Ọ bụrụ na ị bụ nwa akwụkwọ, ò nwere mgbe ụjọ na-atụ gị ime ka a mata na ị bụ Onyeàmà Jehova ma ọ bụkwanụ izi ozi ọma? Ya bụrụ otú ahụ, olee otú ị ga-esi kata obi na-ekwu banyere Jehova? (1 Tesa. 2:⁠2) Gịnị mere i ji kwesị ịkata obi? Unu lechaa vidio bụ́ Jehova Ga-enyere Gị Aka Ịkata Obi, zaanụ ajụjụ ndị a:

  1. Olee akụkọ a kọrọ na Baịbụl nyeere Sọpụrụchi aka ịkata obi?

  2. Olee otú ihe Sọpụrụchi na ndị ezinụlọ ya mụgharịrị si nyere ya aka?

  3. Gịnị mere i kwesịrị iji na-ezi ụmụ akwụkwọ ibe gị ozi ọma?

  4. Ọ bụrụ na ị gụchaala akwụkwọ, olee ihe ndị ị mụtara na vidio a?