Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Mee 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ihe i ga-ekwu: Otu ihe e dere n’Akwụkwọ Mkpughe ọtụtụ ndị ma bụ banyere ndị ịnyịnya anọ na-awụ ọsọ. Ụfọdụ ndị na-atụ ụjọ ma ha nụ banyere ya. Ma, ndị ọzọ na-achọ ịmatakwu banyere ya.

Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 1:3

Otú a ga-esi enye ya: Ụlọ Nche a kọwara ihe mere ndị ịnyịnya anọ ahụ na-agbanụ ji bụụrụ anyị ozi ọma.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Ì chere na ọ ga-ekwe omume ịmata ihe ga-eme n’ọdịnihu?

Amaokwu Baịbụl: Aịza. 46:10

Eziokwu: Chineke na-esi n’Okwu ya bụ́ Baịbụl eme ka anyị mata ihe ga-eme n’ọdịnihu.

UNU GA-ENWELI OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ UNU

Ihe i ga-ekwu: Anyị na-egosi ndị mmadụ obere vidio a na-ekwu gbasara ezinụlọ. [Kpọnyere ya vidio kwuru gbasara broshọ bụ́ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu.]

Otú a ga-esi enye ya: Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịgụ broshọ ahụ e kwuru gbasara ya na vidio a, enwere m ike inye gị ya n’efu ma ọ bụ gosi gị otú ị ga-esi danloduo ya na jw.org/ig.

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.