Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Mee 2017

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 44-48

Kwụsị ‘Ịna-achọrọ Onwe Gị Ihe Ukwu’

Kwụsị ‘Ịna-achọrọ Onwe Gị Ihe Ukwu’

45:2-5

Ọ ga-abụ na Barọk bụ ọnaozi n’ụlọ eze. Ọ ga-abụkwa na ọ gụrụ akwụkwọ nke ọma. Ọ bụ eziokwu na ọ na-efe Jehova, nyerekwa Jeremaya aka, ma, o nwere mgbe ụkwụ ya gbụchapụrụ. O bidoro ‘ịna-achọrọ onwe ya ihe ukwu.’ O nwere ike ịbụ na ọ chọrọ ka e bugoo ya n’ọkwá n’obí eze, nakwa ka o nwetakwuo akụ̀. O kwesịrị ịgbanwe echiche ya ma ọ bụrụ na ọ chọghị ka mbibi a ga-ebibi Jeruselem n’oge na-adịghị anya taa isi ya.