Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Ọktoba 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

TETA!

Ajụjụ: Gịnị mere o ji dị mma ịkwadebe maka ọdachi?

Amaokwu Baịbụl: Ilu 27:⁠12

Akwụkwọ: Teta! a kwuru gbasara ihe anyị kwesịrị ime tupu ọdachi emee, mgbe ọ na-eme nakwa mgbe o mechara.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Olee otú anyị si egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya?

Amaokwu Baịbụl: 1 Jọn 5:3

Eziokwu: Anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere ya isi.

NDỊ NWỤRỤ ANWỤ HÀ GA-ADỊ NDỤ ỌZỌ? (T-35)

Ajụjụ: Kwa afọ, ọtụtụ ndị mmadụ n’ebe dị iche iche n’ụwa na-eme ememme iji cheta ndị nwụrụ anwụ. Olileanya ọ̀ dị na anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?

Amaokwu Baịbụl: Ọrụ 24:⁠15

Akwụkwọ: Traktị a kwuru gbasara uru olileanya mbilite n’ọnwụ ga-abara anyị. [O kwe mee, kpọnyere ya vidio bụ́ Olileanya Ọ̀ Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?]

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.