Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Nọvemba 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga⁠-⁠Esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ime Nletaghachi

Otú Anyị Ga⁠-⁠Esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma​—⁠Ime Nletaghachi

IHE MERE O JI DI MKPA: Ọtụtụ ndị nwere mmasị n’ozi ọma anyị chọrọ ịmata nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke. (Aịza. 55:6) Iji nwee ike inyere ha aka ịna-amụta ihe anyị na-akụziri ha, anyị kwesịrị ịgaghachi ná nke ha ọtụtụ ugboro. Ma, ebe ọ bụ na nsogbu onye nke ọ bụla n’ime ha dị iche, ihe anyị ga-eme iji mee ka ha nwee mmasị n’ozi anyị agaghị abụ otu. Anyị ga-eme nke ọma ma ọ bụrụ na anyị akwadebe akwadebe ma buru n’obi ịmalitere ha ọmụmụ Baịbụl mgbe ọ bụla anyị gara ileta ha.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Egbula oge ịgaghachi. O kwe mee, gaghachi n’ime ụbọchị ole na ole.—Mat. 13:19

  • Mesapụrụ ya ihu ma kwanyekwara ya ùgwù. Ahụ́ ruokwa gị ala

  • Buru ụzọ kelee ya nke ọma. Na-akpọ ya aha ya. Gwa ya ihe mere i ji bịaghachi. O nwere ike ịbụ ka ị zaa ya ajụjụ, nye ya akwụkwọ, gosi ya adres Ịntanet anyị, gosi ya vidio ma ọ bụ gosi ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl. Ị chọpụta na ọ chọrọ ka unu kwuo gbasara ihe ọzọ dị iche, soro ya kwurịta ya.—Fil. 2:4

  • Jiri Baịbụl mee ka okwu ị gwara ya ruo ya n’obi, ọ dị mfe nye ya akwụkwọ ọ ga-agụ. (1 Kọr. 3:6) Gbalịa ka i meta ya enyi

  • Gwa ya ihe unu ga-atụle n’oge ọzọ