Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Nọvemba 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Olee onye kacha enye onyinye ma n’eluigwe ma n’ụwa?

Amaokwu Baịbụl: Jems 1:17

Akwụkwọ: Ụlọ Nche a kwuru otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka otu onyinye kacha onyinye niile Chineke nyere anyị.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Gịnị bụ aha Chineke?

Amaokwu Baịbụl: Ọma 83:18

Eziokwu: Aha Chineke bụ Jehova.

UNU GA-ENWELI OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ UNU

Ihe i nwere ike ikwu: Anyị na-egosi ndị mmadụ vidio a kwuru gbasara ezinụlọ. [Kpọnyere ya vidio e ji enye mmadụ broshọ bụ́ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu.]

Akwụkwọ: Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịgụ broshọ ahụ e kwuru gbasara ya na vidio a, enwere m ike inye gị ya, ma ọ bụ mụ egosi gị otú ị ga-esi danloduo ya na jw.org/ig.

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.