Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Nọvemba 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ILU 27-31

Baịbụl Kwuru Ihe Ndị E Ji Ama Ezigbo Nwunye

Baịbụl Kwuru Ihe Ndị E Ji Ama Ezigbo Nwunye

E dere ihe dị ezigbo mkpa nne Eze Lemuel gwara Lemuel n’akwụkwọ Ilu isi 31. Ezigbo ndụmọdụ o nyere ya mere ka ọ mata ihe ndị o kwesịrị ịtụ anya n’aka nwaanyị ọ ga-alụ.

Ezigbo nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi

31:10-12

  • Ọ na-atụ aro ga-abara ezinụlọ ha uru. Ma, ọ naghị amanye di ya ime ihe o kwuru

  • Di ya na-ahapụ ya ka o mee mkpebi ụfọdụ n’onwe ya n’ihi na ọ tụkwasịrị ya obi na ọ ga-eme mkpebi dị mma

Ezigbo nwunye na-adị ike ọrụ

31:13-27

  • Ọ naghị emefu ego aghara aghara ka o nwee ike inwe ihe ọ ga-eji na-eme ka ezinụlọ ha na-adị mma n’anya ma na-eriju afọ

  • Ọ na-arụsi ọrụ ike, na-elerukwa ezinụlọ ya anya mgbe niile

Ezigbo nwunye na-eji ofufe Chineke kpọrọ ihe

31:30

  • Ọ na-atụ egwu Chineke, na-emekwa ihe ga-eme ka ya na Chineke na-adị ná mma