Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Mee 2017

Mee 8-​14

JEREMAYA 35-38

Mee 8-​14
  • Abụ nke 33 na Ekpere

  • Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

  • Ibed-melek—Nwoke Nwere Obi Ike na Obiọma”: (Nkeji 10)

    • Jere. 38:4-6—Zedekaya ji ụjọ kwere ka ndị mmegide tụba Jeremaya n’olulu apịtị ka ọ nwụọ (it-2-E 1228 ¶3)

    • Jere. 38:7-10—Ibed-melek katara obi gaa nyere Jeremaya aka (w12 5/1 31 ¶2-3)

    • Jere. 38:11-13—Ibed-melek gosiri na ya dị obiọma (w12 5/1 31 ¶4)

  • Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)

    • Jere. 35:19—Gịnị mere e ji gọzie ndị Rikab? (it-2-E 759)

    • Jere. 37:21—Olee otú Jehova si lekọta Jeremaya, oleekwa otú nke ahụ ga-esi gbaa anyị ume ma e megidewe anyị taa? (w98 1/15 18 ¶16-17; w95 8/1 5 ¶5-6)

    • Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?

    • Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?

  • Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jere. 36:27–37:2

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

  • Abụ nke 127

  • Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Jehova: (Nkeji 15) Ọ bụ okenye ga-eme ya. Ọ ga-abụ ajụjụ na azịza. E lechaa vidio bụ́ Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Jehova, zaakwa ajụjụ ndị ya na ya so, gbaa nwanna na-anọchite anya ọgbakọ unu na kọmitii na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ajụjụ ọnụ. (Ọ bụrụ na unu enweghị, gbaa onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ ajụjụ ọnụ. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị unu na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze unu amụ ihe, gbaa onye na-ahụ maka ịrụzi ya ajụjụ ọnụ.) Jụọ ya, sị: Olee ihe ndị a rụzirila n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na nso nso a, olee ihe ndị a ga-arụzi n’ọdịnihu? Ọ bụrụ na nwanna nwere nkà chọrọ iso na-elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụkwanụ na nwanna chọrọ iso ndị nwere nkà na-arụ ọrụ iji mụta ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, olee ihe ọ ga-eme? Olee otú onye ọ bụla, n’agbanyeghị otú ihe si dịịrị ya ga-esi nye aka n’ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze?

  • Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 12 ¶9-15, na igbe ndị dị na peeji nke 122-123, na 130-131

  • Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)

  • Abụ nke 125 na Ekpere