Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Nọvemba 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Anyị Ga-amụta n’Akwụkwọ Jona

Ihe Anyị Ga-amụta n’Akwụkwọ Jona

Jehova mere ka e dee akụkọ gbasara ọtụtụ ndị ohu ya ndị nwoke na ndị nwaanyị na Baịbụl, ka anyị si na ha mụta ihe. (Rom 15:4) Olee ihe ndị ị mụtara n’akwụkwọ Jona? Leenụ vidio bụ́ Ofufe Ezinụlọ: Jona Mụtara Ihe n’Ebere Jehova, zaakwanụ ajụjụ ndị a:

  • Olee nsogbu bịaara ndị nkwusa atọ e gosiri na vidio a?

  • Olee otú akwụkwọ Jona ga-esi gbaa anyị ume ma a dọọ anyị aka ná ntị ma ọ bụ napụ anyị ihe ùgwù anyị nwere n’ọgbakọ? (1 Sam. 16:7; Jona 3:1, 2)

  • Olee otú akụkọ Jona ga-esi nyere anyị aka iji obi ụtọ na-eje ozi n’ókèala anyị? (Jona 4:11; Mat. 5:7)

  • Olee otú ihe mere Jona ga-esi nyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị arịawa ọrịa na-anaghị ala ala? (Jona 2:1, 2, 7, 9)

  • Gịnị ka ị mụtara na vidio a gbasara uru ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche na-aba?