Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jun 2017

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Kpọọ Omume Ọ Bụla Jehova Kpọrọ Asị Asị

Kpọọ Omume Ọ Bụla Jehova Kpọrọ Asị Asị

Ọ bụ Jehova Chineke kwesịrị ịgwa ụmụ mmadụ ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Dị ka ihe atụ, o kwuru na alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ njikọ nke otu nwoke na otu nwaanyị nke a na-ekwesịghị itisa etisa. (Mat. 19:​4-6, 9) Chineke kpọrọ ụdị mmekọahụ rụrụ arụ niile asị. (1 Kọr. 6:​9, 10) Ọ gwadịrị anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-eji ejiji dị mma ga-eme ka ndị ya dị iche n’ụwa.​—⁠Diut. 22:5; 1 Tim. 2:​9, 10.

N’ụwa taa, ọtụtụ ndị achọghị ime ihe Chineke kwuru. (Rom 1:​18-32) Ha na-eyi uwe, na-eji ejiji ma na-akpa àgwà otú ụwa chọrọ. Ọtụtụ ndị na-akpa àgwà ọjọọ n’asọghị anya, na-akatọkwa ndị na-anaghị ebi ụdị ndụ ha na-ebi.​—⁠1 Pita 4:​3, 4.

Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị kwesịrị ịkata obi kpọọ ihe ọjọọ asị ma na-akpa àgwà ọma. (Rom 12:⁠9) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị kwesịrị iji akọ na-eme ka ndị mmadụ mata ihe Chineke chọrọ. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịkwara ịna-ebi ndụ otú Chineke chọrọ. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-ahọrọ uwe na ejiji anyị ga na-eji, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ụdị ejiji na-amasị m ọ̀ na-egosi na m bụ onye Jehova ka ọ̀ bụ onye ụwa? Ejiji a ọ̀ na-eme ka ndị mmadụ mata na m bụ ezigbo Onye Kraịst?’ Mgbe ị na-ahọrọ ihe ị ga-ele na tiivi ma ọ bụ fim ị ga-ele, i nwekwara ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Jehova ọ̀ ga-anabata ihe a m chọrọ ile? Ọ̀ na-akụzi àgwà ọma ka ọ bụ àgwà ọjọọ? M lee ihe a, ọ̀ ga-eme ka m jiri nwayọọ nwayọọ hụwa omume rụrụ arụ n’anya? (Ọma 101:⁠3) Ò nwere ike ime ka ndị ezinụlọ anyị ma ọ bụ ndị ọzọ sụọ ngọngọ?’​—⁠1 Kọr. 10:​31-33.

Gịnị mere ịkpọ ihe ọjọọ asị ma na-akpa àgwà ọma ji dị ezigbo mkpa? Ọ bụ n’ihi na Jizọs Kraịst ga-ebibi ndị niile na-eme ihe ọjọọ n’oge na-adịghị anya. (Ezik. 9:​4-7) Ọ bụ naanị ndị na-eme uche Chineke ka a ga-ahapụ ndụ. (1 Jọn 2:​15-17) N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike kpọọ ihe ọjọọ asị ma na-eme omume ọma ka ndị mmadụ hụ omume ọma anyị ma nye Chineke otuto.​—⁠1 Pita 2:​11, 12.

Olee ihe ụdị uwe m na-eyi na ụdị ejiji m na-eji na-egosi gbasara otú m si ele omume rụrụ arụ anya?

LEENỤ VIDIO BỤ́ BỤRỤ ENYI JEHOVA—OTU NWOKE, OTU NWAANYỊ, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A NA-ESONỤ:

  • Gịnị mere o ji dị mma ime ihe Jehova kwuru?

  • Gịnị mere ndị nne na nna kwesịrị iji bido mgbe nwa ha ka dị ntakịrị kụziwere ya ịna-akpa àgwà otú Jehova chọrọ?

  • Olee otú ndị na-eto eto na ndị dimkpa ga-esi nyere ndị mmadụ aka ịna-akpa àgwà ọma nke ga-eme ka ha nweta ngọzi Chineke?