Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Igbo

Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ  |  Jun 2017

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 6-10

À Ga-aka Gị Akara Maka Nzọpụta?

À Ga-aka Gị Akara Maka Nzọpụta?

Ọhụụ Ezikiel bu ụzọ mezuo mgbe e bibiri Jeruselem oge ochie. Olee otú ọ ga-esi emezu n’oge anyị a?

9:1, 2

  • Nwoke ahụ ji mpi ink nke odeakwụkwọ nọchiri anya Jizọs Kraịst

  • Ndị ikom isii ahụ ji ngwá ọgụ e ji akụgbu mmadụ nọchiri anya ụsụụ ndị agha nke eluigwe nke Jizọs bụ ọchịagha ha

9:3-7

  • A ga-aka oké igwe mmadụ ahụ akara ma e kpebichaa ndị ga-abụ atụrụ n’oge oké mkpagbu ahụ

Olee ihe m ga-eme ma ọ bụrụ na m chọrọ ka a kaa m akara maka nzọpụta?