Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Mee 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ị̀ Na-eji JW Library Eme Ihe?

Ị̀ Na-eji JW Library Eme Ihe?

JW Library bụ ihe a na-etinye n’ekwentị ma ọ bụ na kọmputa. I nwere ike isi na ya danloduo Baịbụl, vidio, ihe ndị a na-egere egere na akwụkwọ anyị ndị ọzọ.

OTÚ E SI ENWETA YA: Ị banye n’Ịntanet, si n’ebe a na-esi enweta ihe dị iche iche a na-etinye n’ekwentị ma ọ bụ na kọmputa tinye JW Library. A na-akpọ ebe ahụ “app store” n’asụsụ Bekee. I tinyechaa ya, gị emepee ya, jirizie Ịntanet danloduo ihe ndị anyị nwere ị chọrọ ịdanlodu. Ị danloduo ihe na JW Library, ị ga na-emepezi ihe ahụ mgbe ọ bụla ị chọrọ n’ejighị Ịntanet. A na-eme ka otú JW Library si arụ ọrụ na-akakwu mma kwa mgbe kwa mgbe, n’ihi ya, ọ ga-adị mma ka anyị na-abanye n’Ịntanet mgbe mgbe iji mee ka JW Library nke anyị nweta ihe ọhụrụ ndị ahụ.

OLEE URU JW LIBRARY BARA? JW Library na-eme ka ọ dịrị mmadụ mfe ịmụ ihe n’onwe ya, ọ na-enyekwara anyị aka ma anyị gaa ọmụmụ ihe. Ọ na-enyekwa ezigbo aka n’ozi ọma, karịchaa n’oge mmadụ na-anọghị n’ozi.