụrụ ya ihe ụfọdụ gbasara ego o dewere n’ụlọ akụ̀. Ọ gwara ha ihe ndị ahụ n’ihi na o chere na ọ bụ ụlọ akụ̀ ọ na-etinye ego ziteere ya ozi ahụ. Nkeji ole na ole ka o zigachaara ha ihe ndị ahụ, ụlọ akụ̀ ọ na-etinye ego ezitere ya ozi. Ha gwara ya na mmadụ adọrọla ihe dị ka narị puku naịra isii na puku naịra iri abụọ n’ego ya. Mgbe o nwetara ozi a, ọ chọpụtara na e gwuola ya wayo.

Olee ihe i nwere ike ime?

  • Lezie anya. Ị gaa n’Ịntanet hụ ndị sị na ha bụ ọkachamara, ekwela ka ha megharịa gị anya. Chetakwa na o nweghị ezigbo ụlọ akụ̀ ga-asị gị jiri Ịntanet ma ọ bụ ekwentị zitere ha ihe ndị gbasara gị ị na-agaghị achọ ka mmadụ niile mara. Tupu gị esi n’Ịntanet zụwa ihe ma ọ bụkwanụ jụwa gbasara ihe ị chọrọ ịzụ, chọpụta otú ụlọ ọrụ ahụ si eme. Ilu 14:15 kwuru na “onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” Leziekwa anya ma ị chọọ ịzụ ihe n’ụlọ ọrụ dị n’obodo ọzọ n’ihi na ọ bụrụ na ihe agaghị otú ị tụrụ anya ya, ego gị nwere ike ifu.

  • Mara ihe niile gbasara ụlọ ọrụ ahụ. Chọpụta ebe ha na-anọ arụ ọrụ. Mara ma nọmba ekwentị ha ọ̀ bụ nke ezigbo ya. Gbalịakwa mara ma ị̀ ga-emefu ego ọzọ ma ị zụchaa ihe ahụ. Ihe ndị ọzọ i kwesịrị ịmara bụ mgbe ha ga-ebutere gị ihe ahụ ị zụrụ, nakwa ma ì nwere ike ibughachiri ha ihe ahụ.

  • Azụla ihe ọ bụla ị na-enyo enyo. Ọ bụ ndị anyaukwu ka a na-ejikarị Ịntanet egwu wayo. Otú e si arata ha bụ ịgwa ha na a ga-akwụ ha nnukwu ego ma ha mee obere ihe. E nwekwara ike ikwe ha nkwa na a ga-ebinye ha nnukwu ego, ọ bụrụgodị na ịkwụ ego ahụ ga-esiri ha ike. Otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka azụmahịa n’Amerịka kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla mmadụ gwara gị ka i tinye ego gị n’ahịa, gbalịa mara gbasara ahịa ahụ nke ọma. Ya kwe gị nkwa na ị ga-enweta nnukwu ego, marakwa na ọ bụ otú ahụ ka ọghọm dị na ya ga-aha. Ekwela ka mmadụ mee ka ị gaa tinye ego gị n’ahịa n’ebughị ụzọ mara gbasara ahịa ahụ nke ọma.”

IJI AHA ONYE ỌZỌ EGWU WAYO

Olee otú ha si eme ya? Ha na-aga mata ihe niile gbasara mmadụ ma jiri aha onye ahụ gwuo onye ọzọ wayo. Ha nwekwara ike iji aha ya mee ihe ọjọọ ndị ọzọ.

Olee nsogbu ndị ọ na-akpata? Ndị ohi nwere ike iji aha gị gaa nweta kaadị e ji azụ ihe ma ọ bụkwanụ gaa jiri aha gị biri ego. Ha nwekwara ike iji ya mepee ebe ha ga na-etinye ego n’ụlọ akụ̀. Ha mechaa, ha ejiri aha gị kote ụgwọ. Ọ bụrụgodị na e mechaa sị gị akwụla ụgwọ ahụ, ị ka ga na-aza aha ọjọọ ruo ọtụtụ afọ. O nwere otu onye e ji aha ya gwuo mmadụ wayo. O kwuru, sị: “Mmadụ nwehaala aha ọjọọ, ọ ga-agbasa ihe niile ọ na-eme. Ọ kadị mma ka mmadụ were ego gị kama iji aha gị gwuo onye ọzọ wayo.

Olee ihe i nwere ike ime?

  • Akọrọla mmadụ ihe ndị ọzọ na-ekwesịghị ịma. Ọ bụrụ na ị na-esi n’Ịntanet etinye ego n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụkwanụ na-esi na ya azụ ihe, o kwesịrị ịbụ gị nọtụ, gị agbanwee paswọd gị. I kwesịrị ịna-eme otú a ma ọ bụrụ na o nwere  ndị ọzọ gị na ha na-eji otu kọmputa aga n’Ịntanet. Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị gbasara ihe ndị ị na-ekwesịghị ịkọrọ ndị ọzọ, atụpụrụla ya ọnụ.

    Ọ bụghị naanị n’Ịntanet ka ndị omekome na-eji aha onye ọzọ egwu wayo. Ụzọ ọzọ ha si eme ya bụ ịgba mbọ nweta ihe ndị dị mmadụ mkpa. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike inweta akwụkwọ mmadụ na-eji adọrọ ego n’ụlọ akụ̀ na kaadị o ji azụ ihe. Mgbe ụfọdụkwa, ha na-agbalị mara ego ole mmadụ nwere n’ụlọ akụ̀. N’ihi ya, dewe ihe ndị a n’ebe onye ọzọ na-agaghị ahụ ha. Atụfukwala akwụkwọ ọ bụla ụlọ akụ̀ ji gwa gị ego ole i nwere. Ọ ga-aka mma ka ị dọkaa ya adọkaa ma ọ bụkwanụ gị akpọọ ya ọkụ. Nke a ga-eme ka ndị omekome ghara ịma ihe ọ bụla gbasara ego i nwere n’ụlọ akụ̀. Ọ bụrụ na otu n’ime ihe ndị a efunahụ gị, kọọrọ ya ndị nyere gị ya ozugbo.

  • Gbalịa mara ihe niile gbasara ego i tinyere n’ụlọ akụ̀. Ụlọ ọrụ na-ahụ maka azụmahịa n’Amerịka kwuru na ọ bụrụ na mmadụ amara ihe niile gbasara ego o tinyere n’ụlọ akụ̀, ọ ga-enyere ya aka ịma mgbe a chọrọ igwu ya wayo. O kwukwara na ọ bụrụ na mmadụ achọpụta ngwa ngwa na a chọrọ igwu ya wayo, ọ ga-enyere ya aka ịma ihe ọ ga-eme. N’ihi ya, ị nọtụ, gị agaa mara ma aka ọ̀ kpaala ego i tinyere n’ụlọ akụ̀. I nwekwara ike ịgwa ụlọ akụ̀ ka ha bipụtara gị ebe ha dekọrọ ihe niile gbasara ego gị. Nke a ga-eme ka ị mara mgbe mmadụ dọọrọ ego gị.

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị onye ma mgbe ọ ga-adaba n’aka ndị omekome. Onye anya ruru ala nwedịrị ike ịdaba n’aka ha. Ma, ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara gị uru. “Ahapụla ya, ọ ga-edebe gị ndụ. Hụ ya n’anya, ọ ga-echebekwa gị.” (Ilu 4:6) Ihe ọzọ bụ na Baịbụl kwere anyị nkwa na Chineke ga-egbu ndị omekome.

N’oge n’Adịghị Anya, A gaghịzi Enwe Ndị Omekome

Gịnị mere anyị ji kweta na Chineke ga-akwụsị ihe ndị omekome na-eme? Ọ bụ n’ihi ihe ndị a:

  • Chineke chọrọ ịkwụsị ya. “Mụ onwe m, Jehova, hụrụ ikpe ziri ezi n’anya, kpọọkwa ịpụnara mmadụ ihe na ajọ omume asị.”—Aịzaya 61:8.

  • ga-akwụsịli ya. “O jupụtara n’ike na ikpe nkwụmọtọ ma ọ naghị emegbu mmadụ.”—Job 37:23, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

  • O kwere anyị nkwa na ya ga-egbu ndị ọjọọ. Ma, ọkọ agaghị akọ ndị ezi omume. “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ.” “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:9, 29.

  • O kwere ndị na-erubere ya isi nkwa na ha ga-ebi n’ụwa ọhụrụ. Ndị omekome agaghịkwa anọ na ya. “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:11.

Anyị ma na obi dị gị ụtọ ugbu a ị hụrụ ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị omekome. Ọ bụrụ na obi dị gị ụtọ, biko wepụta oge na-amụ Baịbụl. Ị na-eme otú ahụ, ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ Chineke ga-emere anyị. Ọ bụ naanị Baịbụl ga-agwali gị ụdị ihe a, o nweghị akwụkwọ ọzọ. Ọ bụkwanụ naanị Baịbụl gwara anyị na Chineke ga-emecha wepụrụ anyị ndị omekome. *

Chineke kwere ndị na-erubere ya isi nkwa na ha ga-ebi n’ụwa ọhụrụ. Ndị omekome agaghịkwa anọ na ya

^ para. 3 Aha a kpọrọ ndị mmadụ n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 22 Ọtụtụ ndị e dinara n’ike ma ndị dinara ha. Ị chọọ ịma ihe ndị ọzọ ị ga-eme, gụọ akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1, peeji nke 228. Isiokwu ya bụ: “Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Ghara Idina M n’Ike?” I nwekwara ike ịgụ akwụkwọ a n’Ịntanet n’adres bụ́ www.jw.org/ig.

^ para. 44 Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ị gakwuru Ndịàmà Jehova, ha ga-enye gị ya n’efu. I nwekwara ike ịgụ ya n’Ịntanet n’adres bụ́ www.jw.org/ig.