Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 5 n'Afọ 2016

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ÒNYE GA-AKASILI GỊ OBI MA NSOGBU BỊARA GỊ?

Otú Chineke Si Akasi Anyị Obi n’Oge Nsogbu

Otú Chineke Si Akasi Anyị Obi n’Oge Nsogbu

E nwere ọtụtụ nsogbu na-abịara anyị. Ma, anyị agaghị ekwuchali gbasara ha niile n’isiokwu a. Ka anyị lebagodị anya n’anọ ndị nke anyị kpọtụrụla aha mbụ. Ị ga-amata otú Chineke si kasie ndị nwere nsogbu ndị ahụ obi.

MGBE A CHỤRỤ MMADỤ N’ỌRỤ

“M bịara na-arụ ọrụ ọ bụla m hụrụ. Anyị kwụsịkwara ịna-emefu ego n’ihe ndị na-adịghị anyị mkpa.”—Jonathan

Otu nwoke aha ya bụ Seth * kwuru, sị: “A chụrụ mụ na Priscilla nwunye m n’ọrụ otu mgbe. Ihe anyị ji kpaa afọ anyị ruo afọ abụọ bụ obere ego ndị ezinụlọ anyị na-enye anyị nakwa ego anyị na-enweta n’ọrụ ike kete o rie anyị na-arụ mgbe ụfọdụ. Ihe a niile mere ka ike ụwa gwụ nwunye m, mụnwa ewerekwa ya na o nweghịzi uru m bara.

“Ị̀ ma ihe nyeere anyị aka idi nsogbu a? Nwunye m na-agwakarị onwe ya ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:34. Jizọs sịrị na anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị maka echi, n’ihi na ụbọchị ọ bụla nwere nchegbu nke ya. Ihe ọzọ nyeere nwunye m aka bụ ekpere ọ na-eji obi ya niile ekpe mgbe niile. Ihe nyeere mụnwa aka bụ ihe e dere n’Abụ Ọma 55:22. Emere m ihe onye rọrọ abụ a mere. Atụkwasịrị m Jehova ibu arọ m, ọ kwadokwara m. Enwetala m ọrụ ọzọ ugbu a. Ma, anyị anaghị ebi ndụ okomoko. Anyị na-eme ihe Jizọs gwara anyị mee na Matiu 6:20-22. Nke ka nke bụ na anyị abịarukwuola Chineke nso, hụkwuokwa ibe anyị n’anya.”

Otu nwoke aha ya bụ Jonathan kwuru, sị: “Mgbe obere ahịa ezinụlọ m na-azụ dakpọrọ, obi ezughị m ike. Ihe niile anyị tara ahụhụ kpakọta kemgbe afọ iri abụọ enweghịzi ihe ọ bụ n’ihi otú ihe si sie ezigbo ike n’obodo anyị n’oge ahụ. Ego bịara na-esere mụ na nwunye m okwu. Ebe anyị chere na ụlọ ọrụ na-ahụ maka kaadị e ji azụrụ ihe n’aka agaghị ekwe anyị jiri ya zụrụ ihe, obi akaghị anyị iji ya gaa zụwa ihe.

“Ma Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya nyeere anyị aka ime mkpebi ndị dị mma. M bịara na-arụ ọrụ ọ bụla m hụrụ. Anyị kwụsịkwara ịna-emefu ego n’ihe ndị na-adịghị anyị mkpa. Anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ndịàmà Jehova ibe anyị nyeere anyị aka n’oge anyị na-ahụghị  tụrụ rachaa. Ha nyekwaara anyị aka ịma na anyị ka bara uru.”

MGBE DI NA NWUNYE GBASARA

Otu nwaanyị aha ya bụ Raquel kwuru, sị: “Mgbe mụ na di m gbasara, obi gbawara m. Iwe ana-eju m obi mgbe ọ bụla. Ma, arịọrọ m Chineke ka o nyere m aka. O nyekwaara m aka. M na-ekpe ekpere ụbọchị ọ bụla. Ọ na-abụ m kpechaa ekpere, Chineke enye m udo nke na-eme ka obi m jụrụ, ya adịzie m ka ò meziri obi m gbawara agbawa.

“Okwu ya bụ́ Baịbụl nyekwaara m aka ịkwụsị iwe iwe na ibu iwe n’obi. Agbalịrị m ime ihe Pọl onyeozi kwuru na Ndị Rom 12:21. Ebe ahụ kwuru, sị: ‘Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.’

“E nwere oge anyị kwesịrị ‘iwere na ihe efuola.’ . . . Kama ịna-echegbu onwe m, m bidoziri ịna-eme ihe ndị ga na-eme m obi ụtọ.”—Raquel

“Otu nwoke ji Baịbụl nyere m aka ịma ihe m ga-eme. O gosiri m ihe dị n’Ekliziastis 3:6 ma meda obi sị m na e nwere oge anyị kwesịrị ‘iwere na ihe efuola.’ O siiri m ike ikweta ihe a ọ gwara m, ma, ọ bụ ihe m kwesịrị ịghọta. Kama ịna-echegbu onwe m, m bidoziri ịna-eme ihe ndị ga na-eme m obi ụtọ.”

E nwere ihe otu nwaanyị aha ya bụ Elizabeth kwuru mgbe ya na di ya gbasara. O kwuru, sị: “Mmadụ na di ya ma ọ bụ nwunye ya gbasaa, e kwesịrị inwe onye ga-akasi ya obi.” O kwukwara, sị: “Otu ezigbo enyi m nwaanyị nyeere m aka. Ọ na-abịa eleta m ụbọchị ọ bụla. Ya bịarute, ya esoro m na-ebe ákwá, na-akasi m obi, na-agwakwa m okwu ndị mere ka m ghọta na a ka nwere ndị hụrụ m n’anya. O doro m anya na Jehova ji ya mee ka m nweta onwe m.”

MGBE ỌRỊA MA Ọ BỤ NKÁ BỊARA

“M kpechaara Jehova ekpere, ya ejiri mmụọ nsọ ya nye m ike.”—Luis

Luis anyị kwuru gbasara ya n’isiokwu mbụ n’akwụkwọ a na-arịa ọrịa obi, o nweekwala ugboro abụọ ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ. Ugbu a, a na-akwụnye ya akpa ikuku oxygen ruo awa iri na isii n’ụbọchị ọ bụla ka ọ ghara ịnwụ. O kwuru, sị: “M na-ekpere Jehova ekpere mgbe niile. M kpechaara Jehova ekpere, ya ejiri mmụọ nsọ ya nye m ike. M kpee ekpere, ndụ na-abịa tọwa m ụtọ n’ihi na m kweere na Chineke, marakwa na ihe gbasara m na-emetụ ya n’obi.”

Otu nwaanyị aha ya bụ Petra, onye karịrịla afọ iri asatọ, kwuru, sị: “E nwere ọtụtụ ihe m na-achọ ime, ma anaghị m emeli ha. Obi na-ajọ m njọ n’ihi otú ike si agwụ m. Ike na-agwụru m n’ọkpụkpụ. M na-aṅụzi ọgwụ ka mmiri ka m nwetatụ ike. Ọ na-adịkarị m otú  ọ dị Jizọs mgbe ahụ ọ gwara Nna ya na ọ bụrụ na o kwere omume, ka o mee ka otu nsogbu ga-abịara ya gabiga. Ma ihe Jehova mere bụ inye Jizọs ike. Ọ na-enyekwa m ike. Ekpere bụ ọgwụ m na-aṅụ ụbọchị ọ bụla. M na-enwetatụ onwe m ma m gwachaa Chineke okwu.”—Matiu 26:39.

Otú ahụkwa ka ọ dị otu nwoke aha ya bụ Julian, onye rịarala ọrịa akwara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri atọ. O kwuru na ya na-anọzi n’oche ndị ngwọrọ kama ịnọ n’ezigbo oche, mana, na ndụ ya juru ya afọ n’ihi na ya ji ya na-ejere ndị ọzọ ozi. O kwukwara na ọ bụrụ na onye na-ahụju anya na-enye ndị ọzọ ihe, ọ ga na-enwe obi ụtọ. Ọ sịrị na Jehova na-emezu nkwa o kwere anyị inye anyị ike n’oge anyị nọ ná nsogbu. Ọ dị ya otú ọ dị Pọl onyeozi, nke na o nwere ike ikwu, sị: ‘N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.’—Ndị Filipaị 4:13.

MGBE MMADỤ NWỤRỤ

Otu nwoke aha ya bụ Antonio kwuru, sị: “Mgbe papa m nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ, ọ dị m ka ọ̀ bụ ná nrọ. Ọ nọ na-agara onwe ya, moto abịa kụrụ ya. Ma, o nweghị ihe m ga-eme. Papa m tụbọrọ ruo ụbọchị ise tupu ya anwụọ. M na-agbalị ejide onwe m n’ihu mama m, ma m na-ebe ezigbo ákwá ma naanị m nọrọ. M nọ na-ajụ onwe m sị, ‘Gịnị mere ihe a ji mee anyị?’

“N’oge ihe a mere, m nọgidere na-arịọ Jehova ka o nyere m aka idi ya nakwa ka o mee ka obi ruo m ala. Nwayọọ nwayọọ, m nwetawara onwe m. M chetara na Baịbụl kwuru na ‘ihe a na-atụghị anya ya’ nwere ike ịbịakwasị onye ọ bụla n’ime anyị. Ebe m ma na Chineke anaghị agha ụgha, obi siri m ike na m ga-ahụ papa m ọzọ mgbe ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.”—Ekliziastis 9:11; Jọn 11:25; Taịtọs 1:2.

“Ọ bụ eziokwu na ụgbọelu ahụ kpọkaranụ gburu nwa anyị nwoke, anyị ka na-echeta oge ndị anyị na ya nọ na-enwe obi ụtọ.”—Robert

Robert anyị kwuru gbasara ya n’isiokwu nke mbụ kwukwara ụdị ihe a. O kwuru, sị: “Mụ na Maribel nwunye m nwetara udo Jehova na-enye, nke e kwuru gbasara ya na Ndị Filipaị 4:6, 7. Anyị kpesiri ekpere ike, Jehova emee ka anyị nwee udo a. Udo a mere ka anyị nwee ike ịgwa ndị nta akụkọ bịara gbaa anyị ajụjụ ọnụ na anyị nwere olileanya na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụ eziokwu na ụgbọelu ahụ kpọkaranụ gburu nwa anyị nwoke, anyị ka na-echeta oge ndị anyị na ya nọ na-enwe obi ụtọ. Anyị na-agbalị ka oge ndị ahụ ghara ịpụ anyị apụ n’obi.

“Mgbe Ndịàmà Jehova ibe anyị gwara anyị na ha hụrụ anyị na tiivi ka anyị na-ekwu na anyị nwere okwukwe na a ga-akpọlite nwa anyị n’ọnwụ, anyị gwara ha na ọ bụ ọtụtụ ekpere ha kpere n’isi anyị nyeere anyị aka. Ha ziteere anyị ọtụtụ ozi kasiri anyị obi. O dokwara m anya na Jehova ji ha nyere anyị aka.”

Ihe a niile ndị a kwuru gosiri na Chineke ga-akasili onye ọ bụla n’ime anyị obi n’agbanyeghị ụdị nsogbu bịaara ya. Nsogbu ndị nke gịnwa kwanụ? Ụdị nsogbu ọ bụla ọ sọkwara ya bịara gị, o nwere onye ga-akasili gị obi. * Gbalịa rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Ọ bụ “Chineke nke nkasi obi niile.”—2 Ndị Kọrịnt 1:3.

^ para. 5 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ para. 23 Ọ bụrụ na ị chọrọ ka mmadụ nyere gị aka ka ị bịaruo Chineke nso, ya akasiekwa gị obi, biko gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ma ọ bụkwanụ gị edetara alaka ụlọ ọrụ anyị kacha gị nso akwụkwọ ozi.