Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Septemba 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Ndị mmụọ ozi hà dị adị n’eziokwu?

Amaokwu Baịbụl: Ọma 103:20

Akwụkwọ: Ụlọ Nche a kọwara ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị mmụọ ozi na otú ihe ndị ha na-eme si gbasa anyị.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Ì chere na sayensị akagbuola ihe Baịbụl kwuru?

Amaokwu Baịbụl: Aịza. 40:22

Eziokwu: Ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara sayensị bụ eziokwu.

AKWỤKWỌ ỊKPỌ ÒKÙ ỌMỤMỤ IHE (inv)

Akwụkwọ: O nwere okwu a ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe anyị na-anọ efe Chineke. M na-akpọ gị ka ị bịa gere okwu ahụ n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. [Nyezie ya akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Gosi ya ebe e dere oge na ebe anyị na-enwe ọmụmụ ihe ngwụcha izu, gwakwa ya isiokwu okwu ihu ọha ahụ a ga-ekwu.]

Ajụjụ: Ị̀ bịatụla ọmụmụ ihe anyị mbụ? [I nwere ike ịkpọnyere ya vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?]

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.