Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Ọktoba 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ILU 22-26

“Zụlite Nwata Dị Ka Ụzọ Kwesịrị Ya Si Dị”

“Zụlite Nwata Dị Ka Ụzọ Kwesịrị Ya Si Dị”

E nwere ọtụtụ ihe e kwuru n’akwụkwọ Ilu ga-abara ndị nne na nna uru. Onye ọrụ ugbo lekọta ihe ọ kụrụ nke ọma, ihe ahụ ga-eto, mee nke ọma. Otú ahụ ka ọ dịkwa ụmụaka. A zụọ ha nke ọma, ha tolite, ha ga-enwe mmasị ife Jehova.

22:6

  • Ịzụ ụmụaka nke ọma anaghị adịcha mfe, ọ na-ewekwa oge

  • Ndị nne na nna kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma ụmụ ha ga-amụta n’aka ha. Ha kwesịkwara ịna-akụziri ụmụ ha ihe, na-agba ha ume, na-adọkwa ha aka ná ntị

22:15

  • Ịdọ aka ná ntị bụ ihe ọ bụla e ji obi ọma mee nwatakịrị ka o nwee ike ịgbanwe echiche ọjọọ ma ọ bụ àgwà ọjọọ o nwere

  • Cheta na aka e ji eso ụmụaka niile abụghị otu