N’agbanyeghị na Jizọs bụ nwoke kacha ukwuu nke dịtụrụla ndụ n’ụwa, o nyere nna ya otuto ruuru ya nke gosiri na ọ dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ya ruru. (Jọn 7:16-18) Ma Setan emeghị ka ya, kama, ọ ghọrọ Ekwensu, nke pụtara “Onye Nkwutọ.” (Jọn 8:44) Ndị Farisii nwere àgwà Setan, mpako ha mere ka ha na-ekwutọ onye ọ bụla nwere okwukwe n’ebe Mesaya ahụ nọ. (Jọn 7:45-49) Olee otú anyị ga-esi eṅomi Jizọs ma a họpụta anyị ịrụ ọrụ n’ọgbakọ?

LEENỤ VIDIO BỤ́ “NWEENỤ ỊHỤNANYA N’ETITI ONWE UNU”—ZERE ANYA ỤFỤ NA ITU ỌNỤ, AGBA NKE MBỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NA-ESONỤ:

  • Olee otú Alex si gosi na ya dị mpako?

LEENỤ VIDIO BỤ́ “NWEENỤ ỊHỤNANYA N’ETITI ONWE UNU”—ZERE ANYA ỤFỤ NA ITU ỌNỤ, AGBA NKE ABỤỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:

  • Olee otú Alex si gosi na ya dị umeala n’obi?

    Olee otú Alex si gbaa Bill na Carl ume?

LEENỤ VIDIO BỤ́ “NWEENỤ ỊHỤNANYA N’ETITI ONWE UNU”—ADỊLA MPAKO, AKPAKWALA ÀGWÀ NA-EKWESỊGHỊ EKWESỊ, AGBA NKE MBỤ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NA-ESONỤ:

  • Olee otú Nwanna Harris si ghara igosi na ya ma ebe ike ya ruru?

LEENỤ VIDIO BỤ́ “NWEENỤ ỊHỤNANYA N’ETITI ONWE UNU”—ADỊLA MPAKO, AKPAKWALA ÀGWÀ NA-EKWESỊGHỊ EKWESỊ, AGBA NKE ABỤỌ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ NA-ESONỤ:

  • Olee otú Nwanna Harris si gosi na ya ma ebe ike ya ruru?

    Gịnị ka ihe Nwanna Harris mere kụziiri Nwanna Nwaanyị Faith?